Igbo Mass Readings for August 13 2026, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 13 2026, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 12:1-12
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Onye Amụma Ezekiel
Okwu nke Yahweh bịakwutere m sị: “Nwa nke mmadụ, i bi n’etiti ndị nnupụisi, ndị nwere anya ma ha anaghị ahụ ụzọ, nweekwa ntị ma ha anaghị anụ ihe, n’ihina ha bụ ụlọ ndị nnupụisi.
Ya bụ nwa nke mmadụ, kwado ibu gị dịka onye na-agba ọsọ agha ma gbapụ n’obodo a n’ehihie n’ihu ha; ị ga-aga dịka onye a dọkpụụrụ gaa mba ọzọ, site n’obodo gị gaa obodo ọzọ n’ihu ha.
Eleghị anya ha ga-aghọta, n’agbanyeghị na ha bụ ndị nnupụisi. Ị ga-ebupụta ibu gị n’ehihie n’ihu ha dịka ibu onye na-agba ọsọ agha.
Ị gakwa azọpụ njem na mgbede n’ihu ha dịka ụmụnwoke ndị na-agba ọsọ agha na-eme. Gwupuo mgbidi aja n’ihu ha ma si ebe ahụ piopụ.
N’ihu ha, ị ga-amaburu ibu gị n’ubu ma buru ya pụọ n’ọchịchịrị. Ị ga-ekpuchi ihu gị, ka ị ghara ịhụ ala ahụ, n’ihina emeela m ka ị bụrụ ihe ịrịbaama n’ebe ụmụ Izrel nọ.
Emere m dịka e siri gwa m. Ebupụtara m ibu m n’ehihie dịka ibu onye na-agba ọsọ agha, na mgbede ya, ejiri m aka m gwuwaa mgbidi aja ma zọpụ ije n’ọchịchịrị burukwa ibu m n’ubu m n’ihu ha.
N’ụtụtụ, okwu nke Yahweh bịakwutere m sị: “Nwa nke mmadụ, ọ bụ na ụmụ Izrel ndị nnupụisi ahụ ajụbeghị gị sị, ‘Olee ihe ị na-eme?’
Gwa ha sị, ‘Lee, ọ bụ Yahweh na-ekwu okwu nke a gbasara onye ọchịchị nke Jerusalem nakwa ụmụ Izrel niile ndị bi n’ime ya.
Kwuo sị, ‘Abụ m ihe ịrịbaama nye ụnụ; dịka m siri mee, otu a ka a ga-eme ụnụ niile; ụnụ ga-agba ọsọ agha, bụrụkwa ndị a dọtara n’agha.’
Mgbe ahụ onye ọchịchị nke nọ n’etiti ha ga-amaburu ibu ya n’ubu n’ọchịchịrị ma zọpụ ije; ọ ga-egwupụ mgbidi aja nke obodo ma si ebe ahụ piopụ, ọ ga-ekpuchi ihu ya ka ọ ghara iji anya ya hụ obodo ahụ.”
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 78: 56-57, 58-59, 61-62
Azịza: Echezọkwala ọrụ nke Chineke niile.
1. Ka o mechaara ha nke a, ha gara n’ihu na-enupụrụ Chineke
Onye kacha elu isi, na-anwa ya, jụ idobe iwu ya.
Dịka ndị nnanna ha, ha dị njọ bụrụ ndị isiike;
Ha ekwesịghị ntụkwasịobi dịka akụ na-agaghị ebe a gbara ya. Azịza
2. Ha jiri okwuarụsị ha dị icheiche kpasuo ya iwe;
mee ka o nwee ntaji anya n’ebe arụsị ha dị icheiche dị
Iwe juru Chineke obi mgbe ọ hụrụ ya
o wee jụ Izrel kpam kpam. Azịza
3. Ọ hapụrụ ndịiro anyị ka ha bute igbe ọgbụgbandụ ya n’agha,
akara nke ike ya na ebube ya.
O nyefere ndị nke ya na mmaagha
mee ka iwe ya dakwasa ndị nke ya. Azịza
MBEKU – Ps 95:9
Alleluia, Alleluia:
Taa, Ọ bụrụ na ụnụ anụ olu ya ụnụ akpọchila obi ụnụ.
Alleluia
OZIỌMA – 18:21-19:1
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Pita bịakwutere Jesu jụọ ya sị, “Onyenweanyị, ugboro ole ka nwanne m ga-emejọ m m gbaghara ya, Ọ bụ ugboro asaa?” Jesu azaa ya sị, “Agwaghị m gị na ọ bụghị sọsọ ugboro asaa, kama iri asaa ụzọ asaa.”
Ya mere a ga-eji alaeze nke eluigwe tụnyere otu onyeeze chọrọ ka ya na ụmụodibo ya pịazie akụnụụba ya. Mgbe ọ malitere ntụle ya, a kpọtaara ya otu nwodibo nke ji ya puku talent iri.
Ma ebe nwodibo ahụ na-enweghị ike ịkwụghachi ụgwọ ahụ, nna ya ukwu nyere iwu ka e ree ya na nwunye ya na ụmụ ya na ihe niile o nwere ka e wee kwụghachi ụgwọ o ji.
Nke a mere odibo ahụ ji daa n’ala na-arịọ ya sị, “Nnamukwu, biko nwee ndidi n’ebe m nọ, aga m akwụghachi gị ihe niile!”
N’ihi obi ebere o nwere n’ebe nwodibo ya nọ, nna ya ukwu hapụrụ ya, kagbukwaa ụgwọ niile o ji. Ma ka nwodibo ahụ n’onwe ya pụbara, ọ hụrụ otu nwodibo ibe ya nke ji ya otu narị dinarị, ọ tọdoro ya n’akpịrị sị ya, “Kwụghachi m ụgwọ I ji m.”
Nke a mere nwodibo ibe ya ahụ ji daa n’ala rịọ ya sị, “Nweere m ndidi, aga m akwụghachi gị ụgwọ gị.” Ma o kweghị, kama ọ gara tụba ya n’ụlọmkpọrọ ruo mgbe ọ kwụghachiri ya ụgwọ o ji ya.
Mgbe ndị odibo ibe ya hụrụ ihe merenụ, o wutere ha nke ukwuu. Ha wee gaa kọọrọ nna ha ukwu ihe niile ndị a. N’ihi nke a nna ya ukwu kpọrọ nwodibo ahụ sị ya, “Odibo obi ọjọọ!
Agbagharala m gị ụgwọ niile I ji m, n’ihina ị rịọrọ m arịrịọ. I cheghị na o kwesịrị ka I mere nwodibo ibe gị ebere dịka m siri mere gị?”
N’iwe nna ya ukwu nyefere ya ndị nche ndị nọ n’ụlọmkpọrọ ka ha taa ya ahụhụ ruo mgbe ọ kwụchara ụgwọ niile o ji.
Otu a ka Nna m nke bi n’eluigwe ga-esi meso onye ọbụla n’ime ụnụ ma ọ bụrụ na ụnụ esighị n’ala obi ụnụ gbaghara ụmụnne ụnụ mmehie niile ha mehiere ụnụ.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.