Igbo Mass Readings for March 12 2024, Tuzde Izuụka nke Anọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi

Nke a bụ Igbo Mass Readings maka March 12 2024, Tuzde Izuụka nke Anọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 47:1-9, 12

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye amụma Izikel

Nwoke ahụ wee kpọghachikwa m azụ n’ọnụ ụzọ ụlọnsọ; ma lee, mmiri si n’okpuru ụlọnsọ ahụ agbapụta na-asọda ụzọ ọwụwa anyanwụ ụlọ ahụ (maka na ụlọnsọ ahụ chere ọwụwa anyanwụ ihu) mmiri si okpuru aka nri ụlọnsọ ahụ asọda na ndịda ebe nchụaja.

O sikwa n’ọnụụzọama nke dị na mgbago ugwu dupụta m, dugharịa m okirikiri n’ezi ruo na ọnụụzọama nke mpụta nke chere ihu n’ọwụwa anyanwụ ebe mmiri ahụ si na ndịda ugwu na-asọpụta.

Nwoke ahụ ji osisi ntụ ya tụpụta narị mita ise n’akụkụ ọwụwa anyanwụ mee ka m gafee ya. Mmiri ahụ ruru n’ikere ụkwụ m. Ọzọkwa, o kewapụtara narị mita ise duru m gafee ya, o rute m n’ikpere ụkwụ, o kewapụtakwa narị mita ise sikwa na mmiri ahụ dupụta m, mmiri ahụ wee rute m n’ụkwụ.

Ọzọkwa, o kewapụta narị mita ise, ọ bụzi nnukwu mmiri nke m enweghịkwa ike ịgafe n’ime ya n’ihina o ruola mmiri a ga-egwu egwu, enweghịkwa ike ịgafe na ya. Ọ bịa jụọ m sị: “Nwa nke mmadụ, ị hụla ihe ndị a?”

O sikwa n’ikpéré mmiri ahụ dughachi m azụ. Mgbe m na-alaghachi azụ, ahụrụ m ọtụtụ osisi n’akụkụ abụọ mmiri ahụ. Ọ gwa m sị, “Mmiri a si n’ọwụwa anyanwụ asọda na-agbada na Araba, mana mgbe ọ banyere na mmiri ahụ anaghị asọ asọ mmiri ahụ ga-agbanwe dị mma ọñụñụ.

Ebe ọbụla mmiri ahụ gara, ihe ọbụla e kere eke na-egwu mmiri dị na ya ga-adị ndụ, a ga-enwe ọtụtụ azụ maka na mmiri a na-abanye ebe ahụ ka mmiri osimiri dịkwa ọhụrụ, ya bụ na ihe ọbụla dị na ya ga-adị ndụ ebe ọbụla mmiri ahụ sọgara.

N’Akụkụ abụọ nke ikpere mmiri ahụ, ọtụtụ osisi dị iche-iche a na-eri eri ga-eto. Akwụkwọ ha agaghị akpọnwụ akpọnwụ, nke mkpụrụ ga-akọ ha n’elu; ma ha ga na-amị mkpụrụ ọhụrụ ọnwa ọbụla maka na mmiri ha ji eto si n’ebe dị nsọ agbapụta. A ga-eji mkpụrụ ha eme ihe oriri werekwa akwụkwọ ha agwọ ọrịa.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 46:2-3, 5-6, 8-9.

Azịza: Osebụrụwa nke igwe ndị agha nọnyeere anyị, Chineke nke Jekọb bụ ebe mgbaba anyị.

1. Chineke bụ ebe mgbaba anyị na ike anyị,

onye dị nkwadobe oge niile inyere anyị aka n’oge nsogbu.

Ya mere na anyị agaghị atụ egwu,

ọ bụladị na ụwa anọdụ n’ọgbaaghara,

ma ọ bụ elu ugwu niile atụgharịa daba n’ime osimiri. Azịza

2. E nwere otu iyi nke mmiri ya na-eweta añụrị n’obodo nke Chineke,

Ọ na-emekwa ka ebe obibi onye kacha elu dị asọ.

