Igbo Mass Readings for January 24 2023, Tuezde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 24 2023, Tuezde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 10:1-10
Ihe Ọgụgụ Ewetara N’akwụkwọozi E Degaara Ndị Hibru
Otu ọ bụ na iwu nwere naanị onyinyo nke ezi ihe ndị ahụ ga-abịanụ, nke na-abụghị ezi ihe ndị ahụ n’onwe ha, o nweghị ike isite n’otu ụdị aja ahụ nke a na-achụ mgbe niile site n’afọ ruo n’afọ, mee ka ndị niile na-abịa ya nso zuo oke.
Ma ọ bụghị otu a, ọ bụ na a gabeghị akwụsị ịchụ aja ndị a? Ọ bụrụ na a wụchapụla njọ ndị na-efe ofufe na mbụ, uche ha agaghịkwa adị na njọ ọzọ. Aja ndị a na-echetara ndị mmadụ njọ ha kwa afọ. Ọ bụ ihe agaghị ekwe omume na ọbara oke ehi na ewu ga-asachapụ njọ.
N’ihi nke a, mgbe Kristi bịara n’ụwa o kwuru sị, “Ọ bụghị aja na onyinye ka ị chọrọ, kama ọ bụ ahụ ka ị kwadobeere m”. Aja nsureọkụ na aja mgbaghara njọ anaghị enye gị obi ụtọ.
Mgbe ahụ ka ma kwuru sị “Lee, abịara m ime uche gị, O Chukwu, dịka e dere banyere m n’akwụkwọ nsọ”. O kwuru na mbụ sị, “Aja onyinye, aja nsureọkụ na aja mgbaghara njọ adịghị amasị gị nke ha na-enye gị obi ụtọ”.
(A chụrụ aja ndị a dịka iwu si dị). O kwukwara sị, “Lee, abịara m ime uche gị”. Chineke emebiela aja mbụ iji malite nke abụọ.
Site n’ime ya bụ uche Chineke, e mere ka anyị dị ọcha site n’aja ahụ Jesu ji onwe ya wee chụọ naanị otu ugboro.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 40:1, 3, 6-7, 9-10.
Azịza: Anọ m ebe a, Dinwenụ; abịara m ime uche gị
1. Echere m, echere m Onyenweanyị,
O wee hulata gee m ntị, nụrụ akwa enyemaka m
na-ebe O tinyere ukwe ọhụrụ n’ọnụ m,
otito nke Chukwu anyị. Azịza
2. Ị naghị achọ ịchụ aja mọbụ ihe nrunye,
kama ntị ghe oghe.
Ị naghị achọ aja nsureọkụ mọbụ aja maka njo,
kama e kwuru m sị, “Anọ m ebe a, ana m abịa.” Azịza.
3. Ekwupụtala m eziomume nke Onyenweanyị
na nnukwu ọgbakọ
Lee, emechighị m ọnụ m,
ị maara nke a O Onyenweanyị. Azịza
4. O nwebeghị mgbe m jụrụ ikwupụta eziomume gị.
kama ekwupụtala m nkwụdosiike na enyemaka nzọpụta gị.
Ahapụbeghị m ikwupụta ịhụnaanya na nkwụdosiike gị
n’ihu nnukwu ọgbakọ. Azịza
MBEKU
Alleluia, Alleluia.
Ekwela ka ma soro ụzọ na-akwụghị ọtọ, ma nye m amara nke iwu gị.
Alleluia.
OZIỌMA – 3:31-35
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Nne Jesu na ụmụnne ya bịara guzoro n’ezi, zie ozi ka a kpọọ ya. Igwe mmadụ gbakwara ya gburugburu. Ụfọdụ n’ime ha gwara ya sị, “Nne gị na ụmụnne gị nọ n’ezi na-achọ gị”.
Ma ọ zara ha sị, “Onye bụ nne m na ụmụnne m? O lechara ndị gbara ya gburugburu anya sị, “Ndị a bụ nne m na ụmụnne m! Onye ọbụla na-eme uche Chineke bụ nwanne m nwoke, nwanne m nwaanyị na nne m”.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.