Igbo Mass Readings for January 31 2023, Tuezde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 31 2023, Tuezde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 12:1-4
Ihe Ọgụgụ Ewetara N’akwụkwọozi E Degaara Ndị Hibru
Ya bụ, anyị nwere oke igwe ndị akaebe dị otu a ndị gbara anyị gburugburu. N’ihi nke a, ka anyị wepụ ihe ọbụla nke na-adọghachi anyị azụ dịka ibu arọ ya na njọ niile nọdebere anyị nso karịa.
Ka anyị werekwa ntachiobi ghaa ọsọ nke chere anyị n’ihu. Ka anyị na-elegide Jesu, onye mbụ na onye na-eme ka okwukwe anyị zuo oke anya, onye jiri n’hi añụrị e dobere n’ihu ya, die ahụhụ na ihe ihere nke obe bịa nọdụ n’aka nri nke ocheeze nke Chineke.
Tụleenụ n’obi ụmụ ghasara onye ahụ diri nkwụgide n’obe ọjọọ nke ndị njọ kwụgidere ya, ka ike ghara ịgwụ ụnụ mọbụ obi ụnụ ịda mba. Ọgụ ụnụ na-alụ megide njọ erubeghị nke ịwụfụ ọbara ụnụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps.: 22:26-27, 28, 30, 31-32.
Azịza: Ndị na-achọ Dinwenụ ga-eto ya.
1. Aga m emejupụta nkwa m kwere gị
n’ihu ndị niile na-atụrụ gị egwu
Ndị ogbenye ga-eriju afọ,
Ndị nile na-achọ Onyenweanyị ga-eto ya,
ka ha nwee ogologo ndụ. Azịza
2. Ụwa niile ga-echeta ihe ndị a,
wee laghachikwute Onyenweanyị
Ezinụụlọ niile dị n’ụwa
ga-akpọrọ ya isi ala.
Ndị niile na-enwe ọganihu n’ụwa
Ga-akpọrọ ya isiala
Otu aka ahụ, ndị niile nwụrụ anwụ. Azịza
3. Mkpụrụobi m ga-adị ndụ maka Onyenweanyị,
Ụmụ m niile ga-efe ya;
Ndị mmadụ ga-ekwupụta Onyenweanyị n’agbụrụ niile.
Ma ndị nke ga-abịa n’ihu;
ha ga-ekwupụta ịdị mma ya n’etiti ụmụ ndị a mụbeghị.
Ihe ndị a niile bụ ihe Onyenweanyị mere. Azịza
MBEKU – Ps. 119:18
Alleluia, Alleluia:
Meghee anya m, ka m wee hụ ihe ịtụnaanya dị n’iwu gị.
Alleluia.
OZIỌMA – 5:21-43
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.
Mgbe Jesu jiri ụgbọ gafee n’akụkụ nke ọzọ, oke igwe mmadụ zukọrọ n’ebe ọ nọ, ya onwe ya nọ n’akụkụ osimini. Mgbe ahụ, otu n’ime ndịisi ụlọnzukọ ndị Juu, aha ya bụ Jaịrus bịara. Ozigbo ọ hụrụ Jesu, ọ dara n’ụkwụ ya, rịọsie ya ike sị, “Nwa m nwaanyị nta nọ n’ọnụ ọnwụ; biko bịa bikwasa ya aka, ka ahụ dị ya mma ọzọ, ka ọ dịkwa ndụ”.
Jesu sobere ya, ma oke igwe mmadụ ahụ sogharịbara ma gbakwaa ya gburugburu. E nwere otu nwanyị nke nọ n’ọrịa oruru ọbara afọ iri na abụọ. Nwanyị a ataala ahụhụ n’aka ọtụtụ dibịa mefuchaa ihe niile o nwere; kama ahụ ga-adị ya mma, ya jọkarịa njọ.
Ọ nụla akụkọ banyere Jesu, wee zobe n’igwe mmadụ ahụ, si n’azụ metụ uwe Jesu aka, n’ihina o kwuru n’obi ya sị, “Ọ bụrụ na m metụ ọ bụladị ọnụ uwe ya aka, ahụ ga-adị m mma”. Ozigbo ahụ oruru ọbara ya kwụsịrị, o metụ ya n’ime ahụ na a gwọọla ya site n’ajọ ọrịa ahụ.
Ma mgbe Jesu matara na ike esila ya n’ahụ pụọ, ọ jụrụ sị, “Onye metụrụ uwe m aka?” Ma ndị na eso ụzọ ya jụghachiri ya sị, “Gịnị mere I ji ajụ ajụjụ dị otu a sị, “Onye metụrụ m aka, ebe ị hụrụ na igwe mmadụ ha otu a na-akpagide gị?”
Jesu legharịrị anya ka ọ hụ onye mere ihe ahụ. Ma nwaanyị ahụ ebe ọ matara ihe e mere n’ahụ ya, ọ tụrụ egwu marakwa jijiji bịa daa n’ihu Jesu, gwa ya eziokwu niile. Ma Jesu sịrị ya, “Ada, okwukwe gị azọọla gị; laa n’udo, si n’ajọ ọrịa gị nwee ahụ ike”.
Mgbe ọ ka kpụ okwu a n’ọnụ, ụfọdụ mmadụ siri n’ụlọ Jaịrus onyeisi ụlọnzukọ bịa, zie ya sị, “Nwa gị nwaanyị anwụọla. Oleekwa ihe I ji enye onyenkuzi a nsogbu?” Mana Jesu egeghị ntị n’ozi ha ziri, kama ọ sịrị onyeisi ụlọnzukọ ahụ, “Atụla egwu, kama kwere”.
O kweghị ka onye ọbụla soro ya gaa, beeresọ Pita, Jemis na nwanne ya bụ Jọn. Mgbe ha bịarutere n’ụlọ onyeisi ụlọnzukọ ahụ, ọ nụrụ ụzụ hụkwa ọtụtụ mmadụ ka ha nọ na-ebe akwa na-etikwa mkpu. Mgbe ọ batara, ọ jụrụ ndị mmadụ sị, “Gịnị mere ụnụ ji eti mkpu na-ebekwa akwa?
Nwantakịrị a anwụghị anwụ, kama ọ na-arahụ ụra”. Ha chịrị ya ọchị. Ọ chụpụrụ ha niile ezi kpọrọ nna nwatakịrị ahụ na nne ya, na ndị na-eso ụzọ ya banye n’ebe nwatakịrị ahụ nọ.
O jidere nwatakịrị ahụ n’aka sị, “Talita Kumi, nke pụtara “Nwaagbọghọ nta asị m gị kulie.” Ozigbo nwaagbọghọ nta ahụ bilitere, gagharịa, n’ihina ọ gbaala afọ iri na abụọ.
Ozigbo ahụ, ihe a merenụ bụụrụ ha nnukwu ihe ịtụnnanya. Ma Jesu nyesiri ha iwu ike ka ha ghara ime ka onye ọbụla mara nke a bịa gwakwa ha ka ha nye nwaagbọghọ nta ahụ ihe oriri.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.