Chineke bi n’ime ya, ọ gaghị ada,

Chineke ga-enyere ya aka na chị obubo. Azịza

3. Osebụrụwa nke igwe ndị agha nọnyeere anyị,

Chineke nke Jekọb bụ ebe mgbaba anyị!

Bịa, tụgharịa uche n’ọrụ ebube nke Osebụrụwa,

ọrụ ịtụnaanya nke Ọ rụgoro n’ụwa. Azịza

MBEKU – Ps. 130:5,7.

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

Ana m eche Onyenweanyị, mkpụrụobi m na-eche ya, na nkwa ya ka m nwere nchekwube. N’ihina ịhụnaanya Onyenweanyị dị ọkpụ, n’ime ya ka nnukwu nzọpụta dị!.

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

OZIỌMA – 5:1-3,5-16.

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.

Mgbe ihe ndị a gachara, otu emume ndị Juu ruru, Jesu wee gaa Jerusalem. Otu ọdọmmiri nta nke nwere ụlọịba ise dị na Jerusalem. Ọdọmmiri ahụ dị n’akụkụ ọnụụzọ esi achịbata atụrụ.

A na-akpọ ọdọmmiri ahụ Betzada, n’asụsụ Hibru. N’ime ụlọịba ndị a ka igwe ndị ọrịa na-edina: ndị isi, ndị ngwọrọ, na ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ (na-eche mgbarụ mmiri.) Otu nwoke nọ n’ebe ahụ, onye nọ n’ọrịa kamgbe iri afọ atọ na asatọ.

Mgbe Jesu hụrụ ya ka o dina n’akwa ọ matara na ọ nọọla n’ọrịa ogolgo oge. Ọ sịrị ya, “Ị chọrọ ka m gwọọ gị?” Onye ọrịa ahụ zara sị, “Nnamukwu, enweghị m onye ga-atụba m n’ọdọmmiri mgbe a gbagharịrị ya.

N’ihi nke a, tupu m bịaruo oge ọbụla, onyeọzọ na-ebu m ụzọ aba na mmiri. Jesu gwara ya sị, “Bilie, were akwaute gị gaba.” Ngwa ngwa ahụ dịrị nwoke ahụ mma. O biliri chịrị akwaute ya gaba ije.

Ụbọchị ahụ bụ ụbọchị izu ike. Ndị Juu gwara nwoke ahụ a gwọrọ ọriịa sị, “Taa bụ ụbọchị izu ike, o megidere iwu gị iburu akwaute gị.” Ọ zara ha sị, Onye ahụ gwọrọ m gwara m sị: ‘Were akwaute gị gaba.””

Ha jụrụ ya sị, “Onye bụ onye ahụ sịrị gị ‘Were akwaute gị gaba?” Nwoke ahụ a gwọrọ ọrịa amataghị onye ọ bụ, n’ihina Jesu esila n’ebe ahụ pụọ maka na oke igwe mmadụ nọ n’ebe ahụ.

Mgbe ihe ndị a gachara, Jesu hụrụ nwoke ahụ n’ụlọnsọ wee gwa ya sị, “Lee, ahụ adịla gị mma. Emehiekwala ọzọ, ka ihe jọkarịrị njọ ghara ịdakwasa gị. Mgbe ahụ, nwoke ahụ pụrụ gwa ndị Juu na ọ bụ Jesu gwọrọ ya. N’ihi nke a, ndị Juu malitere isogbu Jesu, maka na ọ gwọrọ ọrịa n’ụbọchị izu ike.

Igbo Mass readings for March 13 2024, Wenezde n’ime Izuụka nke Anọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi

Igbo Mass Readings for March 12 2024, Tuzde Izuụka nke Anọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.

Last Update: November 2, 2021