Igbo Mass Readings for Thursday Izuukwu Mbilite n’onwu nke Kristi

THURSDAY: N’IZUUKWU NKE MBILITE N’ONWU KRISTI.

EKPERE MMEGHE
Nna, I kpokotara uwa niile ka ha too aha Gi. Mee ka ndi niile amughariri site na mmirichukwu buru otu n’okwukwe na n’ihunaanya. Site na Dinwenu anyi Jesu Kristi …

Ihe Ogugu nke mbu 3:11-26
The ogugu ewetara n’Oru Ndiozi:
Ebe nwoke a no jidesie Pita na Jon aka ike, igwe mmadu ahu niile jiri oso gbakoo n’ebe ha no n’otu ulo di na mputa nke ulonso Chineke, nke a na-akpo Iba Solomon. The merenu gbagwojukwara ha anya nke ukwu. Mgbe Pita huru ha, o gwara ogbako ahu si, “Ndi Izrel ibe m! Gini mere ihe a ji ju unu anya otu a? O bu gini mere unu ji ele anyi anya otu a, dika aga-asi na anyi mere ka o jee ije site n’ike aka anyi ma o bu site n’ezi okpukpe anyi na-enye Chukwu? Chukwu nke Abraham, na nke Aizik, na nke Jekob, Chukwu nke nnanna anyi ha, enyela nwodibo ya bu Jesu otito na ebube kacha elu. Onye nke unu nyefere n’aka ndi isi, gonahukwa ya n’ihu Pailet, O buladi mgbe Pailet kpebiri ihapu ya. Unu gonahuru onye nso na onye eziomume ahu ma rio ka a hapuru unu onye ogbu mmadu. N’ime nke a, unu egbuo onye na-enye ndu, onye Chukwu mere ka o si n’onwu bilie. Anyi onwe anyi bukwa ndi akaebe nke mbilite n’onwu ya. O bu site n’ike nke aha ya ka nwoke a unu huru, matakwa, si nweta ike iga ije. Ma obukwa site n’okwukwe e kwere n’aha ya ka e si nwee ike imezu nke a. Okwukwe ahu nke sitere n’aka Jesu mere ka ahu nwoke a zuo oke n’ihu unu niile. Ma ugbu a, umunna m, amatala m na ihe unu na ndi isi unu mere Jesu, unu mere ya n’amaghi ama. Maka na Chineke mere ka ihe niile o buru uzo kwusaa site n’onu ndi amuma ya niile, na Kristi ga-ata ahuhu mezuo. Ya bu, chegharianu laghachikwutekwanu Chineke ka o sachapu mmehie unu niile, ka oge inweta ume ndu si n’ebe Onyenweanyi no bia, ka Chineke wee zitekwa Jesu onye o si na mbu hoputa ka o buru Kristi unu. O ghaghi inodu n’eluigwe ruo mgbe Chineke mezuru ihe niile ka o di ohuru dika o siri kwuo site n’olu ndi amuma ya mgbe ochie.
Mosis kwuru si, “Onyenweanyi Chineke ga-esi n’etiti unu kpolitere unu onye amuma dika o siri kpolite m. Unu ga-ege ya nti n’ihe niile o na agwa unu. N’oge ahu, a ga-esi n’etiti unu mapu onye obula egeghi onye amuma ahu nti.” Ee ndi amuma niile site na Samuel na ndi niile so ya n’azu sooro kwusaa okwu maka ubochi ndi a. Unu onwe unu bu umu ndi amuma burukwa ndi nketa nke ogbugbandu ahu, nke Chineke na nnanna unu ha gbara mgbe o kwere Abraham nkwa si, “site n’agburu gi ka m ga-agozi mba niile nke uwa. Mgbe Chineke kpolitere nwodibo ya, o buuru uzo zitere unu ya ka o gozie unu site n’ikpoghachi unu azu site na mmehie unu.”

ABUOMA NA AZIZA: Ps:8:2,5,6-7,8-9.
Aziza: Onyenweanyi Chineke anyi, gi siri di elu n’uwa niile.

  1. Onyenweanyi Chineke anyi,
    lee ka aha gi siri di elu n’uwa niile,
    gini ka mmadu bu I ji eche echiche banyere ya,
    nwa nke mmadu na i na-eleta ya anya?. Az./
  2. N’agbanyeghi, i mere ka o jiri obere ihe karia ndi mmuooma nta,
    I jikwa úgwù na nsopuru choo ya mma di ka okpueze.
    I mere ya nna ukwu ihe niile e kere eke,
    were ihe niile dobe n’okpuru ya. Az/
  3. O na-achi umuaturu na ehi,
    ya na umu anu ohia ndi ozo di n’osimiri.
    O na-achi umu nnunu nke igwe, azu di na mmiri,
    na anu ndi ozo di na osimiri. Az/

ALLELUIA ALLELUIA:
Taa bu ubochi ahu Onyenweanyi mere, ka anyi nwee anuri ka obi di anyi uto na ya.
ALLELUIA.

OZIOMA: 24:35-48.
Ihe ogugu ewetara n’Ozioma di aso nke Luk dere:
Ha mmadu abuo kooro ndi ozo ihe mere n’uzo mgbe ha gaje Emaus, na ka ha si mata onye o bu site na-inyawa achicha. Mgbe mmadu abuo ahu na-ako ihe ndi a, Jesu eguzoro n’etiti ha si ha: “Udo diri unu!” Mana ha kujara, tukwaa egwu, chee na ha huru ndi mmuo. O juru ha si: “Gini mere egwu ji na-atu unu, ginikwa mere unu ji enwe obi abuo? Leenu aka m na ukwu m, ka unu mara na o bu mu onwe m. Metunu m aka ka unu marakwa na o bu m, n’ihina mmuo enweghi anuahu na okpukpu dika unu huru na m nwere. Mgbe o kwuchara nke a o gosi ha aka ya na ukwu ya. Añuri ha ka di ukwuu nke na ha ekwetabeghi n’ihe ha huru, n’ihi na o turu ha n’anya. Jesu juru ha si, “Unu nwere ihe oriri obula n’ebe a?” Ha nyeturu ya azu a nara n’oku. O nara ha azu ahu, rie ya n’ihu ha. Jesu gwara ha si: “The ndi a bu ihe ndi m gwara unu mgbe mu na unụ no, na ihe niile e dere n’Akwukwo iwu Mosis, n’Akwukwo ndi amuma na Abuoma banyere m aghaghi imezu.”
Mgbe ahu O meghee uche ha, ka ha ghota ihe e dere n’Akwukwo Nso. O gwakwara ha si: “Otu a, ka e si dee ya, na Kristi ahu ga-ata ahuhu sikwa n’onwu bilie n’ubochi nke ato. A ga-ekwusakwa ncheghari na mgbaghara njo ga n’aha ya site na Jerusalem ruo mba niile. Unu onwe unu bu ndi akaebe ihe ndi a niile.

EKPERE NHUNYE
Dinwenų, nabata onyinye anyi, ma nyekwa ndi niile natara ndu ohuru site na mmirichukwu nchekwa Gį. Anyi na-ario Gi ihe ndia site na Kristi Dinwenų anyi. Amen.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSỌ
Dinwenu, ka emume nke mgbaputa anyi nyere anyi aka na ndu nke uwaa, bia dubata anyi n’anurį nke ndụ ebighi ebi. Anyi na-ario Gi ihe ndia site na Kristi Dinwenu anyi. Amen.

error: Content is protected !!
Open chat
1
Catholic Lectionary
Hello 👋
How can I help you?