Igbo Mass Readings for January 30 2024, Tuzde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 30 2024, Tuzde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 18:9-10, 14, 24-25, 30-19:3
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ abụọ nke Samuel
Na mberede, Absalọm zutere ụfọdụ n’ime ndịagha Devid. Ọ nọkwa n’elu ịnyịnya ya na-aga. Mgbe ọ na-agafe n’okpuru nnukwu osisi Ook, ntutuisi Absalọm tụhịkwara n’alaka osisi Ook ahụ. Absalọm ekoro n’elu, ịnyịnya ya agbafere.
Otu onye n’ime ndịagha Devid hụrụ ya, kọọrọ Joab sị, “Ahụrụ m Absalọm ka o kooro n’osisi Ook!” Joab gwara ya sị, “Mụ na gị agaghị anọ n’ebe a na-egbu oge.” O weere ube ọnụ atọ mawaa Absalọm obi mgbe ọ ka dị ndụ n’elu osisi Ook ahụ o kooro.
Devid nọ n’etiti ọnụ ụzọ ime na nke mpụta Jerusalem. Onyenche rigooro n’elu aja ọnụụzọ ama obodo ahụ, hụ otu nwoke na agbata ọsọ. Ọ kpọrọ eze gwa ya ihe ọ hụrụ. Eze asị ya, “Ọ bụrụ sọ naanị ya, o ji ozi ọma na-abịa.’
Onyeozi ahụ abịasie ike, rute nso. Eze sịrị ya, “Jee kwụrụ n’akụkụ.” O wee nọzụga, kwụrụ n’ebe ahụ. Onye Kush ahụ bụ odibo bịaruru sị eze Devid, “Ewetaara m onyenwe m eze oziọma!
Taa, Osebụrụwa enyela gị mmeri n’ebe ndị niile biliri imegide gị nọ!” Eze jụrụ ya sị, “Nwaokorobịa ahụ bụ Absalọm, ọ nọ ndụ?” Odibo ahụ zara sị, “Ka ndịiro onyenwe m eze, na ndi niile biliri imegide ya dịka nwaokorobịa ahụ!” O wutere eze nke ukwuu.
Ọ rịgoro n’ụlọ elu nke ọnụụzọ ama, nọrọ ebe ahụ kwaa akwa. Ka ọ na eje, ọ na-akwa akwa sị, “Nwa m Absalọm! Nwa m, nwa m Absalọm! Ọ ga-akara m nọọ mma a sị na m nwụrụ n’ọnọdụ gị. Absalọm, nwa m, nwa m!”
Joab nụrụ na eze Devid na-akwa akwa, na-eru ụjụ maka Absalọm. Ọñụ mmeri wee tụgharịa ghọọrọ ndịagha Devid niile iru ụjụ n’ụbọchị ahụ, maka na ha nụrụ na eze na-eru ụjụ n’ihi nwa ya. Ha jiri nwayọọ banye n’ime obodo dịka ndịagha ji ihere na-agbalaga n’agha.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 86:1-2, 3-4, 5-6
Azịza: Gee m ntị Onyenweanyị, zaa m
1. Gee m ntị Onyenweanyị, zaa m
n’ihina abụ m ogbenye na-enweghị enyemaka
Chekwaba ndụ m, n’ihina enwere m okwukwe na gị
zọpụta nwodibo gị onye tụkwasara obi na gị. Azịza
2. Ịbụ Chineke m meere m ebere, Onyenweanyi,
Ọ bụ gị ka m na-akpọku kwa ụbọchị niile
Mee ka mkpụrụobi nwodibo gị jupụta n’ọñụ, Onyenweanyị
n’ihina ọ bụ gị ka m na-akpọku n’ekpere m. Azịza
3. Onyenweanyị, Ị dị ebere dị mgbaghara,
i nwere nnukwu ịhụnaanya n’ebe ndị niile na-akpọku gị nọ.
Onyenweanyị nụrụ ekpere m,
Gee m ntị nụrụ arịrịọ m. Azịza.
MBEKU – Ps. 119:18
Alleluia, Alleluia:
Meghee anya m, ka m wee hụ ihe ịtụnaanya dị n’iwu gị.
Alleluia.
OZIỌMA – 5:21-43
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.
