Igbo Mass Readings for July 23 2026, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 23 2026, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:1-3, 7-8, 12-13

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Jeremiah

Okwu nke Osebụrụwa bịakwutere m sị, “Gaa kwupụta n’ala Jerusalem na Osebụrụwa kwuru sị, “Echetara m nkwụdosiike gị n’oge ịna etolite, ịhụnaanya gị dịka nke nwaanyị a lụtara ọhụrụ, otu i siri guzosie ike n’ebe m nọ n’ọzara, n’ime ịkpa.

Izrel; ị bụ nke naanị m, ị bụkwa onye nke m dị nsọ. Ezigaara m ndịiro gị ahụhụ na ọgbaaghara, Osebụrụwa na-ekwu. Akpọbatara m ụnụ n’ala ihe oriri jupụtara ka ụnụ jiri iheọma niile dị na ya bie ndụ n’uju ya.

Ma mgbe ụnụ batara n’ime ya, ụnụ merụrụ ala m, ma meekwa ihe nketa m ka ọ bụrụ arụ. Ndị Ụkọchukwu ajụghịkwa sị, ‘Ebee ka Osebụrụwa nọ?

Ndị bụ ndị ọkaịkpe amaghị m; ndị ọchịchị mehiekwara megide m; ọbụladị ndị amụma malitere mawa amụma n’aha nke Baal, ma tụkwasịkwa obi n’ebe ihe abaghị uru dị.

Ka akpataoyi wụọ ụnụ, maka nke a, ụnụ eluigwe, ka ahụ ọmajijiji jidekwa ụnụ, tọgbọrọkwanụ n’efu, Osebụrụwa na-ekwu.

N’ihina ndị nke m emeela ụzọ arụ abụọ; ha akpọla m asị, mụ bụ isi mmiri nke ndụ, gwuoro onwe ha olulu mmiri gbawara agbawa nke apụghị ichedo mmiri ọbụla.”

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 36: 5-6,7-8,9-10

Azịza: Onyenweanyị gị bụ isi nke ndụ

1. Chineke, ịhụnaanya gị na-erute n’eluigwe,

eziokwu gị na-erutekwa n’urukpu ojii,

Ịkwụba aka ọtọ gị dịka eluugwu nke Chineke,

ikpe gị niile miri emi dịka ndagwurugwu.

Azịza: Onyenweanyị gị bụ isi nke ndụ

2. Onyenweanyị, lee ka ịhụnaanya gị si dị okeọnụ,

Ị na-echedo ụmụ mmadụ n’okpuru nku gị

Ha na-eriju afọ n’ụlọakụ gị

Ị na-enye ha mmiri site na mmiri nke obi ụtọ gị.

Azịza: Onyenweanyị gị bụ isi nke ndụ

3. Ee, gị bụ isi nke ndụ,

n’ihe nke gị ka anyị sikwa na-ahụ ụzọ

Akwụsịkwala igosi ịhụnaanya n’ebe ndị maara gị nọ

inye ikpe nkwụmọtọ n’ebe ndị niile obi ha dị ọcha nọ.

Azịza: Onyenweanyị gị bụ isi nke ndụ

MBEKU

Alleluia, Alleluia:

Onyenweanyị, meghee anya m, ka m wee hụ ihe ịtụnaanya dị n’iwu gị.

Alleluia.

OZIỌMA – 13:10-17

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Mgbe ahụ, ndị na-eso ụzọ Jesu bịakwutere ya jụọ ya sị, “Gịnị mere i ji agwa ha okwu n’ụkabụilu?” Ọ zara ha sị, “Ọ bụ ụnụ ka e nyere amara ịmata ihe omimi nke alaeze eluigwe, ma e nyeghị ha amara dị otu a.

N’ihina onye ọbụla nwerenụ ka a ga-enye ntụkwasa ka o nwee karịa. Ma onye ọbụla na-enweghị, a ga-anapụ ya ọbụladị nke o nwere.

Nke a bụ ihe mere m ji agwa ha okwu n’ụkabụilu, n’ihina ha na-ele anya, ma ha anaghị ahụ ụzọ, ha na-ege ntị ma ha anaghị anụ ihe nke ha na aghọta.

E mezuola ihe Aịzaya onye amụma kwuru maka ha sị, “Ụnụ ga-ege ntị ma ụnụ agaghị aghọta; ụnụ ga-ele ma ụnụ agaghị ahụ.

N’ihina obi ndị a adaala mba, ntị ha ejụla n’ịnụ ihe, ha mechiri anya, ka ha ghara iji anya ha hụ ụzọ, gharakwa iji ntị ha nụ ihe. Ka ha ghara iji obi ha ghọta ihe ọbụla.

Ka ha ghara ịlaghachikwute m ka m gwọọ ha. Ngọzi dịịrị anya ụnụ, n’ihina ha na-ahụ ụzọ, na ntị ụnụ, n’ihina ha na anụ ihe.

N’ezie agwa m ụnụ, ọtụtụ ndị amụma na ndị eziomume chọsiri ike ịhụ ihe ụnụ na-ahụ ma ha ahụghị ya, ịnụ ihe ụnụ na-anụ ma ha anụghị ya.

Igbo Mass Readings for July 24 2026, Fraịde Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for July 23 2026, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.