Igbo Mass Readings for June 8 2023, Tọọzde n’ime Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 8 2023, Tọọzde n’ime Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 6:10-11; 7:1, 9-14; 8:4-8

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Tobit

Mmụọọma Rafel gwara Tobiyas sị: “Nwanne m, anyị na Raguel ga-anọ taa. Ọ bụ onye ikwu na ibe gị, o nwere sọ otu nwaada bụ Sara. Mgbe ha rutere Ekbatana, Raguel nọ na ọnụ ụzọ ama ya, ha wee keele ya, O wee zaa. Raguel ewere kpọbata ha n’ime ụlọ ma gbuo otu atụrụ ya.

Ya na nwunye ya Edina nyere ha ezi nnabata. Mgbe ha sachara ahụ ewee kpọbata ha n’oche nri. Mgbe ahụ Tobiyas gwara Rafel sị: “Azarịyas nwanne m nwoke, kwugharịa ihe ndị ahụ i kwuru n’ụzọ ọzọ, ka anyị kpebie ha ugbu a”.

Rafel gwara Raguel ihe ndị ahụ niile. Raguel wee gwa Tobiyas sị, “Rie ma ñụọ, na-enwekwa añụrị, n’ihina o kwesịrị ka ị lụọ nwa m. Ma chere ka m kọwaara gị nke bụ eziokwu.

Ada m nwaanyị alụọla di asaa, nke ọbụla n’ime ha nwụrụ n’abalị ha bakwutere ya; ma nwebe añụrị maka nke ugbu a. Tobiyas zara ya sị: “Agaghị m eri ihe ọbụla ruo mgbe i kwetere na m ga-alụ ada gị nwaanyị”.

Raguel wee gwa ya sị: “Kpọrọ ya ugbu a dịka usoro iwu si dị, gị na ya bụ ikwu na ibe. Chineke dị ebere ga-echekwaba ụnụ nke ọma”. Raguel kpọọrọ ada ya Sara n’aka nyefee ya Tobiyas ka ọ bụrụ nwunye ya.

Ọ gwara ya sị: “Lee ada m ebe a, kpọrọ ya dịka usoro iwu Mosis siri dị, kpọrọ ya lakwuru nna gị”. O wee gọzie ha. Raguel kpọrọkwaara nwunye ya Edina, were akwụkwọ depụta mkpebi agbamakwụkwọ ahụ, ha wee tinye aka n’ime ya.

Mgbe ahụ ha bidoro iri nri. Mgbe e mechiri ụzọ, sọọsọ ha abụọ nọ, Tobiyas siri n’elu akwa bilie sị, “Nwanne m nwaanyị, bilie ka anyị kpee ekpere ka Chineke nwee ike imere anyị ebere”.

Tobiyas amalite ekpere sị: “Ngọzi dịrị gị Chineke nke nna anyị ha, ngọzi dịkwara aha nsọ gị dị otito mgbe niile. Ka eluigwe na ihe niile e kere eke gọzie gị. Ọ bụ gị kere Adam nye ya Eve ka ọ bụrụ nwunye ya, onye enyemaka na onye nkwado ya, Ọ bụ na ha ka mmadụ niile siri pụta.

Ọ bụ gị kwuru sị: Ọ dịghị mma ka nwoke nọrọ naanị ya; ka anyị nye ya onye enyemaka yiri ya”. Ugbu a, O Dinwenụ, anaghị m akpọrọ nwanne m nwaanyị a n’ihi agụụ nke anụahụ, kama n’obi ọcha, meere m ebere, ka mụ na ya bịe, kaa nka. O soro ya zaa “Amen”. Ha abụọ wee laba ụra.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 128:1-2, 3, 4-5

Aziza: Ngọzi na-adịrị ndị na-atụrụ Chineke egwu.

1. Ngọzi na-adịrị ndị na-atụrụ Chineke egwu,

na-eso ụzọ ya.

Ihe aka gị kụtara ka ị ga-eri,

añụrị na ọganịihu ga-abụ nke gị. Azịza

2. Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịn,

na-amị mkpụrụ n’ime ụlọ gị,

ụmụ gị ga-adị ka osisi Oliv,

gbaa oche nri gị gburugburu. Azịza

3. Lee, otu ahụ ka a ga-esi gọzie onye ahụ,

nke na-atụrụ Chineke egwu.

Ka Onyenweanyị si na Zayọn gọzie gị,

ka ị hụkwa ọganiihu nke Jerusalem

ụbọchị ndụ gị niile. Azịza

MBEKU – Ps. 119:34

Alleluia, Alleluia:

Nye m nghọta ka m wee mata iwu gị, wee nwee ike iji obi m niile dobe iwu gị.

Alleluia.

OZIỌMA – 12:28-34

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Ma otu onye odeakwụkwọ bịarutere nụ ka ha na Jesu na-arụrịta ụka. Mgbe ọ hụrụ na Jesu zara ajụjụ ndị Sadụsii nke ọma, ọ jụrụ ya sị, “Olee iwu kacha n’ime iwu Chineke niile?”

Jesu zara ya sị, “Nke mbụ bụ nke a: ‘Nụrụnụ, ụmụ Izrel, Osebụrụwa Chineke anyị bụ otu. Ị ga-eji obi gị niile, mmụọ gị niile, uche gị niile na ike gị niile hụ Chineke n’anya’.

Nke abụọ bụ: ‘Ị ga-ahụ mmadụ ibe gị n’anya ka i si hụ onwe gị n’anya’ Ọ dịghị iwu ọzọkwa ka ndị a” Onye odeakwụkwọ ahụ zara ya sị, “Onyenkuzi, ị zara nke ọma, i kwuru n’ezie na Onyenweanyị bụ Chineke dị otu, na ọ dịghị Chineke ọzọ dị ma e wepụ ya I ji obi gị niile, nghọta, na ike gị niile, hụ ya n’anya na ịhụkwa mmadụ ibe gị n’anya ka onwe gị ka mkpa karịa aja nsureọkụ na aja ndị ọzọ a na-achụrụ Chineke”.

Mgbe Jesu hụrụ na ọ zara nke ọma, ọ gwara ya sị, “Ị nọteghị aka n’alaeze nke Chineke”. Mgbe nke a mechara, egwu ekwekwaghị onye ọbụla jụọ ya ajụjụ.

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for June 8 2023, Tọọzde n’ime Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 9, 2022