Igbo Mass Readings for February 21 2023, Tuezde n’ime Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 21 2023, Tuezde n’ime Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:1-11

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Sịrak

Nwa m, ọ bụrụ na ị na-achọ ka i fee Yahweh nke ọma, dị nkwadebe maka ọnwụnwa. Bụrụkwa onye obi ya dị ọcha, kwụrụ ọtọ, kwụsikwa ike, dịrị jụụ mgbe ọgbaaghara bịara. Makụọ Yahweh, a hapụkwala ya, ka i wee nwee ugwu n’isi njedebe nke ndụ gị.

Nabata ihe ọbụla nke ga adakwasị gị, were ndidi nara mgbanwoga nke nwere ike itinye gị n’ọnọdụ dị ala. Otu e si anwale ọlaedo n’ime ọkụ, otu ahụkwa ka e si anwale ezigbo mmadụ na mkparị.

Tụkwasị Yahweh obi, Ọ ga-enyere gị aka, mee ụzọ gị ka ha kwụrụ ọtọ, nchekwube gị bụrụ na ya. Ụnụ bụ ndị na-atụrụ Yahweh egwu, cherenụ ebere ya, ụnụ agbakụtala ya azụ, ka ụnụ ghara ịda.

Ụnụ bụ ndị na-atụrụ Yahweh egwu, tụkwasịnụ ya obi; n’ezie, ụnụ ga-anata ezi ụgwọ ọrụ ụnụ. Ụnụ bụ ndị na-atụrụ Yahweh egwu, leenụ anya iheọma, añụrị ebighịebi na ebere.

Chekwaanụ maka ndụdụgandụ gachara aga, o nweela onye tụkwasịrị Yahweh obi e tinyere n’ihere? Mọbụ onye kwụsiri ike n’ime egwu nke Yahweh Ọ gbakụtara azụ?

Mọbụ onye nke kpọkuru ya, O leghaara anya? Maka na Yahweh bụ onye obi ọma, bụrụkwa onye obiebere; Ọ na-agbaghara njọ, na-azọpụtakwa n’oge ahụhụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 37:3-4,18-19,27-28,39-40

Azịza: Tụkwasịobi gi n’Onyenweanyị, ọ ga-enyekwara gị aka.

1. Tụkwasịobi gị n’Onyenweanyị ma mebe mma

ka I wee biri na-ala ebe obibi gị ma nwee udo.

Nwebe añụrị n’ime Onyenweanyị

ka O wee nye gị ihe obi gị na-achọ. Azịza

2. Onyenweanyị na-echekwa ndụ ndị eziomume

ihe nketa ha ga-adịgide ebeebe.

Ha agaghị ata ahụhụ n’oge ihe siri ike,

n’oge oke agụụ, ha ga-enwe ihe oriri n’uju. Azịza

3. Zere njọ, ma mebe mma,

ka i wee nweta ụlọ dị ebeebe,

N’ihina Onyenweanyị hụrụ ihe ziri ezi n’anya.

Ọ naghị ahapụ ndị kwere na ya. Azịza

4. Nzọpụta nke ndị eziomume na-esi n’aka Onyenweanyị abịa,

Ọ na-echekwaba ha n’oge nsogbu;

Onyenweanyị na-enyere ha aka, na azọpụtakwa ha

Ọ na-azọpụta ha n’ihina ọ bụ onye nchedo ha. Azịza

MBEKU – James 1:18

Alleluia, Alleluia:

Site n’uche nke aka ya, o jiri okwu nke eziokwu ahụ mee ka anyị pụta iche. Meekwa ka anyị bụrụ ụdị mkpụrụ mbụ nke ihe o kere eke.

Alleluia.           

OZIỌMA – 9:30-37

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Jesu na ndị na-eso ụzọ ya esi n’elu ugwu ahụ rịdata. Ha si n’ebe ahụ pụọ, site n’obodo Galili gafee. Ma Jesu achọghị ka onye ọbụla mara ebe ọ nọ. N’ihina ọ na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya sị, “A ga-arara Nwa nke mmadụ nye n’aka ndị mmadụ.

Ha ga-egbu ya. Ma mgbe ha gbuchara ya ọ ga-ebili mgbe ụbọchị atọ gachara. Ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị isi okwu a. Ma egwu ekweghị ha ajụ ya ajụjụ. Ha bịaruru Kapanaum.

Mgbe Jesu banyere n’ime ụlọ, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya, sị, “Gịnị ka ụnụ na-ekwurịta n’ụzọ?” Ma ha gbara nkịtị, n’ihina ha na ekwurịta n’ụzọ banyere onye kacha ibe ya n’etiti ha.

Jesu nọdụrụ ala kpọọ mmadụ iri na abụọ ahụ. Ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na onye ọbụla na-achọ ka ọ bụrụ onye mbụ, ọ ga-edebe onwe ya ka onye ikpeazụ n’etiti ụnụ, ọ ga-abụkwa nwodibo ụnụ niile”.

O kuru otu nwatakịrị, guzobe ya n’etiti ha. O kukwaara ya ọzọ n’aka abụọ, gwa ndị na-eso ụzọ ya, sị, “Onye ọbụla nke nabatara otu n’ime ụmụntakịrị dị otu a n’aha m, mụ onwe m ka ọ nabatara, onye ọbụla nke nabatara m, ọ bụghị m ka ọ nabatara, kama ọ nabatara onye zitere m”.

Igbo Mass Readings for February 22 2023, Wednezde Ntụ

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for February 21 2023, Tuezde n’ime Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 8, 2022