Igbo Mass Readings for Chrism Mass – March 28 2024 (Tọọzde)
Nke a bụ Igbo Mass Readings for Chrism Mass – March 28 2024 (Tọọzde)
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 61:1-3, 6, 8-9
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ onye amụma Aịzaya
Mmụọ nke Chineke adakwasala m, n’ihi na Osebụrụwa eteela m ude, o zigala m ka m wetara ndị a na-emegbu emegbu oziọma, ka m kasie ndị obi na-agbawa obi, ka m mee ka ndị eji eji nwere onwe ha, ka m megheere ndị nọ na mkpọrọ ụzọ.
Ka m kwupụta afọọma nke Chineke, nakwa ụbọchị Chukwu anyị ga-abọ ọbọ, ka m kasie ndị niile na-eru ụjụ obi; ka m nye ndị niile na-eru ụjụ na Zayọn onyinye ntunye ugo kama ntụ, mmanụ nke obi ụtọ karịa akwa mkpe, akwa emume karịa mmụọ dara mba; ka e wee kpọọ ha osisi ook nke agwa ọma; nke Yahweh kụrụ maka otito nke ya.
Ma aga-akpọ ụnụ ndị ụkọchukwu nke Yahweh, ndị mmadụ ga-ewere ụnụ dịka ndị odibo nke Chineke. Ụnụ ga-eri akụnụba nke mba niile, n’ụba ha ka ụnụ ga-añụrị.
N’ihi na mụ onwe m bụ Osebụrụwa na-ahụ ikpe nkwụmọtọ n’anya; akpọrọ m izu ohi na ihe ọjọọ asị; aga m akwụghachicha ha ụgwọ ha, ma mee ọgbụgbandụ dị ebeebe n’etiti m na ha.
A ga-amara agbụrụ ha na mba niile, mara ndị niile si n’etiti ha pụta n’ọgbọ mmadụ niile. Onye ọbụla hụrụ ha ga- ekwupụta na ha bụ ndị nke Chineke a gọziri agọzi.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 89:21-22, 25 27.
Azịza: Aga m eji ukwe kwupụta ịhụnaanya nke Onyenweanyị ebeebe-ebeebe.
1. Ahọrọla m nwodibo m bụ Devid,
eteela m ya mmanụ ka ọ bụrụ eze.
Aga m anọnyere ya oge niile,
enyemaka m ga-abụ ike ya. Azịza
2. Ịhụnaanya m na ịkwụdosiike m ga-anọyere ya oge niile,
aga m enye ya mmeri oge niile n’ihi aha m,
Ọ ga-ebeku m sị, “Ị bụ nna m,
Chineke m na onye enyemaka m. Azịza
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 1:5-8
Ihe Ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ Mkpughe
Amara na udo nke sitekwara na Jesu Kristi onye akaebe kwesịrị ntụkwasịobi, mkpụrụ mbụ nke ndị nwụrụ anwụ, onye ọchịchị ndịeze nke ụwa dịrị ụnụ.
Ọ hụrụ anyị n’anya, were ọbara ya sachapụ njọ anyị mekwaa anyị agbụrụ ndị ụkọchukwu nke Chineke ya na Nna ya. Otito na ike dịrị ya ebeebe-ebeebe. Amen. Lee, ọ na-abịa n’igwe ojii.
Mmadụ niile ga-ahụzu ya. Ndị ahụ mara ya ube ga-esokwa hụ ya. Agbụrụ niile nke ụwa ga-eti mkpu akwa n’ihi ya. N’eziokwu ọ ga-adị otu a. Amen. “A bụ m Isi mbido na Isi ngwụcha,” Ka Dinwenụ Chineke kwuru, onye dị adị, onye dịbu adị na onye ga-adịnụ, onye ji ike niile.
MBEKU – Is: 61:1
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
Mmụọ nke Chineke adakwasala m, o zigala m ka m wetara ndị a na-emegbu emegbu oziọma.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
OZIỌMA – 4:16-21.
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu bịaruru Nazaret ebe ọ nọrọ too; banye n’ụlọ nzukọ, n’ụbọchị izu ike dịka o si eme. O wee bilie ịgụ ihe; ha nyere ya akwụkwọ Aịzaya onye amụma.
O meghere akwụkwọ hụ ebe edere sị: “E nyela m Mmụọ nke Dinwenụ, maka na Dinwenụ eteela m ude ka mụ bugara ndị ogbenye Oziọma, ka m kwusaara ndị eji eji na ha enwerela onwe ha, ka m kwusaara ndị kpuru isi na ha ahụbala ụzọ, ka m mee ka ndị a na-emegbu-emegbu nwere onwe ha.
Ka m kwupụta afọ Amara nke Dinwenụ.” O kpuchiri akwụkwọ ahụ nyeghachi ya onye na-aga ozi, bịa nọdụ ala. Mmadụ niile nọ n’ụlọ nzukọ lekwasịrị ya anya. Ọ malite ịgwa ha okwu sị, “Taa, ka e mezuru na ntị ụnụ ihe e dere n’akwụkwọ nsọ a.”
Igbo Mass readings for March 29 2024, Ezi Fraịdee
Igbo Mass Readings for Chrism Mass – March 28 2024 (Tọọzde)