Igbo Mass Readings for September 3 2024, Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 3 2024, Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:10-16

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke Mbụ Pọl degaara ndị Kọrịnt

Ma Chineke ekpugheerela anyị ihe omimi ndị a site n’ike Mmụọ Nsọ ya. Mmụọ Nsọ ahụ n’onwe ya na-enyocha ihe niile, ọ bụladị ihe omimi niile dị na Chineke.

Onye mazuru ihe dị n’obi mmadụ karịa mmụọ onye ahụ nke dị n’ime ya? Otu aka ahụ, ọ dịghị onye mazuru echiche nke Chineke ma ọ bụghị mmụọ nke Chineke.

Ma anyị onwe anyị anataghị ụdị mmụọ nke na-achị ụmụ ụwa, kama mmụọ nke sitere na Chineke, ka anyị wee ghọta ihe niile Chineke nyere anyị site n’amara ya.

Anyị anaghị akuzi ihe ndị a site n’okwu nke sitere n’amamihe mmadụ kama site n’okwu nke Mmụọ Nsọ. Anyị na-akọwa ihe nke Mmụọ Nsọ n’ebe ndị nwere Mmụọ Nsọ nọ.

Ma onye enweghị Mmụọ Nsọ adịghị anabata onyinye amara nke mmụọ Chineke, n’ihina ha bụ ihe nzuzu n’anya ya. Ọ pụghịkwa ịghọta ha, n’ihina a na-esite n’ike nke Mmụọ Nsọ aghọta ha.

Ma onye ọbụla nke Mmụọ Nsọ na-achị nwere ike ikpebi uru ihe ọbụla bara, ma ọ dịghị onye ruru n’ọnọdụ inwe mkpebi gbasara ya.

Dịka Akwụkwọ Nsọ si kwu: Onye mazuuru ihe dị n’uche Onyenweanyị nke inye ya ndụmọdụ? Ma otu o siri dị, anyị onwe anyị nwere echiche nke dịka nke Kristi.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 145: 8-9, 10-11, 12-13, 13-14

Azịza: Onyenweanyị dị mma n’ụzọ ya niile.

1. Onyenweanyị bụ onye amara na onye obi ebere

ọ naghị ewe iwe ọsọọsọ o jupụtara n’ịhụnaanya

Onyenweanyị na-egosi mmadụ niile obiọma ya,

ebere nke Onyenweanyị na-erute ihe niile o kere. Azịza

2. Onyenweanyị, ihe niile i kere ga-ekele gị,

ndị kwere na gị ga-agọzi gị.

Ha ga-ekwupụta ebube nke alaeze gị

Ma kwupụtakwa ịdị ike gị. Azịza

3. Ka mmadụ niile mata ọrụ ịtụnaanya gị niile

na ebube dị elu nke alaeze gị

Alaeze gị ga-adị ebeebe

ọchịchị gị na-adị na ndụdụgandụ niile. Azịza

3. Onyenweanyị dị ntụkwasịobi n’okwu ya niile

omume ya niile jupụtara n’obi ebere

Onyenweanyị na-azọ ndị na-ada ada,

Ọ na-ekulite ndị a kụdara n’ala. Azịza

MBEKU – 2 Tim 1:10

Alleluia, Alleluia:

Dinwenụ anyị Jesu Kristi mebiri ọnwụ, wetara anyị ndụ, bịa mee ka anwụ anwụ pụta ihe site n’oziọma ahụ.

Alleluia.

OZIỌMA – 4:31-37

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Jesu gara Kapanaum, otu obodo dị na Galili, na-akụziri ha ihe n’ụbọchị izuike. Nkuzi ya tụrụ ha n’anya n’ihina o ji ikikere akụzi.

N’ime ụlọnzukọ ahụ, e nwere otu nwoke mmụọ ọjọọ ji, nke jiri oluike tie mkpu sị, “Haa, gịnị ka anyị na gị nwekọrọ Jesu onye Nazaret? Ị bịara ịla anyị n’iyi?

Ama m onye ị bụ, onye Nsọ ahụ nke Chineke.” Jesu gbọjara ya sị, “Kpuchie ọnụ gị, si n’ime ya pụta!” Mgbe Mmụọ ọjọọ ahụ tụdara ya n’ala n’etiti ọgbakọ ahụ, o siri n’ime ya pụta na emerụghị ya ahụ.

Ihe a tụrụ ọgbakọ ahụ niile n’anya nke mere na ha jụrịtara onwe ha sị, “Okwu gịnị bụ nke a? N’ihina O ji ikike na-enye ndị Mmụọ ọjọọ iwu, ha wee hapụ onye ha ji.” Akụkọ banyere ya gazuru obodo niile gbara Kapanaum gburugburu.

Igbo Mass Readings for September 4 2024, Wenezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume

Igbo Mass Readings for September 3 2024, Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 12, 2022