Igbo Mass Readings for June 22 2023, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 22 2023, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 11:1-11
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke abụọ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt
Ọ dị mma ma ụnụ nagide m, ọ bụladị ma m kwuo okwu dịka onye enweghị uche. Nagidenụ m. Eji m ekworo hụ ụnụ n’anya dịka Chineke ji ekworo hụ anyị niile n’anya.
Ụnụ dịka nwaagbọghọ nta m họtaara otu di bụ Kristi, ka m chee ụnụ n’ihu Kristi dịka agbọghọ a na emerụghị emerụ, o ji agbaakwụkwọ.
Ma egwu na-atụ m, dịka agwọ jiri aghụghọ ghọgbuo Eve, ndị nrafu ga-eji aghụghọ duhie ụnụ, mee ka ụnụ kwụsị iji obi dị ọcha na ịdị uchu jeere Kristi ozi.
N’ihina ụnụ gaara anara onyeọzọ bịakwutere ụnụ na-ekwusa Jesu ọzọ dị iche, abụghị nke anyị kwusara. Ụnụ gaara-anarakwa ike nke Mmụọ Nsọ ahụ ụnụ natara site n’aka anyị.
Ụnụ gaara ekwenyekwa na nkuzi ọzọ dị iche, na abụghị oziọma ahụ nke ụnụ natara site n’aka anyị. O were m anya na ọ dịghị ụzọ ọbụla m si dị ala n’ebe ndịozi ụgha ndị a nọ, ndị ụnụ na-eche na ha kachasị elu n’etiti ndị ozi.
Ọ bụrụ na abụghị m onye ọka okwu, abụ m onye ọka mmụta. Anyị akọwaarala ụnụ nke a ọtụtụ mgbe n’ụzọ dị icheiche n’ihe niile. Mgbe m bịara zie ụnụ oziọma Chineke, ọ dịghị ego ọbụla m nara ụnụ!
Ewedara m onwe m ala ka m wee welie ụnụ elu! Ihe dị otu a m meere ụnụ, ọ bụ ihe ọjọọ? Oge m na-arụ ọrụ n’etiti ụnụ, ndị na-akwụ m ụgwọ bụ nzukọ Kristi ndịọzọ.
Ya bụ, akụ a zọtara n’aka ndịọzọ, ka e ji nyere ụnụ aka. Oge m nọ n’etiti ụnụ anọgidere m n’ụkọ ma enyeghị m onye ọbụla nsogbu, ka m ghara ịbụrụ ụnụ ibu arọ, kama ndị ụmụnna ndị si na Masedonia, na-ewetara m ihe niile dị m mkpa.
Ya mere, dịka m na-eme na mbụ otu a ka m ga na-eme n’ọdịniihu: agaghị m abụrụ ụnụ ibu arọ. Ebe eziokwu nke Kristi dị n’ime m, ịnya isi m nke a agaghị akwụsị na mpaghara Achaia niile.
Gịnị mere m ji ekwu otu a” Ọ ga-abụ na ahụghị m ụnụ n’anya? Chineke ma na ahụrụ m ụnụ n’anya.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 111:1-2, 3-4, 7-8
Azịza: Onyenweanyị, ihe niile Ị na-eme bụ n’ịkwụdosiike na n’ikpe nkwụmọtọ
1. Alleluia, Eji m obim niile enye Onyenweanyị ekele,
n’ọgbakọ ndị eziomume.
Ọrụ Onyenweanyị niile dị ịtụnaanya,
ndị niile ọ na-amasị kwesịrị ilekwasa ya anya. Azịza
2. Ọrụ niile ọ na-arụ jupụtara n’otito na ebube,
eziomume ya enweghị ike ịgbanwe agbanwe
Ọ na-ekwe ka anyị na-echeta ọrụ ebube ya.
Onyenweanyị dị ebere dịkwa obiọma. Azịza
3. Ihe niile ọ na-eme bụ n’ịkwụdosiike na n’ikpe nkwụmọtọ,
ọrụ aka ya kwụrụ chịm n’ụzọ niile,
o kwesịrị ntụkwasịobi ebeebe ebeebe,
A rụrụ ha na-eziokwu na na-ikpe ziri ezi. Azịza
MBEKU – 1 Sam 3:9; Jon 6:69
Alleluia, Alleluịa:
Kwuwe onyenwe m, nwodibo gị na-ege ntị. Ọ bụ gịnwa ji okwu nke ndụ ebeebe.
Alleluia.
OZIỌMA – 6:7-15
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Mgbe ụnụ na-ekpe ekpere, ụnụ ekwukwala ọtụtụ okwu na-abaghị uru, dịka ndị mba ọzọ si eme, n’ihina ha na-eche na site n’ọtụtụ okwu, Chineke ga-anụ ekpere ha.
Ụnụ emekwala ka ha, n’ihina Nna ụnụ maara mkpa ụnụ tupu ụnụ arịọ ya. Ya bụ, na-ekpenụ ekpere otu a: “Nna anyị nọ n’eluigwe ka otito dịrị aha Gị, ka ọchịchị Gị bịa, ka e mee uche Gị n’ụwa, Dịka e si eme ya n’eluigwe.
Nye anyị taata nri nke ụbọchị anyị, gbahara anyị mmehie anyị dịka anyị si ghaghara ndị mehiere anyị. Ekwela ka anyị kwenye na nranye ma zọpụta anyị n’ajọ ihe.
N’ihina ọ bụrụ na ụnụ agbaghara ndị mmadụ mmehie ha, Nna ụnụ nke bi n’eluigwe ga-agbaharakwa ụnụ; mana ọ bụrụ na ụnụ agbagharaghị ibe ụnụ mmehie ha mere ụnụ, Nna ụnụ agaghị agbaghara ụnụ mmehie ụnụ.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.