Mgbe Jesu jiri ụgbọ gafee n’akụkụ nke ọzọ, oke igwe mmadụ zukọrọ n’ebe ọ nọ, ya onwe ya nọ n’akụkụ osimini. Mgbe ahụ, otu n’ime ndịisi ụlọnzukọ ndị Juu, aha ya bụ Jaịrus bịara.
Ozigbo ọ hụrụ Jesu, ọ dara n’ụkwụ ya, rịọsie ya ike sị, “Nwa m nwaanyị nta nọ n’ọnụ ọnwụ; biko bịa bikwasa ya aka, ka ahụ dị ya mma ọzọ, ka ọ dịkwa ndụ”.
Jesu sobere ya, ma oke igwe mmadụ ahụ sogharịbara ma gbakwaa ya gburugburu. E nwere otu nwanyị nke nọ n’ọrịa oruru ọbara afọ iri na abụọ.
Nwanyị a ataala ahụhụ n’aka ọtụtụ dibịa mefuchaa ihe niile o nwere; kama ahụ ga-adị ya mma, ya jọkarịa njọ. Ọ nụla akụkọ banyere Jesu, wee zobe n’igwe mmadụ ahụ, si n’azụ metụ uwe Jesu aka, n’ihina o kwuru n’obi ya sị, “Ọ bụrụ na m metụ ọ bụladị ọnụ uwe ya aka, ahụ ga-adị m mma”.
Ozigbo ahụ oruru ọbara ya kwụsịrị, o metụ ya n’ime ahụ na a gwọọla ya site n’ajọ ọrịa ahụ. Ma mgbe Jesu matara na ike esila ya n’ahụ pụọ, ọ jụrụ sị, “Onye metụrụ uwe m aka?”
Ma ndị na eso ụzọ ya jụghachiri ya sị, “Gịnị mere I ji ajụ ajụjụ dị otu a sị, “Onye metụrụ m aka, ebe ị hụrụ na igwe mmadụ ha otu a na-akpagide gị?” Jesu legharịrị anya ka ọ hụ onye mere ihe ahụ. Ma nwaanyị ahụ ebe ọ matara ihe e mere n’ahụ ya, ọ tụrụ egwu marakwa jijiji bịa daa n’ihu Jesu, gwa ya eziokwu niile.
Ma Jesu sịrị ya, “Ada, okwukwe gị azọọla gị; laa n’udo, si n’ajọ ọrịa gị nwee ahụ ike”. Mgbe ọ ka kpụ okwu a n’ọnụ, ụfọdụ mmadụ siri n’ụlọ Jaịrus onyeisi ụlọnzukọ bịa, zie ya sị, “Nwa gị nwaanyị anwụọla.
Oleekwa ihe I ji enye onyenkuzi a nsogbu?” Mana Jesu egeghị ntị n’ozi ha ziri, kama ọ sịrị onyeisi ụlọnzukọ ahụ, “Atụla egwu, kama kwere”. O kweghị ka onye ọbụla soro ya gaa, beeresọ Pita, Jemis na nwanne ya bụ Jọn.
Mgbe ha bịarutere n’ụlọ onyeisi ụlọnzukọ ahụ, ọ nụrụ ụzụ hụkwa ọtụtụ mmadụ ka ha nọ na-ebe akwa na-etikwa mkpu. Mgbe ọ batara, ọ jụrụ ndị mmadụ sị, “Gịnị mere ụnụ ji eti mkpu na-ebekwa akwa? Nwantakịrị a anwụghị anwụ, kama ọ na-arahụ ụra”.
Ha chịrị ya ọchị. Ọ chụpụrụ ha niile ezi kpọrọ nna nwatakịrị ahụ na nne ya, na ndị na-eso ụzọ ya banye n’ebe nwatakịrị ahụ nọ. O jidere nwatakịrị ahụ n’aka sị, “Talita Kumi, nke pụtara “Nwaagbọghọ nta asị m gị kulie.”
Ozigbo nwaagbọghọ nta ahụ bilitere, gagharịa, n’ihina ọ gbaala afọ iri na abụọ. Ozigbo ahụ, ihe a merenụ bụụrụ ha nnukwu ihe ịtụnnanya. Ma Jesu nyesiri ha iwu ike ka ha ghara ime ka onye ọbụla mara nke a bịa gwakwa ha ka ha nye nwaagbọghọ nta ahụ ihe oriri.
Igbo Mass Readings for January 31 2024, Ncheta Jọn Bosco Dị Asọ, Ụkọchukwu
Igbo Mass Readings for January 30 2024, Tuezde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.