Igbo Mass Readings for Tuesday of 3rd Week of Easter

TUESDAY: IZU UKA NKE ATO N’OGE MBILITE N’ONWU KRISTI.

EKPERE MMEGHE
Nna, I megherela ndi iji mmiri na Mmuo nso muo alaeze nke eluigwe; mee ka onyinye nke ihunaanya Gi na-abawanye n’ime anyį. Mee ka ndi niile azoputagooro na njo site na mmirichukwu nweta ihe nke I kwere na nkwa. Site na Dinwenu anyi Jesu Kristi …

Ihe Ogugu nke mbu 7:51-8:3
Ihe ogugu ewetara n’Oru Ndiozi
Stivin gwara ndi mmadu, ndi okenye na ndi odeakwukwo si: “Unu ndi isi ike, ndi kpochiri obi ha na nti ha inu okwu Chineke, ndi na-aju inabata Mmuo Nso dika nna unu ha si mee. O nwere onye amuma obula nna unu ha emekpaghi ahu? Ha gburu ndi ahu buru uzo kwusaa okwu banyere obibia nke onye eziomume, onye unu raara nye ma gbuo ya.
Unu bu ndi natara iwu Chineke dika e nyere ya site n’aka ndi mmuooma ma unu edebeghi ya.” Mgbe ogbako ikpe ahu nuru ihe ndi a, iwe were ha nke ukwu n’ebe Stivin no ha wee taa ikikere eze, ma Stivin onye juputara n’ike nke Mmuo Nso lere anya n’eluigwe hu ebube nke Chineke. O si ha, “Lee! Ana m ahu ka e meghere eluigwe, na nwa nke mmadu ka o kwu n’aka nri nke Chineke. Ha weere oke olu tie mkpu, were aka kwuchie nti ha, were oso wakpo Stivin. Ha si n’obodo ahu kpuru ya, were okwute tugbuo ya. Ndi akaebe ugha, ndi gburu Stivin, wusara uwe ha n’ukwu otu nwaokorobia ana akpo Sol. Ka ha na-atugbu Stivin o kpere ekpere si, “Onyenweanyi Jesu nara mkpuru obi m! O gburu ikpere n’ala, werekwa oke olu tie mkpu si, “Onyenweanyi ekwekwala ka njo nke a di ha n’isi!” Mgbe o kwuchara nke a, o daa n’ala nwuo. Sol gbara mbo nke ukwu ime ka nzuko Kristi daa.

ABUOMA NA AZIZA: Ps: 31: 3-4, 6, 7, 8, 17, 21.
Aziza: N’aka gi Dinwenu ka m tinyere mmuo m.

  1. Buru nkume nke mgbaba m,
    ide nke ga-azoputa m!
    N’ihi na i bu nkume m, na ide m;
    n’ihi aha gi dube m, ma chekwaba m. Az./
  2. N’aka gi ka m tinyere mmuo m,
    I gbaputala m Oseburuwa, Chineke nke eziokwu.
    Atukwasiri mobi m na gi.
    Aga m awuli elu, nwee añuri n’ime ihunaanya gi. Az./
  3. Ka ihu gi chakwasi nwodibo gi,
    were ihunanya gi zoputa m.
    N’ihu gi ka I na-ezobe ha,
    Ka atumaatu ndi ajo omume ghara imetu ha. Az./

ALLELUIA ALLELUIA:
O buru na unu so Kristi bilie n’onwu na-achonu ihe di n’eluigwe ebe Kristi no n’aka nri nke Chukwu.
ALLELUIA.

OZIOMA: 6: 30-35.
Ihe ogugu ewetara n’Ozioma di aso nke Jon dere
Oke igwe mmadu ahu juru Jesu si, “Olee oru iri baama I ga aruru anyi, ka anyi hu, wee kwere na gi? Kedu oru ga aru? Nna anyi ha riri Mana n’ime ozara dika e dere ya si, ‘O nyere ha nri nke si n’eluigwe ka ha rie.” Jesu gwakwara ha si, “Ana m agwa unu eziokwu, o bughi Mosis nyere unu nri ahu nke si n’eluigwe, kama o bu Nna m na enye unu ezi nri ahu nke si n’eluigwe. N’ihi na nri nke Chineke bu nri nke ahu si n’eluigwe bia, na-enyekwa uwa ndu.” Nke a mere ha ji si ya, “Onyenweanyi, nye anyi udi nri a mgbe niile.” Jesu siri ha, “Abu m achicha nke ndu; onye na abiakwute m aguu agaghi agu ya, onye na ekwerekwa na m akpiri agaghi akpo ya nku.

EKPERE NHUNYE
Dinwenu, nara onyinye ndi a site n’aka Uka Gi. Mee ka nnukwu anuri nke I nyere anyi puta ìhè n’alaeze Gi. Anyi na-ario Gi ihe ndia site na Kristi Dinwenu anyį. Amen.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSO
Dinwenu, lekwasi ndi nke Gi anya ebere Gi; sitekwa n’ihe omimi nke Ista kpobata anyi n’ihe omimi nke mbilite n’onwu. Anyi na-ario Gi ihe ndja site na Kristi Dinwenu anyi. Amen.

error: Content is protected !!
Open chat
1
Catholic Lectionary
Hello 👋
How can I help you?