Igbo Mass Readings for June 20 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 20 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 48:1-14
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ Sịrak
Oge ahụ ka onye amụma Elaịja ji bilite ka ọkụ na-enwu enwu. Okwu ya na-chawapụta ka ire ọkụ. O weteere ha ụganị. N’obi ịnụọkụ ya, o belatara ọnụọgụ ha.
Site n’okwu nke Chineke, o mechiri eluigwe mmiri kwụsị izo. Ugboro atọ kwa ka o si n’elu kpọdata ọkụ. Elaịja, ị dị ebube n’ọrụ ịtụnaanya gị, onye tosiri ịnya isi dịka ị pụrụ ime?
I sila n’ala mmụọ kulite onye nwụrụ anwụ; ị dọtuola ndịeze tinye ha na mbibi si n’elu akwa dọtukwaa ndị a maara aha ha. Ị nụrụ mba na Sinaị, nkwa ikpe nke ịbọ ọbọ na Họreb; gị onye tere ndịeze ude ka ha bụrụ ndị na-abọ ọbọ, tekwaa ndị amụma ude ka ha nọchie anya gị.
Gị bụkwa onye oke ikuku nke ọkụ bugoro n’elu; gị onye dị nkwadebe n’oge a kara dịka akwụkwọ nsọ siri kwu, ime ka iwe Chineke dajụọ tupu oke amụma ebido; Hụgharịa obi ndị bụ nna n’ebe ụmụ ha nọ, ma dozie ebo Jekọb niile dị ka ha dị na mbụ.
Ngọzi na-adịịrị ndị ahụ ga-ahụ gị, ya na ndị nke ahụ ji ịhụnaanya daa n’ụra nke ọnwụ, maka na anyị onwe anyị ga-enwekwa ndụ. Mgbe oke ikuku kpuchiri Elaịja, Elaịsha wee jupụta na mmụọ nke Elaịja.
N’ụbọchị niile nke ndụ ya, o nweghị onye ọchịchị ọ mara jijiji n’ihu ya, nke ọ na-enwe onye fọnyere ya n’akpa. O nweghị ọrụ taara ya akpụ, ọ bụladị n’ọnwụ, ozu ya mara amụma. Ka o siri rụọ ọrụebube na ndụ ya, otu a ka ọrụ ya siri dị ịtụnaanya n’ọnwụ ya.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 97: 1-2, 3-4, 5-6,
Azịza: Ñụrịanụ n’Onyenweanyị ụnụ bụ ndị eziomume.
1. Onyenweanyị bụ eze! Ka ụwa ñụrịba
Ñụrịanụ ala niile mmiri gbara gburugburu.
Urukpu na ọchịchịrị gbara ya okirikiri,
o jiri eziomume na ikpe nkwụmọtọ were tọọ ntọala ocheeze ya. Azịza
2. Ọkụ na-aga n’ihu ya;
na-erepịasị ndịiro ya nọ n’akụkụ ya niile.
Amụma ya na-enye ụwa niile ihe
ụwa hụrụ nke a maa jijiji. Azịza
3. Ugwu niile gbazere dịka mmanụ
n’ihu Onyenweanyị nke ụwa niile.
Eluigwe na-cekwupụta eziomume ya,
mba niile na-ahụkwa otito ya. Azịza
4. Ihere mee ụnụ ndị na-esekpuru onyinyo
Ndị ji arụsụ ha anya isi
Chi niile sekpuoronụ Onyenweanyị. Azịza
MBEKU – 1 Sam 3:9; Jon 6:69
Alleluia, Alleluịa:
Kwuwe onyenwe m, nwodibo gị na-ege ntị. Ọ bụ gịnwa ji okwu nke ndụ ebeebe.
Alleluia.
OZIỌMA – 6:7-15
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Mgbe ụnụ na-ekpe ekpere, ụnụ ekwukwala ọtụtụ okwu na-abaghị uru, dịka ndị mba ọzọ si eme, n’ihina ha na-eche na site n’ọtụtụ okwu, Chineke ga-anụ ekpere ha.
Ụnụ emekwala ka ha, n’ihina Nna ụnụ maara mkpa ụnụ tupu ụnụ arịọ ya. Ya bụ, na-ekpenụ ekpere otu a: “Nna anyị nọ n’eluigwe ka otito dịrị aha Gị, ka ọchịchị Gị bịa, ka e mee uche Gị n’ụwa, Dịka e si eme ya n’eluigwe.
Nye anyị taata nri nke ụbọchị anyị, gbahara anyị mmehie anyị dịka anyị si ghaghara ndị mehiere anyị. Ekwela ka anyị kwenye na nranye ma zọpụta anyị n’ajọ ihe.
N’ihina ọ bụrụ na ụnụ agbaghara ndị mmadụ mmehie ha, Nna ụnụ nke bi n’eluigwe ga-agbaharakwa ụnụ; mana ọ bụrụ na ụnụ agbagharaghị ibe ụnụ mmehie ha mere ụnụ, Nna ụnụ agaghị agbaghara ụnụ mmehie ụnụ.
Igbo Mass Readings for June 21 2024, Ncheta Aloysius Gonzaga dị Asọ
Igbo Mass Readings for June 20 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.