Igbo Mass Readings for January 16 2024, Tuzde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 16 2024, Tuzde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 16:1-13
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwụ mbụ nke Samuel
Yahweh wee sị Samuel “Olee mgbe ị ga-akwụsị iruru Sọl ụjụ ebe m jụrụla ya ịbụ eze ndị Izrel? Ya mere, ugbu a, were mmanụ jee Betlehem n’ụlọ otu nwoke a na-akpọ Jese n’ihina ahọrọla m otu n’ime ụmụ ya ndị nwoke ka ọ bụrụ eze.”
Samuel jụọ ya sị “olee otu m ga-esi eme nke a? Ọ bụrụ na Sọl anụ ya, ọ ga-egbu m. Yahweh sị ya, “Kpụrụ otu nwa ehi, Ọ bụrụkwa na onye ọbụla ajụọ gị, ị ga-asị ya na ị bịara n’ebe ahụ ịchụrụ Yahweh aja. Ziekwa Jese ka o soro bịa ịchụaja ahụ. Aga m agwakwa gị ihe ị ga-eme.
Onye ọbụla m họpụtaara gị ka ị ga-ete mmanụ.” Samuel mere ihe Yahweh kwuru, wee jee Betlehem. Ndị okenye obodo ahụ maara jijiji bịa izute ya. Ha jụrụ ya sị, “Udo ọ dịkwa nke a ị bịara, onye ọhụụzọ?”
Ọ zara ha, sị “udo dị, Abịara m ịchụrụ Yahweh aja. Ya mere, doonụ onwe ụnụ nsọ, soro m n’ịchụ aja nke a.” O wee doo Jese na ụmụ ya ndị nwoke nsọ, kpọọ ha ka ha bịa n’ịchụ aja ahụ.
Mgbe ha bịaruru, Samuel hụrụ Eliab, nwa Jese, chee n’obi ya, sị “Onye a guzo n’ebe a n’ihu Yahweh, ga-abụrịrị onye ahụ ọ họpụtara.” Ma Yahweh sịrị ya, “Elekwala anya na mma ya na n’ogologo ya.
Ajụla m ya, n’ihina anaghị m ahụ otu mmadụ si ahụ: Mmadụ na-ahụ elu ahụ, ma mụ onwe m na-ahụ ime mmụọ,” Jese wee kpọọ nwa ya bụ Abinadab, meekwa ka ọ gafee n’ihu Samuel.
Ma Samuel sịrị, “Yahweh ahọrọghị nke a,” Jese kpọpụtakwara nwa ya bụ Shama. Ma Samuel sịrị, “Mba! Yahweh ahọpụtaghị nke a. Jese kpọpụtara ụmụ ya ndị nwoke asaa gosi Samuel. Ma Samuel sị ya, “Mba! Yahweh ahọpụtaghị nke ọbụla n’ime ndị a.”
Ọ jụrụ Jese sị, “Ụmụ gị ndị nwoke niile agwụla ha? Jese azaa ya sị, “Ọ fọdụrụ nke ọdụdụ. Ma lee ọ gara ịzụ atụrụ.” Samuel sị ya, “Zie ozi ka a kpọọ ya. Anyị agaghị anọdụ ala iri ihe ruo mgbe ọ bịara.”
Jese wee zie ozi ka a kpọọ ya. Ọ bụ nwaokorobịa mara mma, na-acha ezigbo ọcha, nwere mkpụrụ anya mara mma. Yahweh gwa Samuel, “Nke a bụ onye ahụ. Bilie, tee ya mmanụ.”
Samuel were mmanụ ahụ wụkwasị Devid, n’ihu ụmụnne ya. Mmụọ nke Yahweh wee dakwasị Devid, nọnyekwara ya bido n’ụbọchị ahụ gaba. Samuel bilie, laa Rama.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 89:20, 21-22, 27-28
Azịza: Ahọrọla m nwaodibo m bụ Devid.
1. N’otu oge ị kwuru okwu n’ọhụ sị:
Ị gwara ndị nke gị sị:
Ekpunyela m otu onye dị ike n’agha okpueze.
Ebuliliela m ọkwa onye ahụ m họtara. Azịza.
2. Ahọrọla m nwaodibo m bụ Devid;
Eteela m ya mmanụ ka ọ bụrụ eze
Aga m anọnyere ya oge niile
Enyemaka m ga-abụ ike ya. Azịza
3. Ọ ga-ebeku m sị, “Ị bụ nna m,
Chineke m na onye enyemaka m.”
Aga m eme ya nwa mbụ m,
Bulie ya elu karịchaa eze niile dị n’ụwa. Azịza
MBEKU
Alleluia, Alleluia:
Nye m nghọta ka m wee mata iwu gị, wee nwee ike iji obi m niile dobe iwu gị.
Alleluia.
OZIỌMA – 2:23-28
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.
N’otu ụbọchị Sabat, Jesu na ndị na-eso ụzọ ya si n’ụzọ nta dị n’etiti ubi ọka na-agafe. Mgbe ha na-aga, ndị na-eso ụzọ ya malitere ịghọ ọka.
Ma ndị Farisii sịrị ya, “Lee anya! Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị ji eme ihe na-ezighi ezi n’iwu n’ụbọchị Sabat?”.
Ma ọ jụrụ ha sị, “Ọ bụ na ụnụ agụbeghị ihe Devid mere mgbe ọ nọ na mkpa, mgbe agụụ gụrụ ya na ndị ya na ha so: Ka o si banye n’ụlọnsọ Chineke, mgbe Abịata bụ onyeisi nchụaja, rie ogbe achịcha a na-eche n’ihu Chineke, nyekwa ndị ya na ha so, nke na-ezighi ezi n’iwu ka onye ọbụla rie, belusọ onyeisi nchụaja?”
Ọ gwara ha sị, “E dobere ụbọchị Sabat maka ọdịmma nke mmadụ; e meghị mmadụ n’ihi ụbọchị Sabat. Ya mere Nwa nke mmadụ bụ Onyenwe ọ bụladị ụbọchị Sabat”.
Igbo Mass Readings for January 17 2024, Ncheta Antoni Dị Asọ, Abbọt
Igbo Mass Readings for January 16 2024, Tuzde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.