Igbo Mass Readings for January 17 2023, Tuezde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 17 2023, Tuezde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 6:10-20

Ihe Ọgụgụ Ewetara N’akwụkwọozi E Degaara Ndị Hibru

Chineke abụghị onye na-emejọ mmadụ nke na ọ ga-eleghara ọrụ na ịhụnaanya ụnụ gosiri n’ihi ya site n’ịgara ndị dị nsọ ozi dịka ụnụ ka na-eme. Ọ na-agụ anyị agụụ ka onye ọbụla n’ime ụnụ na-egosi otu ịnụ ọkụ n’obi ahụ n’inwezu ihe niile ụnụ na-atụ anya ya mgbe niile n’uju.

Anyị na-achọ ka ụnụ ghara ịbụ ndị ike gwụrụ kama ka ụnụ bụrụ ndị na-eñomi ndị ahụ jiri okwukwe na ntachiobi mata ihe ahụ Chukwu kwere na nkwa.

Ebe ọ bụ na o nweghị onye karịrị Chineke ọ ga-eji ñụọ iyi mgbe o kwere Abraham nkwa, o jiri onwe ya ñụọ iyi, sị, “N’eziokwu, aga m agọzị gị mekwaa ka ị bawanye”. Abraham nwere ndidi, wee natakwa ihe Chukwu kwere ya na nkwa.

Ndị mmadụ na-eji ihe ka ha elu añụ iyi, ha na-ejikwa ịñụ iyi edozi esemokwu niile na-adị n’etiti mmadụ na ibe ya. Mgbe Chukwu chọrọ ime ka nzube ya na-adịghị agbanwe agbanwe wee ndị ahụ ga-eketa nkwa ahụ anya nke ọma, o jiri ịñụ iyi mee nke a.

Ka ọ ga-abụ site n’ihe abụọ na-enweghị mgbanwe, nke na-agaghị ekwe omume ịhụ Chineke dịka onye ụgha, anyị bụ ndị gbara ọsọ ndụ ga-enweta agbamume siri ike were jide nchekwube e dobeere anyị.

Anyị nwere nke a dịka ebe ndabere kwụdosiri ike nke obi anyị, olileanya na-abanye n’ime ime ebe nchụaja, ebe Jesu buuru anyị ụzọ gaa dịka onye nnọchite anya anyị. Ọ bụrụla nnukwu ụkọchukwu ebeebe n’usoro nke Melkizedek.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 111:1-2, 4-5, 9-10.

Azịza: Onyenweanyị anaghị echezọ ọgbụgbandụ ya.

1. Alleluịa, Eji m obi m niile enye Onyenweanyị ekele,

n’ọgbakọ ndị eziomume.

Ọrụ Onyenweanyị niile dị ịtụnaanya,

ndị niile ọ na-amasị kwesịrị ilekwasa ya anya. Azịza

2. Ọ na-ekwe ka anyị na-echeta ọrụ ebube ya.

Onyenweanyị dị ebere dị obiọma,

Ọ na-enye ndị na-atụrụ ya egwu nri,

ọ naghị echezo ọgbụgbandụ ya. Azịza

3. Ọ na-abịa ịgbapụta ndị nke ya ọsọọsọ,

na-enye ọgbụgbandụ ya otu mgbe,

aha ya dị nsọ,

kwesị na anyị ga-atụrụ ya egwu. Azịza

4. Ịtụ egwu nke Onyenweanyị nke a bụ mbido amamihe,

ha nwere uche ziri ezi bụ ndị na-eme ya.

A ga-ekwe ukwe otito ya ebeebe. Azịza.

MBEKU

Alleluia, Alleluia:

Nye m nghọta ka m wee mata iwu gị, wee nwee ike iji obi m niile dobe iwu gị.

Alleluia.

OZIỌMA – 2:23-28

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.

N’otu ụbọchị Sabat, Jesu na ndị na-eso ụzọ ya si n’ụzọ nta dị n’etiti ubi ọka na-agafe. Mgbe ha na-aga, ndị na-eso ụzọ ya malitere ịghọ ọka.

Ma ndị Farisii sịrị ya, “Lee anya! Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị ji eme ihe na-ezighi ezi n’iwu n’ụbọchị Sabat?”.

Ma ọ jụrụ ha sị, “Ọ bụ na ụnụ agụbeghị ihe Devid mere mgbe ọ nọ na mkpa, mgbe agụụ gụrụ ya na ndị ya na ha so: Ka o si banye n’ụlọnsọ Chineke, mgbe Abịata bụ onyeisi nchụaja, rie ogbe achịcha a na-eche n’ihu Chineke, nyekwa ndị ya na ha so, nke na-ezighi ezi n’iwu ka onye ọbụla rie, belusọ onyeisi nchụaja?”

Ọ gwara ha sị, “E dobere ụbọchị Sabat maka ọdịmma nke mmadụ; e meghị mmadụ n’ihi ụbọchị Sabat. Ya mere Nwa nke mmadụ bụ Onyenwe ọ bụladị ụbọchị Sabat”.

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for January 17 2023, Tuezde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 6, 2022