Igbo Mass Readings for February 16 2023, Tọọzde n’ime Izuụka nke Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 16 2023, Tọọzde n’ime Izuụka nke Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 9:1-13
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Jenesis
Chineke agọzie Noa na ụmụ ya ma sị ha, “Mụbanụ ma jupụta n’ụwa. Ụnụ ga-abụ ndị a ga-atụ egwu n’ebe ụmụanụmaanụ niile ndị nọ n’eluala na ebe ụmụnnụnụ nke igwe nọ n’ebe ihe niile nke na-arị arị n’elu ala na n’ebe azụ nke dị n’osimiri nọ, e tinyela ha niile n’aka ụnụ.
Ihe niile dị ndụ, nke na-agagharị agagharị ga-abụ ihe oriri ụnụ; dịka m siri nye ụnụ ihe niile. Ụnụ agaghị eri anụ agbaghị ọbara. Aga m ajụ ajụjụ maka ndụ ụnụ, ajụjụ maka nke mmadụ niile nakwa nke ụmụanụmaanụ.
Onye ọbụla gburu mmadụ a ga-egbukwa ya n’ihina Chineke kere mmadụ n’oyiyi ya. Mịtanụ mkpụrụ ma mụbaanụ jupụtanụ n’ụwa ma chịwanụ ya.
Chineke agwa Noa na ụmụ ya okwu ndị a, “Lee, mụ na gị na ụmụ ụmụ gị ga-enwe ọgbụgbandụ; na ihe niile e kere eke nke gị na ya nọrọ, ụmụnnụnụ, anụụlọ na anụọhịa niile so gị, ihe niile nke si n’ime ụgbọ ahụ pụta, ihe niile dị ndụ n’elu ụwa.
Ma aga m edozi ọgbụgbandụ mụ na gị nke na-enweghị mgbe ọzọ a ga-eji oke mmiri emebi ihe niile dị ndụ, a gaghịkwa eji oke mmiri emebi ụwa ọzọ.
Chineke asị, “Nke a bụ akara nke ọgbụgbandụ ahụ nke m na-eme n’etiti mụ na gị na n’ihe niile e kere eke gị na ya so n’afọ niile na abịanụ. Ugbu a etinyela m egwurugwu m n’ime urukpu; ọ ga-abụ akara maka ọgbụgbandụ n’etiti mụ na ụwa.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 102:15-19,20-21, 28, 22
Azịza: Onyenweanyị sitere n’eluigwe na-ele ụwa anya.
1. Mba niile ga-atụ aha nke Onyenweanyị egwu,
ndịeze ụwa niile ga-asọpụrụ otito gị;
N’ihina Onyenweanyị ga-arụgharị Zayọn;
mekwaa ka a hụ ebube ya.
Ọ ga-aza ekpere ndị ogbenye,
ọ gaghị ajụ arịrịọ ha. Azịza
2. Ka e debaa ihe ndị a n’akwụkwọ
maka agbụrụ ndị ga-abịa n’ihu,
ka ndị niile amụbeghị amụ were nwee ike too Onyenweanyị.
Onyenweanyị sitere n’ebe nke ya dị asọ were ledata anya,
O sitere n’eluigwe na-ele ụwa anya.
Ka o were nụrụ ude ndị nọ na mkpọrọ na-asụ,
ka o were tọhapụ ndị a mara ikpe ọnwụ. Azịza
3. Ụmụodibo gị ga-ebi n’udo,
ụmụ ụmụ ha ga-akwụdosikwa ike n’ihu gị.
N’ihi nke a, aha Onyenweanyị ga-ewu ewu na Zayọn,
otito ya ga-adịkwa na Jerusalem;
Mgbe mba niile na alaeze niile ga-agbakọta ọnụ ife Onyenweanyị. Azịza
MBEKU – Jon 14:23
Alleluia, Alleluia:
Ọ bụrụ na mmadụ ahụ m n’anya, ọ ga-edobe okwu m. Nna ga-ahụkwa ya n’anya. Anyị ga-abịkwute ya, biri n’ime ya.
Alleluia.
OZIỌMA – 8:27-33
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Jesu na ndị na-eso ụzọ ya pụrụ gagharịa n’obodo nta dị icheiche nke obodo Sizerịa Filipi. Ka ha na-aga n’ụzọ, Jesu jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Onye ka ndị mmadụ na-asị na mụ onwe m bụ?”
Ha sịrị ya, “Ụfọdụ na-ekwu na ị bụ Jọn, onye na-eme mmirichukwu, ndị ọzọ na-ekwu na ị bụ Elaịja, ndị ọzọkwa na-asị na ị bụ otu onye n’ime ndị amụma”.
Ọ jụrụ ha sị, “Onye ka ụnụ onwe ụnụ na-asị na m bụ?” Pita zara ya sị, “Gị onwe gị bụ Kristi ahụ!”: Ọ dọrọ ha aka na ntị ka ghara ịgwa onye ọbụla banyere ya.
Jesu bidoro ịkụziri ndị na-eso ụzọ ya na nwa nke mmadụ ga-ata ọtụtụ ahụhụ, ndị okenye na ndịisi nchụaja na ndị odeakwụkwọ ga-ajụkwa ya, a ga-egbu ya.
Ma mgbe ụbọchị atọ gachara, ọ ga-ebilitekwa n’ọnwụ. Ọ kọọrọ ha ihe a n’ezoghị ọnụ. Pita kpọọrọ ya gaa n’akụkụ malite ị bara ya mba.
Ma Jesu tụgharịrị, lee ndị na-eso ụzọ ya anya, wee baara Pita mba, sị, “Gafee m n’azụ, Ekwensu! N’ihina uche gị abụghị uche nke Chineke kama ọ bụ uche nke mmadụ!”
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.