Igbo Mass Readings for December 2 2021, Tọzde Izuụka nke Mbụ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị

Nke a bụ Igbo Mass Readings maka December 2 2021, Tọzde Izuụka nke Mbụ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.

Bible quotations for Igbo Mass Readings for December 2 2021, Tọọzde Izuụka nke Mbụ n'oge Adventi
Igbo Mass Readings for December 2 2021, Tọọzde Izuụka nke Mbụ n’oge Adventi

EKPERE MMEGHE

Nna, anyị chọrọ enyemaka Gị. Zọpụta anyị na njọ ma dubata anyị na ndụ. Werekwa ike Gị nyere anyị aka. Site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi …

Ihe Ọgụgụ nke mbụ – 26:1-6

Ihe ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ onye Amụma Aịzaya:

N’ụbọchị ahụ, a ga-ekwe ukwe nke a na Juda: “Anyị nwere obodo e wusiri ike; Ọ na-akwụwa nzọpụta na ya dịka mgbidi siri ike.

Meghee ọnụ ụzọama, ka mba eziomume, mba nwere okwukwe bata. Ị na-eme ka o nwee udo zuru oke bụ onye ahụ nke obi ya dị n’ebe Ị nọ, n’ihi na ọ tụkwasịrị obi na gị.

Tụkwasanụ obi na Yahweh mgbe niile, n’ihina Yahweh Chineke bụ nkume mgbe ebighi ebi. N’ihina o butuola ndị bi n’ebe dị elu, n’ obodo dị elu.

O wedaala ya, tọgbọ ya n’ala, tụrụọ ya n’aja. Ụkwụ ga-azọpịa ya, ụkwụ ndị ogbenye na nzọ ụkwụ ndị a na emegbu emegbu.”

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 118:1. 8-9.19-21.25-27.

Azịza: Ngọzi dịrị onye ahụ na-abịa na-aha Onyenweanyị.

1. Nye Onyenweanyị ekele n’ihi na ọdị mma,
ebere ya enweghị njedebe.
Ọ ga-akara m mma, ịgbaba n’Onyenweanyị,
karịa ịtụkwasịobi m na ndị mmadụ
Ọ ga akara m mma ịgbaba na Chineke,
karịa ịtụkwasịobi n’ụmụ ndị eze. Azịza

2. Megheere m ụzọ nke eziomume
ka m bata bịa nye Onyenweanyị ekele.
Nke a bụ ọnụụzọ nke Onyenweanyị,
ebe ndị eziomume ga-esi bata
Ana m ekele gị n’ihi na Ị nụla olu m
Ị bụkwa onye nzọpụta m. Azịza

3. Biko Onyenweanyị, biko zọpụta anyị,
biko Onyenweanyị, biko nye anyị ọganihu
Ngọzi dịrị onye ahụ na-abịa n’aha Onyenweanyị,
anyị na-eto gị site n’ụlọ Onyenweanyị
Osebụrụwa bụ Chineke, o ji ihu ọchị ele anyị. Azịza

MBEKU

ALLELUỊA ALLELUỊA:
Chọọ Chineke mgbe ọ ga-ekwe nchọta, kpọkuo ya oge ọ nọ nso.
ALLELUIA.

OZIỌMA – 7:21.24-27

Ihe ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị: “Ọ bụghị onye ọbụla nke na-akpọ m ‘Dinwenụ, Dinwenụ ga-aba n’alaeze eluigwe, kama ọ bụ onye na eme uche nke Nna m bi n’igwe.

“Onye ọbụla nke na-anụ okwu m ndị a, na emekwa ha, dịka nwoke maara ihe, nke rụrụ ụlọ ya n’elu okwute; mmiri wee zoo, ide mmiri tojuo, ifufe bukwara ya ma ọ daghị, n’ihi na a tọrọ ntọala ya n’elu okwute;

Onye ọbụla nke na-anụ okwu ndị a, ma ọ naghị eme ha, dịka onye nzuzu nke rụrụ ụlọ ya n’elu aja, mmiri zoro, ide mmiri tojuo, ifufe bukwara ya, o wee daa. Ọdịda nke ụlọ ahụ buru ibu nke ukwuu”.

EKPERE NHUNYE

Nna, site n’ihe niile I nyere anyị, anyị na-ehunyere Gị achịcha na mmanya nke a. Ebe anyị na-efe Gị ugbu a, nara onyinye anyị ma were nkwa ndụ ebighi ebi I kwere anyị gbaa anyị ume. Mezuoro anyị ihe ndị a site na Kristi Dinwenụ anyị. Amen.

EKPERE ANATACHA ORIRI NSỌ

Nna, mee ka orikọ anyị nke a kwalite n’ime anyị ịhụ ihe nke eluigwe n’anya. Meekwa ka nkwa na nchekwube di n’ime ya na-eduzi ụzọ anyị n’elu ụwa a. Anyị na-arịọ ihe ndị a site na Kristi Dinwenụ anyị. Amen

Igbo Mass Readings for December 1 2021, Wednezde Izuụka nke Mbụ n’oge Adventi

Subscribe to Receive Daily Mass Readings via Email

Follow us on Social Media:

Igbo Mass Readings for December 2 2021, Tọzde Izuụka nke Mbụ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị Catholic Lectionary

error: Content is protected !!
Open chat
1
Catholic Lectionary
Hello 👋
How can I help you?