Igbo Mass Readings for June 13 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 13 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 18:41-46
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ nke Mbụ nke Ndịeze
Elaịja agwa Ahab sị, “Laa n’ụlọ gị, na-eri, na-añụ n’ihina anụrụ m ụzụ oke mmiri ozuzo ka ọ na-asụ abịa.” Ahab gawara iri nri na ịñụ ihe ọñụñụ ma Elaịja gbagoro ugwu Kamel kpọọ isiala nke na ihu ya metụrụ ikpere ya.
Elaịja dunyere nwodibo ya ka o che osimiri ihu lezie anya n’akụkụ ahụ. O jere mee otu ahụ, lọghachi sị ya, “Ahụghị m ihe ọbụla.” Ọ gwakwa ya sị, “Mee ya ugboro asaa.”
Na nke asaa, nwaodibo ahụ kwuru sị, “obere urukpu ojii dịka aka mmadụ si n’osimiri apụta.” Elaịja ewee zie ya ka ọ gaa gwa Ahab ka ọ kwado ụgbọịnyịnya ya gbadaa n’ihina ọ bụrụ na o meghị otu a mmiri ga-amakpọ ya.
O teghị aka urukpu ojii agbachie eluigwe, oke ikuku kuwekwara; nnukwu mmiri wee bido zobe. Ahab agbagoro Jezril. Ike nke Osebụrụwa nọnyere Elaịja, ọ wasie akwa ya ike, were ọsọ buru Ahab ụzọ gbaruo Jezril.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 65:9,10,11-12
Azịza: Ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị na a ga-enye gị otito na Zayọn O Chineke.
1. Ị na-eleta ụwa na-enye ya mmiri,
ị na-eme ka o jupụta n’akụnụụba:
iyi nke Chineke jupụtara na mmiri,
iji nye ha mkpụrụ ubi. Azịza
2. Otu a ka i si eleta ya:
site n’ime ka mmiri zuo ala ahụ,
site n’ime ka ọ dị larịị site n’iji mmiri ozuzo mee ka o dee
site n’ịgọzi mkpụrụ mbụ ya. Azịza
3. Ị na-eji obi ọma gị agọzi afọ,
akụnụụba na-ejupụta ebe ọbụla i gafere;
ahịhịa ndụ dị n’ịkpa na-abawanye,
ugwu nta niile na-ejupụta n’ọñụ. Azịza
MBEKU – Jọn 14:23
Alleluia, Alleluia:
Ọ bụrụ na mmadụ ahụ m n’anya, ọ ga-edobe okwu m. Nna ga-ahụkwa ya n’anya. Anyị ga-abịakwute ya, biri n’ime ya.
Alleluia.
OZIỌMA – 5:20-26
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “N’ihi nke a, agwa m ụnụ, belụsọ ma eziomume ụnụ ọ kariri nke ndị odeakwụkwọ na nke ndị Farisii, ụnụ agaghị abata n’alaeze eluigwe.
Ụnụ anụla na a gwara ndị mgbe ochie sị, ụnụ egbula ọchụ. Onye ọbụla gburu ọchụ a ga-ekpe ya ikpe. Ma mụ onwe m na-agwa ụnụ sị, Onye ọbụla nke na-eburu nwanne ya iwe n’obi, a ga-ama ya ikpe.
Onye ọbụla kparịrị nwanne ya ga-aza azịza n’ụlọ ikpe. Onye ọbụla kpọrọ nwanne ya ‘Onye nzuzu’ ga-aba n’ọkụmmụọ.
Ya bụ ọbụrụ na ị na-eweta onyinye gị n’ekwu nchụaja, ma cheta n’ebe ahụ na gị na nwanne gị adịghị na mma, hapụ onyinye gị n’ihu ekwuaja. Buru ụzọ gaa ka gị na nwanne gị mezie. Mgbe ụnụ mezichara, bịa, ka i nye onyinye gị.
Mee ka gị na onye gbaara gị akwụkwọ kpezie ọsịsọ tupu ụnụ agaruo n’ụlọ ikpe, ka ọ ghara inyefe gị n’aka onye ọkaikpe, onye ọkaikpe e duru gị nye n’aka ndị nche, ndị nche ewee tinye gị n’ụlọ mkpọrọ.
N’eziokwu agwa m gị, ị gaghị esi ebe ahụ pụta ruo mgbe ị kwụchara ụgwọ gị niile.
Igbo Mass Readings for June 14 2024, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume
Igbo Mass Readings for June 13 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.