Igbo Mass Readings for July 27 2023, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 27 2023, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 19:1-2, 9-11, 16-20

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ọpụpụ

N’ụbọchị o mere ọnwa ọhụrụ nke atọ site n’oge ndị Izrel hapụchara obodo ljipt, ha batara n’ịkpa nke Sinaị. Oge ha hapụrụ Refidim bata n’ime ịkpa nke Sinaị, ha kwụsịrị n’ime ịkpa ebe ahụ n’ihu ugwu.

Yahweh gwara Mosis sị, “Lee, ana m abịakwute gị na nnukwu urukpu ka ndị mmadụ nụrụ oge mụ na gị ga-ekwu okwu, ka ha nwee ike ikwere na gị mgbe niile.”

Mgbe ahụ Mosis gwara Yahweh ihe ndị mmadụ kwuru. Yahweh gwakwa Mosis sị ya, “Jekwuru ndị mmadụ ka i doo ha nsọ taa na echi, ka ha sakwaa uwe mwụda ha mmiri, dị njikere n’ụbọchị nke atọ, n’ihina n’ụbọchị nke atọ aga m agbada n’ugwu Sinaị n’ihu mmadụ niile.

N’ụtụtụ ụbọchị nke atọ, e nwere egbeigwe na amụma mmiri. Nnukwu urukpu kpuchiri elu ugwu ahụ, n’ikpeazụ opiike dara. Ihe ndị a mere ka ndị niile nọ n’ime ogige maa jijiji.

Mosis we kpọpụta ndị mmadụ ka ha na Chineke zukọọ, ha were ọnọdụ n’ukwu ugwu ahu. Anwụrụọkụ kpuchichara ugwu Sinaị n’ihina Yahweh gbadatara na ya n’ụdị ọkụ.

Anwụrụọkụ ya lara elu dịka ọhịa a na-esu ọkụ, ugwu niile mara jijiji nke ukwuu. Ma ka ụda opiike dawanyesiri ike, Mosis kwuru okwu, Chineke wee jiri egbeigwe zaghachi ya.

Yahweh gbadatara n’elu ugwu Sinaị were kpọọ Mosis ka ọ gbagota n’elu ugwu ahụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Dan. 3:52, 53, 54, 55, 56

Azịza: Otito na nsọpụrụ dịrị gị ebeebe

1. Ngọzi dịrị gị, Yahweh, Chineke nke nnanna anyị ha,

otito na nsọpụrụ dịrị gị ebeebe,

ngọzi dịrị aha gị dị nsọ

otito na nsọpụrụ dịrị gị ebeebe. Azịza

2. Ngọzi dịrị gị n’ụlọnsọ gị dị ebube,

ngọzi kacha elu dịrị gị ebeebe. Azịza

3. Ngọzi dịrị gị n’ocheeze gị

otito kacha elu dịrị gị ebeebe. Azịza

4. Ngọzi dịrị gị, onye mazuru ihe niile nọrọkwa n’oche nke Kerub,

ka e nye gị otito na ngọzi kacha elu ebeebe. Azịza

5. Ngọzi dịrị gị n’eluigwe,  

Ị dị ngọzi dịkwa elu karichaa ihe niile ebeebe. Azịza.

MBEKU

Alleluia, Alleluia:

Onyenweanyị, meghee anya m, ka m wee hụ ihe ịtụnaanya dị n’iwu gị.

Alleluia.

OZIỌMA – 13:10-17

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Mgbe ahụ, ndị na-eso ụzọ Jesu bịakwutere ya jụọ ya sị, “Gịnị mere i ji agwa ha okwu n’ụkabụilu?” Ọ zara ha sị, “Ọ bụ ụnụ ka e nyere amara ịmata ihe omimi nke alaeze eluigwe, ma e nyeghị ha amara dị otu a.

N’ihina onye ọbụla nwerenụ ka a ga-enye ntụkwasa ka o nwee karịa. Ma onye ọbụla na-enweghị, a ga-anapụ ya ọbụladị nke o nwere.

Nke a bụ ihe mere m ji agwa ha okwu n’ụkabụilu, n’ihina ha na-ele anya, ma ha anaghị ahụ ụzọ, ha na-ege ntị ma ha anaghị anụ ihe nke ha na aghọta.

E mezuola ihe Aịzaya onye amụma kwuru maka ha sị, “Ụnụ ga-ege ntị ma ụnụ agaghị aghọta; ụnụ ga-ele ma ụnụ agaghị ahụ.

N’ihina obi ndị a adaala mba, ntị ha ejụla n’ịnụ ihe, ha mechiri anya, ka ha ghara iji anya ha hụ ụzọ, gharakwa iji ntị ha nụ ihe. Ka ha ghara iji obi ha ghọta ihe ọbụla.

Ka ha ghara ịlaghachikwute m ka m gwọọ ha. Ngọzi dịịrị anya ụnụ, n’ihina ha na-ahụ ụzọ, na ntị ụnụ, n’ihina ha na anụ ihe.

N’ezie agwa m ụnụ, ọtụtụ ndị amụma na ndị eziomume chọsiri ike ịhụ ihe ụnụ na-ahụ ma ha ahụghị ya, ịnụ ihe ụnụ na-anụ ma ha anụghị ya.

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for July 27 2023, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 10, 2022