Igbo Mass Readings for December 16 2025, Tuezde Izuụka nke Atọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.

Nke a bụ Igbo Mass Readings maka December 16 2025, Tuezde Izuụka nke Atọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:1-2, 9-13

Ihe Ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ Onye Amụma Zefanaya

Azị gbaa gị bụ onye nnupụisi rụkwara arụ, obodo mmegbu! Ọ naghị ege ntị n’olu ọbụla, nke ọ na-anabata ntụzi aka ọbụla.

Ọ naghị atụkwasa obi na Yahweh, nke ọ na-anọketa Chukwu ya nso. Aga m agbanwe okwu ndị mmadụ niile ka ọ bụrụ ihe dị ọcha ka ha niile wee na-akpọku aha nke Yahweh, ma werekwa otu obi fee ya.

Site n’ofe osimiri Etiopia ndị na-akpọku m, bụ ada ndị nke m gbasasịrị agbasasị, ga-ebute ihe onyinye m.

N’ụbọchị ahụ, agaghị emenye ụnụ ihere n’ihi omume ụnụ, nke ụnụ jiri nupụrụ m isi; n’ihi na aga m esite n’etiti ụnụ wezuga ndị na-añụrị ọñụ na mpako ha, ụnụ agaghị enwe  ọnụ ọjọọ n’ugwu nke m dị nsọ.

N’ihi na aga m ahapụ n’etiti ụnụ ndị dị nwayọọ ma dịkwa umeala n’obi. Ha ga-achọ nchedo n’aha nke Yahweh, bụ ndị a hapụrụ n’Izrel; ha agaghị emehie ma ọ bụ kwuo ụgha, nke a na-ahụ n’ọnụ ha ire nduhie. Ma ha ga-akpa nri zuokwa ike, o nweghị onye ga-emenye ha egwu.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 34:2-3. 6-7. 17-18. 19-23.

Azịza: OnyenweanOnyenweayị na-anụ mkpu akwa nwogbenye.

1. Aga m eto Onyenweanyị oge niile,

Otitio Ya ga-adị n’egbugbere ọnụ m mgbe ọbụla

Mkpụrụobi m na-egorị n’Onyenweanyị,

ka ndị umeala nụrụ ma ñụrịa.

Azịza: OnyenweanOnyenweayị na-anụ mkpu akwa nwogbenye.

2. Ihu ọbụla chere n’ebe Onyenweanyị nọ na-amụke amụke,

Ihere anaghị eme ya ma ọlị.

Onyenweanyị na-anụ mkpu akwa nwogbenye

Ọ na-enyekwara ya aka na nsogbu ya niile.

Azịza: OnyenweanOnyenweayị na-anụ mkpu akwa nwogbenye.

3. Mana Onyenweanyị na-agbarụ ihu n’ebe ndị ajọomume nọ,

Ọ na-eme ka a ghara ichetakwa ha n’ụwa.

Ndị eziomume kpọkuru Onyenweanyị, Ọ zara ha,

wee zọpụta ha na nsogbu ha niile.

Azịza: OnyenweanOnyenweayị na-anụ mkpu akwa nwogbenye.

4. Onyenweanyị na-anọ ndị obi loghara elogha nso,

na-enyere ndị dara mba na mmụọ aka.

Onyenweanyị na-azọpụta ndụ ndị odibo ya,

ndị niile gbabara na ya agaghị akwụ ụgwọ ọbụla.

Azịza: OnyenweanOnyenweayị na-anụ mkpu akwa nwogbenye.

MBEKU

ALLELUỊA ALLELUỊA:

Bịa O Onyenweanyị, atụfula oge, gbaghara njọ ndị nke gị.

ALLELUỊA.

OZIỌMA – 21:28-32

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.

Jesu gwara ndịisi nchụaja na ndị okenye ndị Juu sịọ: “Gịnị ka ụnụ chere maka otu nwoke mụtara ụmụ abụọ. Ọ gwara nke mbụ sị, “Nwa m gaa ọrụ n’ugbo vaịn m taa.

Ma ọ zara ya sị, “Agaghị m aga.” E mechaa o chegharịa gaa ọrụ ahụ. Nwoke ahụ gakwuru nwa ya nke abụọ gwakwa ya otu ihe ahụ, ma ọ zara ya sị, “Nna m aga m aga.” Mana ọ gaghị.

N’ime ụmụ abụọ ndị a olee nke mere uche nke nna ya? Jọn onye na-eme mmirichukwu bịara igosị ụnụ ụzọ eziomume. Ụnụ ekwenyeghị na ya ma ndị ọnaụtụ na ndị akwụna kwenyere na ya. Ọ bụladị mgbe ụnụ hụrụ nke a, ụnụ emechaghị chegharịa kwere na ya.”

Igbo Mass Readings for December 17 2025 – Wenezde

Igbo Mass Readings for December 16 2025, Tuezde Izuụka nke Atọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.