Igbo Mass Readings for February 8 2024, Tọọzde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 8 2024, Tọọzde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 11:4-13

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ Ndịeze nke mbụ

Mgbe Solomọn mebeere okenye, ndị nwunye ya dunyere ya n’ife chi ndị mba ọzọ. Obi ya akwụdosikwaghị ike na Yahweh Chineke ya dịka nke nna ya Devid. Solomọn efebezie Ashtọret, nke bụ chi ndị Sidọn na Milkọm, chi ọjọọ nke ndị Amọn.

Solomọn mere ihe ọjọọ megide Yahweh n’ihina o jighị obi ya niile fee Yahweh dịka nna ya Devid siri mee, Solomọn rụrụ ebe dị elu maka Chemọsh, nke bụ chi ndị Moab, n’elu ugwu nke dị n’ọwụwa anyanwụ Jerusalem.

Ọ rụkwara maka Mọlek, nke bụ chi ndị Amọn. Otu a ka o siri meere ndị nwunye ya niile ọ lụtara na mba. Ha nọ ebe ahụ na-achụnyere chi mba ndịọzọ aja na mgbaisiọma. Yahweh wesaara Solomọn iwe n’ihina obi ya apụọla ebe Yahweh Chukwu nke Izrel nọ, onye gosirila ya onwe ya ugboro abụọ; tiere ya iwu ka ọ ghara ifee chi ọzọ, ma o meghị ihe Yahweh kwuru.

Maka ihi a Yahweh gwara Solomọn sị, “Ebe ọ bụ na ị chọghị idobe ọgbụgbandụ mụ na gị ya na iwu ndị m nyere gị, aga m anapụ gị alaeze gị, were ya nye otu n’ime ụmụ odibo gị. Mana maka ihi nna gị Devid, agaghị m eme nke a mgbe ị ka dị ndụ.

Aga m eme ya n’oge ọchịchị nwa gị. Ka o sila dị agaghị m anapụcha nwa gị alaeze a; aga m ahapụrụ ya ọchịchị otu agbụrụ n’ihi nwodibo m Devid, na n’ihi Jerusalem, obodo m jiri aka m họrọ.”

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 106:3-4, 35-36, 37, 40

Azịza: Onyenweanyị cheta anyị n’ihi ịhụnaanya i nwere n’ebe ndị nke gị nọ.

1. Ngọzi dịrị ndị na-akwụba aka ọtọ,

ndị na-eme mma oge niile.

Cheta m O Osebụrụwa! n’ihi ịhụnaanya i nwere n’ebe ndị nke gị nọ.

Bịakwute m dịka onye nzọpụta. Azịza

2. Mana ha na ndị mba ọzọ na-alụkọrịta nwaanyị,

wee mụta ime ka ha si eme

Ha bidoro febe arụsị ha,

nke bụụrụ ha ọnya. Azịza

3. Ha weere ụmụ ha nwoke na ụmụ ha nwaanyị

chụọrọ ndị ajọ mụọ aja;

Iwe nke Onyenweanyị wee dị ọkụ n’ebe ndị nke ya nọ,

o wee leghara ndị nke ya anya. Azịza

MBEKU

Alleluia, Alleluia:

Okwu ndị m gwara ụnụ bụ mmụọ bụrụkwa ndụ, Ọ bụ gịnwa ji okwu nke ndụ ebeebe.

Alleluia.

OZIỌMA – 7:24-30

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Jesu hapụrụ ebe ahụ gaa obodo Taya na Sidọn. Ọ banyere n’ime ụlọ na-achọghị ka onye ọbụla mara. Ma o zotalighị onwe ya. Ngwangwa otu nwaanyị onye mmụọ ọjọọ ji nwa ya nwaanyị nke nta nụrụ maka ya, wee bịa, daa n’ala n’ụkwụ Jesu.

Nwaanyị a bụ onye Grik, ma a mụrụ ya na Sairo-Fonishịa. Ọ rịọrọ Jesu ka ọ chụpụ mmụọ ọjọọ n’ahụ nwa ya nwaanyị. Jesu gwara ha sị, “Ka e bu ụzọ nyejuo ụmụaka afọ n’ihina o zighị ezi iwere nri ụmụaka tụpụrụ nkịta”.

Nwaanyị ahụ zara sị, “Nke a bụ eziokwu Onyenwe m ma ụmụnkịta na-erikwa iberibe nri si n’okpokoro nri ụmụntakịrị dapụ n’ala”. Jesu zara ya, “N’ihi osisa nke a; laba; mmụọ ọjọọ ahụ ahapụla nwa gị nwaanyị”. O wee laruo ụlọ hụ nwa ya nwaanyị ka o dina n’akwa, mmụọ ọjọọ ahụ ahapụkwala ya.

Igbo Mass Readings for February 9 2024, Fraịde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for February 8 2024, Tọọzde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 8, 2022