Igbo Mass Readings for August 17 2023, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 17 2023, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:7-10, 11, 13-17

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Jọshụa

Chineke gwara Jọshụa sị, “Taa ka m ga-ebido ime gị oke mmadụ n’anya ụmụ Izrel niile, ka ha mara na m na-anọnyere gị dịka m si nọnyere Mosis.

Gwa ndị ụkọchukwu bu Igbe Ọgbụgbandụ ka ha chere ma ha zọba ụkwụ na mmiri Jọdan. Jọshụa wee gwa ụmụ Izrel sị, Bịanụ nso ka ụnụ nụ ozi Osebụrụwa Chineke na-ezi ụnụ.

Nke a ga-egosi ụnụ na Chineke kwụ ụnụ n’azụ na ụnụ ga-achụpụ ndị Kenaan, ndị Het, ndị Hiv, ndị Periz, ndị Gegash, ndị Amọ, na ndị Jebus.

Leenụ igbe nke Chineke, Osebụrụwa nke ụwa niile ga-agafe Osimiri Jọdan n’ihu ụnụ. Họpụtanụ mmadụ iri abụọ ozigbo n’ime ụmụ Izrel otu site n’otu agbụrụ.

Ozigbo ndị ụkọchukwu bu igbe Ọgbụgbandụ nke Osebụrụwa Chineke nke ụwa niile zọbara ụkwụ na mmiri Jọdan mmiri niile si n’ugwu ehudata ga-akwụrụ otu ebe.”

Ya mere mgbe ụmụ Izrel hapụrụ ogige ha ịgafe Osimiri Jọdan, ndị ụkọchukwu bu igbe Ọgbụgbandụ bu ụzọ.

Mgbe ndị ụkọchukwu bu igbe Ọgbụgbandụ metụrụ ụkwụ ha na mmiri Jọdan (Osimiri Jọdan na etojuo sọfee n’ọwa ya n’oge owuwe ihe ubi), mmiri nke si n’ugwu kwụụrụ tolite elu n’ebe Adam obodo dị n’akụkụ

Zaretan ebe nke na-agbada Osimiri Araba, ya bụ Mmiri Nnu, kwụsịrị kpam kpam. Ụmụ Izrel wee gafee n’akụkụ Jeriko.

Mgbe ụmụ Izrel na-agafe n’ala ọkpọọ, ndị ụkọchukwu bu Igbe Ọgbụgbandụ nke Chineke kwụ n’ala ọkpọọ n’etiti Jọdan ruo mgbe ụmụ Izrel niile gafechara.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 114: 1-2, 3-4, 5-6

Azịza: Alleluia

1. Mgbe Izrel si n’Ijipt pụta,

ezinụụlọ Jekọb si n’etiti ndị mba ọzọ were pụta

Juda bụrụ ebe nsọ ya ma

Izrel abụrụ nke ya. Azịza

2. Osimiri ahụ hụrụ ya wee gbaa ọsọ

Jọdan gbaghachiri azụ,

Nnukwu ugwu ahụ bidoro wụlibe elu ka ebule,

Obere ugwu ahụ na-awụlikwa elu dịka ụmuụ atụrụ. Azịza

3. Osimiri gịnị mere I ji na-agba ọsọ?

Jọdan gịnị mere I jiri chigha azụ?

gịnị mere ụnụ jiri awụli elu dịka ebule,

ụnụ bụ nnukwu ugwu?

ụnụ bụ obere ugwu

gịnị mere ụnụ ji awụlikwa elu dịka ụmụ atụrụ? Azịza

MBEKU – Ps 95:9

Alleluia, Alleluia:

Taa, Ọ bụrụ na ụnụ anụ olu ya ụnụ akpọchila obi ụnụ.

Alleluia

OZIỌMA – 18:21-19:1

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Pita bịakwutere Jesu jụọ ya sị, “Onyenweanyị, ugboro ole ka nwanne m ga-emejọ m m gbaghara ya, Ọ bụ ugboro asaa?” Jesu azaa ya sị, “Agwaghị m gị na ọ bụghị sọsọ ugboro asaa, kama iri asaa ụzọ asaa.”

Ya mere a ga-eji alaeze nke eluigwe tụnyere otu onyeeze chọrọ ka ya na ụmụodibo ya pịazie akụnụụba ya. Mgbe ọ malitere ntụle ya, a kpọtaara ya otu nwodibo nke ji ya puku talent iri.

Ma ebe nwodibo ahụ na-enweghị ike ịkwụghachi ụgwọ ahụ, nna ya ukwu nyere iwu ka e ree ya na nwunye ya na ụmụ ya na ihe niile o nwere ka e wee kwụghachi ụgwọ o ji.

Nke a mere odibo ahụ ji daa n’ala na-arịọ ya sị, “Nnamukwu, biko nwee ndidi n’ebe m nọ, aga m akwụghachi gị ihe niile!”

N’ihi obi ebere o nwere n’ebe nwodibo ya nọ, nna ya ukwu hapụrụ ya, kagbukwaa ụgwọ niile o ji. Ma ka nwodibo ahụ n’onwe ya pụbara, ọ hụrụ otu nwodibo ibe ya nke ji ya otu narị dinarị, ọ tọdoro ya n’akpịrị sị ya, “Kwụghachi m ụgwọ I ji m.”

Nke a mere nwodibo ibe ya ahụ ji daa n’ala rịọ ya sị, “Nweere m ndidi, aga m akwụghachi gị ụgwọ gị.” Ma o kweghị, kama ọ gara tụba ya n’ụlọmkpọrọ ruo mgbe ọ kwụghachiri ya ụgwọ o ji ya.

Mgbe ndị odibo ibe ya hụrụ ihe merenụ, o wutere ha nke ukwuu. Ha wee gaa kọọrọ nna ha ukwu ihe niile ndị a. N’ihi nke a nna ya ukwu kpọrọ nwodibo ahụ sị ya, “Odibo obi ọjọọ!

Agbagharala m gị ụgwọ niile I ji m, n’ihina ị rịọrọ m arịrịọ. I cheghị na o kwesịrị ka I mere nwodibo ibe gị ebere dịka m siri mere gị?”

N’iwe nna ya ukwu nyefere ya ndị nche ndị nọ n’ụlọmkpọrọ ka ha taa ya ahụhụ ruo mgbe ọ kwụchara ụgwọ niile o ji.

Otu a ka Nna m nke bi n’eluigwe ga-esi meso onye ọbụla n’ime ụnụ ma ọ bụrụ na ụnụ esighị n’ala obi ụnụ gbaghara ụmụnne ụnụ mmehie niile ha mehiere ụnụ.

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for August 17 2023, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 11, 2022