Igbo Mass Readings for September 19 2023, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 19 2023, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:1-13
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi mbụ Pọl degaara Timoti
Okwu a kwesịrị ntụkwasịobi: Ọ bụrụ na onye ọbụla na-achọ ịbanye n’ọnọdụ nke nnukwu ụkọchukwu, ọ bụ ọrụ kwesịrị nsọpụrụ ka ọ na achọ.
Nnukwu ụkọchukkwu ọbụla ga-abụ onye ndu ya n’enweghị ntụpọ ọbụla, di nke otu nwaanyị, onye anya doro, onye uche ya zuru oke, onye dị ebube n’anya, onye na-anabata ndị ọbịa na onye nwere ike ikuzi ihe nke ọma.
Ọ gaghị abụ onye na-añụbiga mmanya oke, onye na-ana mmadụ ihe ya n’ike, onye okwu na ụka, na onye hụrụ ego n’anya; kama ọ ga-abụ onye dị nwayọọ na-achọ udo.
Ọ ga-abụrịrị onye na-achị ezinụụlọ ya nkeọma, mee ka ụmụ ya jiri nrubeisi na nsọpụrụ nọdụ n’ebe niile. N’ihina ọ bụrụ na mmadụ amaghị otu ọ ga-esi achị ezinụụlọ ya, kedụ ka ọ ga-esi elekọta nzukọ Chineke anya nkeọma?
Ọ gaghị abụ onye a tọghatara ọhụrụ, ka ọnọdụ ya ghara ibu ya isi, nke ga-eme ka ọ daba n’ọmụma ikpe nke Ekwensu.
Ọzọkwa, ọ ga-abụrịrị onye mmadụ niile na-eche echiche ọma maka ya, ka ọ ghara ịdaba n’ọnya Ekwensu na n’ihe ịtaụta.
Otu aka ahụ, ndị Dikin ga-ehi aka n’anya ghara ị bụ ndị ireabụọ, ndị na-anaghị añụbiga mmanya oke na ndị na-ejighị anyaukwu na-achọ oke uru.
Ha ga-abụrịrị ndị weere ezi akọnuuche jide ihe omimi niile nke dị n’okwukwe anyị. Ka e burukwa ụzọ nwalee ha, ọ bụrụ na e nweghị ebubo ọbụla chie ha dikin, maka ịgba odibo.
N’otu aka ahụ, ndị nwaanyị ga-ehikwa aka n’anya, ha agaghị abụ ndị na-agba asịrị, kama anya ga-edo ha, ha ekwesịkwa ntụkwasịobi n’ihe niile. Ka onye dikin ọbụla bụrụ di otu nwaanyị, na-achị ụmụ ya na ezinụụlọ ya nkeọma.
N’ihina ndị ọbụla rụrụ ọrụ ha nkeọma dịka ndị dikin na-enwetara onwe ha ezigbo ọkwa, na nnukwu ntụkwasịobi n’okwukwe ahụ nke dị n’ime Jesu Kristi.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 101: 1-2, 2-3, 5, 6
Azịza: Agam ebi ndụ n’enweghị ntụpọ
1. Aga m abụ abụ maka nkwụdosiike
nke ịhụnaanya na ikpe nkwụmọtọ gị
Gị ka m ga-abụrụ ya O Onyenwe m
Aga m agba mbọ ka m bie ndụ n’enweghị ntụpọ,
Olee mgbe Ị ga-abịakwute m? Azịza
2. Aga m eji obi dị ọcha biri n’ụlọ m;
Anya m agaghị aga n’ebe ihe ọjọọ dị
Akpọrọ m agwa ndị niile enweghị asị
Mụ na ha agaghị enwe mmekọ ma ọlị. Azịza
3. Onye ọbụla ji mmadụ ibe ya agba asịrị,
Aga m egbu ya
Agaghị m edi agwa ndị mpako na ndị nganga ma ọlị. Azịza
4. Aga m egosị ndị niile kwesịrị ntụkwasịobi n’ala ahụ afọma
Mụ na ha ga-ebi
Naanị ndị ụzọ ha kwụ ọtọ ga agbara m odibo. Azịza
MBEKU – Jọn 6:64, 69
Alleluia, Alleluia:
Dinwenụ, okwu gị bụ mmụọ bụrụkwa ndụ, Ọ bụ gịnwa ji okwu nke ndụ ebeebe.
Alleluia
OZIỌMA – 7:11-17
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Ka nwa oge gachara, Jesu gara n’otu obodo a na-akpọ Nain; ndị na-eso ụzọ ya na igwe mmadụ sokwa ya. Ma ka ọ na-abịaru n’ọnụụzọ ama nke obodo ahụ, e nwere otu nwoke nwụrụlarịị nke a na-ebupụ, otu nwa nke nne ya mụrụ, nne ya ahụ bụ nwaanyị ajadu, oke igwe mmadụ si n’obodo ahụ sonyekwara nwaanyị ahụ.
Mgbe Onyenweanyị hụrụ ya, O meere ya ebere wee sị ya, “Ebela akwa.” Ya bịaruo nso metụ igbe ozu ahụ aka, ndị bu ozu ahụ wee guzo; Jesu wee sị, “Nwaokorobịa!
Ana m asị gị bilie!” Nwaokorobịa ahụ nwụrụ anwụ nọlitere, ma bidokwa ikwu okwu; Jesu kpọọrọ ya nye nne ya.
Ụjọ jidere ha niile; nke mere ha ji too Chineke na-asị, “Nnukwu onye amụma ebilitela n’etiti anyị. Ọzọ, Chineke abịala ileta ndị nke ya!” Akụkọ a gbasara Jesu gazuru n’ala Judia na obodo niile gbara ya gburugburu.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.