Igbo Mass Readings for January 9 2025, Tọọzde na-eso Ụka Epifani

Nke a bụ Igbo Mass Readings maka January 9 2025, Tọọzde na-eso Ụka Epifani.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:19-21. 5:1-4

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi mbụ nke Jọn

Anyị na-ahụ n’anya, n’ihi na o buuru ụzọ hụ anyị n’anya. Ọ bụrụ na onye ọbụla asị, “Ahụrụ m Chineke n’anya,” ma kpọọ nwanne ya asị, onye ahụ bụ onye ụgha.

N’ihi na onye ọbụla na-anaghị ahụ nwanne ya n’anya, bụ onye ọ na-ahụ oge niile, enweghị ike ịhụ Chineke n’anya, onye ọ na-ahụbeghị anya. Iwu nke a ka anyị natara n’aka ya: na onye ọbụla na-ahụ Chineke n’anya ga-ahụkwa nwanne ya n’anya.

Onye ọbụla nke kwere na Jesu bụ Kristi, bụ nwa nke Chukwu. Onye ọbụla nke na-ahụ Nna n’anya, na-ahụkwa Nwa ya n’anya. Otu a ka anyị si ama na anyị na-ahụ ụmụ Chineke n’anya: site n’ihu Chineke n’anya na site n’idobe iwu ya.

Nke a bụ ịhụnaanya Chineke, na anyị ga-edobe iwu ya. Iwu ya adịghịkwa arọ. Onye ọbụla a mụrụ site na Chineke na-emeri ụwa. Ma mmeri ahụ nke anyị ji emeri ụwa bụ okwukwe anyị.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 72:1-2, 14-15, 17.

Azịza: Onyenweanyị mba niile dị n’ụwa ga-esekpuru gị.

1. Nye eze ikpe nkwụmọtọ gị. O Chineke,

nyekwa nwa eze eziomume nke gị,

Ka o were nwee ike ịchị ndị nke gị n’ụzọ ziri ezi.

Nyekwa ndị ogbenye ikpe ziri ezi. Azịza

2. Ọ ga-esi na mmegbu na mmekpa ahụ zọpụta ndụ ha,

ndụ ha ga-adị oke ọnụ n’ihu ya.

Aga na ekpere ha ekpere mgbe niile,

na-agọzikwa ya ụbọchị niile. Azịza

3. Ngọzi dịrị aha ya ebeebe,

ka ọ dịgide dịka anyanwụ,

ka agbụrụ niile dị n’ụwa nweta ngọzi na ya,

ka mba niile kpọọ ya onye dị ngọzi. Azịza

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

Dinwenụ eteela m ude ka mụ bugara ndị ogbenye oziọma, ka m kwusaara ndị eji eji na ha enwerela onwe ha.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 4:14-22.

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Jesu lọghachiri na Galili n’ike nke Mmụọ Nsọ, akụkọ ya wee gbasaa n’obodo niile gbara ebe ahụ gburugburu. Ọ kụzikwara ihe n’ọtụtụ ụlọ nzukọ ndị Juu.

Mmadụ niile na-enye ya otito. Jesu bịaruru Nazaret ebe ọ nọrọ too; banye n’ụlọ nzukọ, n’ụbọchị izu ike dịka o si eme. O wee bilie ịgụ ihe, ha nyere ya akwụkwọ Aịzaya onye amụma.

O meghere akwụkwọ hụ ebe e dere sị:

“E nyela m Mmụọ nke Dinwenụ, maka na Dinwenụ Eteela m ude ka mụ bugara ndị ogbenye oziọma, ka M kwusaara ndị eji eji na ha enwerala onwe ha, ka m kwusaara ndị kpuru isi na ha ahụbala ụzọ, ka m mee ka ndị a na-emegbu-emegbu nwere onwe ha. Ka kwupụta afọ amara nke Dinwenụ.”

O kpuchiri akwụkwọ ahụ nyeghachi ya onye na-aga ozi, bịa nọdụ ala. Mmadụ niile nọ n’ụlọ nzukọ lekwasịrị ya anya. Ọ malite ịgwa ha okwu sị, “Taa, ka e mezuru na ntị ụnụ ihe e dere n’akwụkwọ nsọ a.”

Mmadụ niile kwuru okwu ọma banyere ya. Okwu ebube niile si n’ọnụ ya pụta tụkwara ha n’anya nke mere ha jiri jụọ sị, “Onye a, ọ bụghị nwa Josef?”

Igbo Mass readings for January 10 2025, Fraịde na-eso Ụka Epifani

Igbo Mass Readings for January 9 2025, Tọọzde na-eso Ụka Epifani.

Last Update: June 6, 2021