Igbo Mass Readings for May 2 2024, Tọọzde Izuụka nke Ise n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi
Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 2 2024, Tọọzde Izuụka nke Ise n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 15:7-21
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi
Ka ha sichara agụgọ okwu ogologo oge, Pita biliri sị ha, “Ụmụnna m, ụnụ maara na site na mbụ Chineke họpụtara m iche site n’etiti ụnụ ka m zisaa oziọma ahụ gwa ndị mba ọzọ, ka ha si n’ọnụ m nụ ya, ma kwerekwa.
Chineke, onye maara obi mmadụ gbaara ha akaebe site na inye ha Mmụọ Nsọ dịka o nyere anyị. O gosighị ihe dị iche n’etiti anyị na ha. O mere ka obi ha dị ọcha n’ihina ha kwere na Kristi.
Ugbu a gịnị mere ụnụ ji anwa Chineke, na-ele ihe ọ ga-eme, site na iwere ibu arọ nke Iwu Mosis bokwasị ndị na-eso ụzọ Jesu, Ibu nnanna anyị ha na anyị onwe anyị ebulighị?
Anyị kwere na-aga azọpụta anyị na ha site n’amara nke Onyenweanyị Jesu.” Mgbe ha nụrụ nke a nzukọ niile ahụ gbara nkịtị. Ha bidoro gewe ntị na-akụkọ Pọl na Banabas na-akọrọ ha maka ihe ịrịbaama niile, na ọrụ ịtụnaanya niile nke Chineke jiri ha rụọ n’etiti ndị mba ọzọ.
Mgbe ha kwuchara okwu nke a, Jemis kwuru sị: “Ụmụnna m, geenụ m ntị! Saịmọn akọọrọla anyị otu Chineke siri buru ụzọ leta ndị mba ọzọ, si n’etiti ha họpụtara onwe ya otu ndị ga-ekwupụta aha ya.
Nke a na okwu ndị amụma dakọtara dịka e dere ya n’Akwụkwọ Nsọ sị: “Mgbe nke a gachara, aga m alọghachi, Aga m ewulite ụlọ Devid nke dara ada; n’ebe ya niile a kwadara akwada, Aga m emekwa ya ka o guzosie ike, ka ndị fọdụrụ n’etiti ndị mmadụ chọọ Onyenweanyị; bụ ndị mba ọzọ m kpọrọla ka ha bụrụ ndị nke m.
Chineke kwuru nke a, onye mere ka a mara ihe ndị a site na mgbe ochie.” Ya bụ mkpebi m bụ ka anyị ghara isogbu ndị mba ọzọ lọghachikwutere Chineke, kama, ka anyị dee akwụkwọ gwa ha ka ha ghara imerụ onwe ha site n’iri ihe e jiri chụọ aja, na isonye na ihe arụsị niile, ka ha wepụ onwe ha n’ịkwa iko na iri anụ anyagburu anyagbu, ma ọ bụ ọbara.
Site na mbụ, Mosis nwere ndị na-ekwusa iwu n’obodo niile. A na-agụkwa ya n’ụlọ nzukọ niile n’ụbọchị Sabat niile.”
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 96: 1-2, 2-3, 10.
Azịza: Kwupụtanụ ọrụ ịtụnaanya ya n’ebe mba niile nọ.
1. Kweerenụ Onyenweanyị ukwe ọhụrụ;
ụwa niile kweere Onyenweanyị ukwe.
Kweerenụ Onyenweanyị ukwe,
Toonụ aha ya. Azịza
2. Kwupụta nzọpụta ya ụbọchị niile.
Mee ka ụwa niile mara maka otito ya,
kwupụtakwa ọrụ ịtụnaanya ya
n’ebe ndị mmadụ nọ. Azịza
3. Kwusachaanụ n’ụwa niile na Onyenweanyị bụ eze,
ọ kwụwasiri ụwa ike, e nweghị ike ibugharị ya.
Ọ ga-eji ikpe nkwụmọtọ kpee mba niile ikpe. Azịza
MBEKU
ALLELUIA ALLELUIA:
Ebe Chineke mere ka Kristi si n’ọnwụ bilie, Ọ gaghị anwụkwa ọzọ, ọnwụ enweghịkwa ike ọzọ n’ebe ọ nọ.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 15:9-11.
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị: “Otu Nna m si hụ m n’anya, ka m si hụ ụnụ n’anya. Nọgidenụ n’ịhụnaanya m.
Ọ bụrụ na ụnụ edobe iwu m niile, ụnụ ga-anọgide n’ịhụnaanya m, dịka m si dobe iwu niile nke Nna m, wee nọgide n’ịhụnaanya ya.
Ihe ndị a ka m gwara ụnụ, ka ọñụ m wee dị n’ime ụnụ, na ka ọñụ ụnụ wee zuo oke.”
Igbo Mass readings for May 3 2024, Emume Ncheta Filip na Jemis dị Asọ
Igbo Mass Readings for May 2 2024, Tọọzde Izuụka nke Ise n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.