Igbo Mass Readings for March 26 2024, Tuzde n’ime Izuụka dị Asọ

Nke a bụ Igbo Mass Readings for March 26 2024, Tuzde n’ime Izuụka dị Asọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 49:1-6

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye amụma Aịzaya

Geenụ m ntị, O, ala ndị dị n’akụkụ mmiri, ụnụ ndị bi ebe tere aka, geenụ ntị. Chineke họọrọ m site n’afọ nne m, ọ kpọrọ m aha tupu a mụọ m. O meela ọnụ m ọ dị nkọ ka mmaagha.

O zoro m n’okpuru aka ya; o mere m ka m bụrụ akụ a pịrị nke ọma; ọ na-echekwa m n’ime ọbọ ya. Ọ sịrị m “Ị bụ nwaodibo m, Izrel, onye m ga-esi na ya nweta otito.

Mana ekwuru m sị, ataala m ahụhụ lara n’iyi, emefuola m ike m n’ihe na-abaghị uru; mana ihe nketa m dị n’Osebụrụwa. Ụgwọ ọrụ m dị na Chineke.

Ma ugbu a Yahweh, onye kpụrụ m n’ime afọ nne m, ka m bụrụ nwodibo ya, ka m kpọghachiri ya Jekọb azụ, ka m chịkọtara ya Izrel, maka na-enwere m nsọpụrụ n’ihi ya, onye bụ ike m, kwuru sị,

“Ọ bụghị naanị na ị bụ nwodibo m ka I were kpọlite agbụrụ Jekọb kpọghachi ụmụ Izrel ndị fọdụrụ ụnụ; Aga m eme gị ihe nke mba niile ka nzọpụta were ruo na nsọtụ nke ụwa.”

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 71: 1-2,3-4, 5-6, 15,17.

Azịza: Aga m ekwe ukwe nzọpụta gị.

1. Na gị, Onyenweanyị ka m gbabara,

ekwela ka ihere mee m.

N’eziomume gị gbapụta m, zọpụta m,

gee m ntị ma zọpụta m! Azịza

2. Bụrụ okwute nke mgbaba m,

mgbidi aja nke ga-azọpụta m!

N’ihi na ị bụ okwute m, nchedo m.

Chineke m, zọpụta m n’aka ndị ajọ mmadụ. Azịza

3. N’ihi na sọ gị, Onyenweanyị bụ nchekwube m,

Onyenweanyị, echekwubere m na gị,

bido na mgbe m dị n’okorobịa,

Atụkwasara m gị obi bido na mgbe a mụrụ m,

Ị bụrịị oke nke m site n’afọ nne m. Azịza

4. Ọnụ m ga-ekwupụta eziomume na ike nke nzọpụta gị ụbọchị niile,

Aga m Chineke, abia na ike nke Onyenweanyi, O

Ị kuziiri m bido na nwata m,

aga m na-ekwupụta ọrụ ebube gị. Azịza

MBEKU

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

Ekele dịrị gị Eze anyị, onye rubeere Nna ya isi, Ọ naara ọnwụ ya n’elu obe dịka ezi nwatụrụ.

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

OZIỌMA – 13:21-33, 36-38.

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.

Ka Jesu na ndị na-eso ụzọ ya ka nọ na nri anyasị, mgbe O kwuchara ihe ndị a, O wutere ya n’obi. O wee kwupụta sị, “N’ịgwa ụnụ eziokwu, otu onye n’ime ụnụ ga-arara m nye.”

Ndị na-eso ụzọ ya lerịtara onwe ha anya, na-atụle onye n’ime ha ọ na-ekwu maka ya. Otu onye n’ime ndị na-eso ụzọ ya, onye Jesu hụrụ n’anya dabeere nso n’obi Jesu.

Nke a mere Saịmọn Pita ji kweere ya n’isi sị ya, “Jụọ ya onye ọ na-ekwu maka ya.” Ebe ọ dabere nso n’obi Jesu ọ jụrụ ya sị, “Onyenweanyị, onye ka ọ bụ?”

Jesu zara ya sị, “Ọ bụ onye ahụ m ga-esuru iberibe achịcha na mmanya nye.” Mgbe o suuru iberibe achịcha ahụ na mmanya, o nyere ya Judas nwa Saịmọn Iskarịọt.

Mgbe Judas richara iberibe achịcha ahụ, ekwensu banyere ya n’ime ya. Jesu asị ya, “Ihe ọbụla ị ga-eme, mee ya ọsịsọ.” Ọ dịghị onye ọbụla n’ime ndị so ha nọrọ n’oche nri matara ihe Jesu ji kwuo otu a.

Ebe ọ bụ na Judas bụ ojide ego, ụfọdụ chere na Jesu na-asị ya, “Zụta ihe ndị dị anyị mkpa maka emume a,” ma ọ bụ “Nye ogbenye ihe.” Mgbe Judas natachara iberibe achịcha ahụ, Ọ pụrụ ozigbo.

Ọchịchịrị agbaa. Mgbe Judas pụrụ, Jesu sịrị, “Ugbu a ka e nyere Nwa nke mmadụ otito. Enyekwara Chineke otito n’ime ya. Ọ bụrụ na e nye Chineke otito n’ime ya, Chineke ga-enyekwa ya otito n’ime onwe ya.

Ọ ga-enyekwa ya otito ahụ ngwa-ngwa. Ụmụntakịrị, Ọ fọdụrụ nwantịntị oge mụ na ụnụ ga-anọ. Ụnụ ga-achọ m, ma ihe m gwara ndị Juu ka m na-agwa ụnụ ugbu a. ‘Ebe m na-aga, ụnụ agaghị abịali ya.

Saịmọn Pita jụrụ ya sị, “Onyenweanyị olee ebe ị na-ala?” Jesu zara ya sị, “Ebe m na-ala, i nweghị ike iso m ugbu a. Ma ị ga-eso m ma e mechaa. Pita sịrị ya, “Onyenwe m gịnị mere na m apụghị iso gị ugbu a?

Aga m anwụ n’ihi gị.” Jesu zara ya sị, “Ị ga-anwụ n’ihi m? N’ịgwa gị eziokwu, tupu okeọkpa akwaa, ị ga-agọnahụ m ugboro atọ.

Igbo Mass readings for March 27 2024, Wenezde n’ime Izuụka dị Asọ

Igbo Mass Readings for March 26 2024, Tuzde n’ime Izuụka dị Asọ.

Last Update: November 7, 2021