Igbo Mass Readings for February 27 2024, Tuzde Izuụka nke Abụọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi

Nke a bụ Igbo Mass Readings maka February 27 2024, Tuzde n’ime Izuụka nke Abụọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:10, 16-20

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Aịzaya

Ugbu a nụrụnụ okwu nke Yahweh, ụnụ ndị ọchịchị Sodom! Geenụ ntị na nkuzi nke Chineke anyị ụnụ ndị obodo Gomora! Sachanụ onwe ụnụ, meenụ onwe ụnụ ka ụnụ dị ọcha; Wepụnụ ajọ omume ụnụ n’ihu m, kwụsịnụ ime njọ.

Mụtanụ ka e si eme eziomume, na-achọkwanụ ikpe nkwụmọtọ; Kwụsịnụ mmegbu, chekwabanụ ụmụ ogbenye na-ekwuchiterenụ ụmụ nwanyị ajadu.

“Ugbu a bịazienụ ka anyị tụkọrịta uche,” Ọ bụ Osebụrụwa na-ekwu; “Ọ bụ ezie na njọ ụnụ na-acha ka uhie ma a ga-eme ka ọ dị ọcha ka akụ mmiriigwe, ọ bụ ezie na ọ na-acha ọbara, ma a ga-emekwa ka ọ dị ọcha ka owu ọcha.

Ọ bụrụ na ụnụ ekwere rubeisi, ụnụ ga-eri iheọma nke si n’ala ahụ, ma ọ bụrụ na ụnụ agbaa isi akwara, nọgide n’inupụ isi, ụnụ ga-anwụcha na mmagha; Otu a ka Yahweh si kwuo.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 50: 8-9, 16- 17, 21, 23.

Azịza: Aga m egosi nzọpụta nke Chineke n’ebe ndị eziomume nọ.

1. Ọ bụghị n’ihi aja ụnụ ka m ji wee na-abara ụnụ mba,

aja nsureọkụ ụnụ nọ n’ihu m oge niile;

agaghị m anabata oke ehi ọbụla nke si n’ụlọ ụnụ,

ma ọ bụ ewu ọbụla nke si n’ụlọ anụ ụnụ. Azịza

2. Kedụ ikikere ụnụ nwere iji na-agụgharị iwu m,

iji na-ekwupụta maka ọgbụgbandụ m?

N’ihi na ụnụ jụrụ ịnabata nkuzi m,

ma leghara okwu m anya. Azịza

3. Ụnụ na-eme nke a, chee na m ga-agba nkịtị?

Ụnụ chere na m dịka ụnụ?

Ugbu a aga m abara ụnụ mba,

aga m eme ka o doo ụnụ anya.

Onye ọbụla na-achụnyere m aja-ekele na-asọpụrụ m,

ma aga m egosi nzọpụta nke Chineke na ebe ndị eziomume nọ. Azịza

MBEKU – Ps. 51: 12,14.

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

Tinye n’ime m mmụọ ọhụrụ na nke siri ike, nyeghachikwa m añụrị nke nzọpụta gị.

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

OZIỌMA – 23:1-12

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.

Jesu gwara igwe mmadụ ahụ na ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii nọ n’ọkwa Mosis. Ya bụ, na-emenụ ma na-edebekwanụ ihe niile ha na-agwa ụnụ.

Kama ụnụ emekwala omume ka ha, n’ihi na ha na-ekwu ma ha anaghị emepụta ya n’omume. Ha na-eke ibu siri ike obubu bo ndị mmadụ n’ubu, ma ha onwe ha agaghị emetụ ya ọ bụladị otu mkpịsịaka.

Ha na-arụ ọrụ ọma ha niile naanị ka ndị mmadụ wee hụ ha. Ha na-eme ka akwa e dere iwu ndị dị mkpa nke ha na-amado n’ihu na n’aka dị obosara na-emekwa ka ọnụ uwe ha buo ibu.

Ọ na-amasị ha ịnọ n’oche dị elu n’oriri, ị nọ n’ihu oche n’ụlọ nzukọ, ị nara ekele n’ọma ahịa nakwa ka ndị mmadụ na-akpọ ha ndị nkuzi. Ụnụ ekwela ka a na-akpọ ụnụ ndị nkuzi, n’ihi na ụnụ nwere naanị otu onye nkuzi.

Ụnụ niile bụkwa ụmụnne. Ụnụ akpọla onye ọbụla nna ụnụ n’elu ụwa a, n’ihina ụnụ nwere otu nna nke bi n’eluigwe. Ụnụ ekwekwala ka a na-akpọ ụnụ nnaukwu n’ihina ụnụ nwere naanị otu nnaukwu Kristi.

Ya bụ, onye ọbụla kachasị n’etiti ụnụ ga-abụ odibo ụnụ. Onye ọbụla nke na-ebuli onwe ya elu a ga-ebuda ya ala, ma onye ọbụla nke wedara onwe ya ala, a ga-ebuli ya elu.

Igbo Mass Readings for February 28 2024, Wenezde Izuụka nke Abụọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.

Igbo Mass Readings for February 27 2024, Tuzde Izuụka nke Abụọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.

Last Update: September 4, 2021