Igbo Mass Readings for January 23 2024, Tuzde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 23 2024, Tuzde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 6:12-15, 17-19
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ abụọ nke Samuel
A gwara Devid na Yahweh agọziela ezinụụlọ Obed-Edọm na ihe niile o nwere, n’ihi Igbe Ọgbụgbandụ ahụ. Ya mere, o jiri ọñụ si n’ụlọ Obed-Edọm bute ya na Jerusalem.
Mgbe ndị bu Igbe ahụ gara naanị nzọụkwụ isii, Devid chụọrọ Yahweh aja oke ehi na nke nwa chi gbara abụba. Devid ma uwe efọd n’ukwu ya, were ike ya niile tee egwu n’ihu Yahweh, iji sọpụrụ ya.
Otu a ka Devid na ndị Izrel niile siri were iti mkpu ọñụ na ịfụ opiike buteruo Igbe Ọgbụgbandụ ahụ na Jerusalem. Ha bubatara igbe ahụ, doba ya n’ọnọdụ ya, n’etiti Ụlọikwu nsọ ahụ nke Devid wuuru ya. Devid wee chụọrọ Yahweh aja nsureọkụ na aja udo.
Mgbe ọ chụchara aja ahụ nile, ọ gọziri ndị Izrel n’aha Osebụrụwa Chineke nke igwe ndịagha. O keesaara ndị Izrel niile ihe oriri.
O kenyere nwoke na nwaanyị ọbụla n’Izrel, otu ogbe achịcha, otu ọkpụrụkpụ anụ na otu mkpụrụ vaịn a mịkporo amịkpọ. Ha niile richara, laa n’ụlọ ha.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 24:7, 8, 9, 10.
Azịza: Onye bụ eze nke otito a? Ọ bụ Onyenweanyị.
1. Welitenụ isi ụnụ elu ọnụụzọ ama,
Kulienụ ọnụụzọ ọkpụ
Ka eze nke otito bata! Azịza
2. Onye bụ eze nke otito a?
ọ bụ Onyenweanyị, Dimkpa na dike,
onye bụ dike n’agha. Azịza
3. Welitenụ isi ụnụ elu ọnụụzọ ama,
Kulienụ ọnụụzụ ọkpụ
Ka eze nke otito bata! Azịza
4. Onye bụ eze nke otito a?
ọ bụ Chineke nke igwe ndịagha;
ọ bụ ya bụ eze nke otito! Azịza
MBEKU
Alleluia, Alleluia.
Ekwela ka ma soro ụzọ na-akwụghị ọtọ, ma nye m amara nke iwu gị.
Alleluia.
OZIỌMA – 3:31-35
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Nne Jesu na ụmụnne ya bịara guzoro n’ezi, zie ozi ka a kpọọ ya. Igwe mmadụ gbakwara ya gburugburu. Ụfọdụ n’ime ha gwara ya sị, “Nne gị na ụmụnne gị nọ n’ezi na-achọ gị”.
Ma ọ zara ha sị, “Onye bụ nne m na ụmụnne m? O lechara ndị gbara ya gburugburu anya sị, “Ndị a bụ nne m na ụmụnne m! Onye ọbụla na-eme uche Chineke bụ nwanne m nwoke, nwanne m nwaanyị na nne m”.
Igbo Mass Readings for January 24 2024, Wenezde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for January 23 2024, Tuzde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.