Igbo Mass Readings for February 17 2028, Tọọzde n’ime Izuụka nke Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 17 2028, Tọọzde n’ime Izuụka nke Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:1-9

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọozi Jemis

Ụmụnna m! Dịka ndị kwere n’Onyenweanyị Jesu Kristi, bụ onye nwe ebube niile ụnụ ejila ile mmadụ anya n’ihu, na ịkpa oke emeso onye ọbụla.

A sị na otu ọgaranya yi uwe mara mma nke ukwu, gbarakwa mgbaaka ọlado, abata n’ụlọ nzukọ ụnụ: a sịkwa na otu ogbenye yi uwe ruru inyi abatakwa otu mgbe ahụ gịnị ka ụnụ ga-eme?

Ọ bụrụ na ụnụ elee onye ọgaranya ahụ anya sị ya: Bịa nọdụ n’otu oche a e dobere iche n’ihi gị ma ụnụ asị onye ogbenye ahụ, Di anyị, I nwere ike iguzo n’ebe ahụ, mọbụ bịa nọdụ ala n’ebe a ụkwụ m dị; Ọ bụ na ụnụ akpabeghị oke n’etiti onwe ụnụ bụrụkwa ndị ji ile anya n’ihu na obi ọjọọ na-ekpe ikpe?

Geenụ ntị, ụmụnna m hụrụ n’anya! Ọ bụ na Chineke ahọrọbeghị ndị bụ ogbenye n’ihe nke ụwa ka ha bụrụ ndị ogaranya n’okwukwe bụrụkwa ndị nketa nke alaeze ahụ nke o kwere nkwa inye ndị hụrụ ya n’anya?

Ma ụnụ akparịala nwa ogbenye! Ọ bụ na ọ bụghị ndị ọgaranya ụnụ na-asọpụrụ na-emegbu ụnụ? Ọ bụ na ọ bụghị ha na-akpụpụ ụnụ n’ụlọikpe? Ọ bụ na ọ bụghị ha na-ekwutọ aha ọma ahụ nke a gụrụ ụnụ?

Ọ bụrụ na ụnụ edebezuo iwu nke Eze anyị dịka e dere ya n’Akwụkwọ Nsọ sị: Hụ mmadụ ibe gị n’anya dịka onwe gị! Ụnụ mere nke ọma.

Ọ bụrụ na ụnụ na-eji ile anya n’ihu na-emeso mmadụ ibe ụnụ, ụnụ na-eme njọ. Iwu Chineke amala ụnụ ikpe dịka ndị na-emebi iwu.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 34: 1-2,3-4,5-6

Azịza: Onyenweanyị na-anụ mkpu akwa nwogbenye

1. Aga m eto Onyenweanyị oge niile,

Otito ya ga-adị n’egbugbere ọnụ m mgbe ọbụla.

Mkpụrụobi m na-egorị n’Onyenweanyị;

ka ndị umeala nụrụ ma ñụrịa. Azịza

2. Soronụ m kwupụta ịdịukwu nke Onyenweanyị,

Soronụ m too aha ya.

Akpọkuru m Onyenweanyị Ọ za m

Ọ zọpụtara m n’egwu niile na-atụ m. Azịza

3. Ihu ọbụla chere n’ebe Onyenweanyị nọ na-amụke amụke,

ihere anaghị eme ya ma ọlị.

Onyenweanyị na-anụ mkpu akwa nwogbenye,

Ọ na-enyekwara ya aka na nsogbu ya niile. Azịza

MBEKU – Jon 14:23

Alleluia, Alleluia:

Ọ bụrụ na mmadụ ahụ m n’anya, ọ ga-edobe okwu m. Nna ga-ahụkwa ya n’anya. Anyị ga-abịkwute ya, biri n’ime ya.

Alleluia.

OZIỌMA – 8:27-33

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Jesu na ndị na-eso ụzọ ya pụrụ gagharịa n’obodo nta dị icheiche nke obodo Sizerịa Filipi. Ka ha na-aga n’ụzọ, Jesu jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Onye ka ndị mmadụ na-asị na mụ onwe m bụ?”

Ha sịrị ya, “Ụfọdụ na-ekwu na ị bụ Jọn, onye na-eme mmirichukwu, ndị ọzọ na-ekwu na ị bụ Elaịja, ndị ọzọkwa na-asị na ị bụ otu onye n’ime ndị amụma”.

Ọ jụrụ ha sị, “Onye ka ụnụ onwe ụnụ na-asị na m bụ?” Pita zara ya sị, “Gị onwe gị bụ Kristi ahụ!”: Ọ dọrọ ha aka na ntị ka ghara ịgwa onye ọbụla banyere ya.

Jesu bidoro ịkụziri ndị na-eso ụzọ ya na nwa nke mmadụ ga-ata ọtụtụ ahụhụ, ndị okenye na ndịisi nchụaja na ndị odeakwụkwọ ga-ajụkwa ya, a ga-egbu ya.

Ma mgbe ụbọchị atọ gachara, ọ ga-ebilitekwa n’ọnwụ. Ọ kọọrọ ha ihe a n’ezoghị ọnụ. Pita kpọọrọ ya gaa n’akụkụ malite ị bara ya mba.

Ma Jesu tụgharịrị, lee ndị na-eso ụzọ ya anya, wee baara Pita mba, sị, “Gafee m n’azụ, Ekwensu! N’ihina uche gị abụghị uche nke Chineke kama ọ bụ uche nke mmadụ!”

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for February 17 2028, Tọọzde n’ime Izuụka nke Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 8, 2022