Igbo Mass Readings for May 23 2023, Tuezde n’ime Izuụka nke Asaa n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi
Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 23 2023, Tuezde n’ime Izuụka nke Asaa n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 20:17-27
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi
Pọl siri na Miletus ziga ozi n’Efesus ka ndị okenye nzukọ Kristi nọ ebe ahụ bịakwute ya. Mgbe ha bịaruru, ọ sịrị ha, “Ụnụ maara nke ọma otu m si nọọ n’etiti ụnụ ogologo oge a niile site n’ụbọchị mbụ m zọrọ ụkwụ n’ala Eshịa ruo taa.
Ụnụ hụrụ na-ejiri m obi umeala, na anya mmiri na-agara Onyenweanyị ozi, n’ime ọnwụnwa dị iche-iche dakwasịrị m, site n’ajọ izu niile nke ndị Juu gbara megide m.
Ụnụ hụrụ na-ahapụghị m ime ka ụnụ mara ihe ọbụla ga-abara ụnụ uru, mgbe ọbụla m na-akuziri ụnụ ihe n’ụlọ ma ọ bụ n’ihu ọha. Adọrọ m ma ndị Juu ma ndị mba ọzọ aka na ntị, ka ha chegharịa, bịakwute Chineke, ka ha kwerekwa na Onyenweanyị Jesu.
Ma ugbu a lee, ana m aga Jerusalem, site na mmanye nke Mmụọ Nsọ, amaghị m ihe ga-adakwasa m ebe ahụ. Naanị ihe m ma bụ na Mmụọ Nsọ na-agbara m ama, n’obodo ọbụla m ruru, na ịga mkpọrọ na mkpagbu chere m.
O nweghị ihe m ji ndụ m kpọrọ. Agụghịkwa m ya n’ihe oke ọnụ karịa ije ozi m, ka m gbazuo ọsọ m gazukwaa ozi nke m natara n’aka Onyenweanyị Jesu, nke bụ ịgba akaebe nye oziọma nke amara Chineke.
Ugbu a, lee, amatala m na ụnụ bụ ndị m gagharịrị n’etiti ha, na-ekwusa oziọma alaeze Chineke, agaghị ahụ m ọzọ. Ya bụ, n’ụbọchị taa ana m agba akaebe na aka m dị ọcha n’ebe ọbara ụnụ niile dị. N’ihina ahapụghị m ime ka ụnụ mara ndụmọdụ niile nke Chineke.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 68: 10-11, 20-21.
Azịza: Bụọrọnụ Chineke abụ, ụnụ alaeze nke ụwa.
1. Chineke i mere ka ngọzi gị na-erudata n’ala dịka mmiri ozuzo,
oge ndị nke gị dara mba i nyere ha ike;
Ndị ezinụụlọ gị chọtara ụlọ ebe obibi,
nke i wetara site n’afọọma gị maka ndị dị umeala. Azịza
2. Ngọzi dịrị Onyenweanyị n’ụbọchị niile,
Chineke onye na-azọpụta anyị, na-ebukwa ibu arọ anyị:
Chineke anyị a bụ Chineke na-azọpụta,
ọ bụ Onyenweanyị Chineke nwe ụzọ e si agbanarị ọnwụ. Azịza
MBEKU
ALLELUIA ALLELUIA:
Ọ bụrụ na ụnụ so Kristi bilie n’ọnwụ na-achọnụ ihe dị n’eluigwe ebe Kristi nọ n’aka nri nke Chukwu.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 17:1-11.
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.
Mgbe Jesu kwuchara ihe ndị a, o leliri anya n’eluigwe, sị, “Nna, oge eruola; nye nwa gị otito ka nwa gị wee nye gị otito. Ebe ọ bụ na i nyere ya ike n’ebe mmadụ niile nọ, ka o nye ndị niile i tinyere ya n’aka ndụ ebeebe.
Nke a bụ ndụ ebeebe ahụ: ka ha mara gị, onye naanị ya bụ ezi Chineke; marakwa Jesu Kristi onye nke i zitere. Enyela m gị otito n’elu ụwa, n’ihi na-arụzuola m ọrụ i nyere m ka m rụọ.
Ugbu a Nna m, nye m otito n’ihu gị, ụdị otito ahụ nke mụ na gị nwere tupu e kee ụwa. Emeela m ka ndị ahụ i siri n’ụwa kpọnye m mara onye ị bụ. Ha bụ ndị nke gị, i were nye m ha.
Ha dobekwara okwu gị. Ugbu a, ha amarala na ihe niile i nyere m si n’aka gị bịa. N’ihi na eziela m ha ozi i ziri m zie ha. Ha onwe ha naara ozi ahụ marakwa n’eziokwu na-esi m n’ebe ị nọ bịa.
Ha kwerekwaara na ọ bụ gị zitere m. Ana m ekpere ha ekpere. Ọ bụghị ụwa ka m na-ekpere ekpere. Kama ana m ekpe ekpere banyere ndị ahụ i nyere m, n’ihi na ha bụ ndị nke gị.
Ihe niile m nwere bụ nke gị; ihe niile i nwere bụkwa nke m. Aga m enwekwa otito n’ime ha. Ugbu a, anọghịkwa m n’ime ụwa, ha ka nọ n’ime ụwa, ma ana m alaghachikwute gị.
Ya bụ, Nna dị nsọ, dokwaa ha nke ọma site n’ike nke aha gị, bụ aha ahụ nke i nyere m, ka ha bụrụ otu dịka anyị onwe anyị si bụrụ otu.
Igbo Mass readings for May 24 2023, Wednezde n’ime Izuụka nke Asaa n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.