Igbo Mass Readings for October 10 2023, Tuezde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 10 2023, Tuezde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:1-10

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Jona

Okwu nke Yahweh bịakwutere Jona nke ugboro abụọ. Ọ sịrị, “Kulite, gaa na Ninive, obodo ukwu ahụ, gwa ha okwu m ga-agwa gị.” Jona biliri gaa Ninive n’irubeisi n’okwu nke Chineke.

Ninive bụ nnukwu obodo, ọ na-ewe mkpụrụ ụbọchị atọ iji gafe uhie ya. Jona jiri otu ụbọchị gagharịa n’ime obodo ahụ na-ekwu na-asị: “Ọ fọdụrụ naanị iri ụbọchị anọ ka e mebie Ninive.”

Ndị obodo Ninive bịara kwenye na Chineke, wee tie iwu na onye ọbụla ga-ebu ọnụ, yiri akwa iru ụjụ, bido n’onyeukwu ruo n’onyenta ha. Mgbe akụkọ a rutere onyeeze nke Ninive, o siri n’ocheeze nke ya bilie, yipụ efe eze ya, bịa chịrị akwa iru ụjụ yiri, nọdụkwa ọdụ na ntụ.

O mere ka e kwupụta ya n’obodo Ninive niile site n’iwu ya na ndịisi ọchịchị ya tiri sị, “O nweghị mmadụ mọbụ anụmaanụ ọbụla a na-azụ ga-eri ihe ọbụla. Ka mmadụ niile yiri akwa iru ụjụ wee kpọkuo Chineke n’ike ha niile.

Ka onye ọbụla hapụ ụzọ ọjọọ ya niile nakwa mkpagbu ya niile. Onye maara ma Chineke ọ ga-agbanwe obi ya, hapụ iwe ya dị ọkụ, ka anyị ghara ịla n’iyi. Mgbe Chineke hụrụ mkpebi ha, otu ha siri chegharịa na mmehie ha niile, Ọ gbanwere obi ya wee hapụ ịta ha ahụhụ ahụ ọ chọburu ịta ha.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 130: 1-2, 3-4, 7-8

Azịza: Ọ bụrụ na gị, O Onyenweanyị na-agụ ajọomume anyị ọnụ onye ga-eguzo.

1. N’ugbu mmiri ka m na-akpọku gị, Onyenweanyị

Onyenweanyị nụrụ akwa enyemaka m na-ebe

che ntị n’arịrịọ m na-arịọ. Azịza

2. Ọ bụrụ na gị, O Onyenweanyị,

na-agụ ajọomume anyị ọnụ,

Onyenweanyị, onye ga-eguzo.

Mana ị na-agbaghara anyị,

n’ihi nke a anyị na-asọpụrụ gị. Aziza

3. Izrel nwee nchekwube n’Onyenweanyị!

N’ihina ịhụnaanya Onyenweanyị dị ọkpụ

n’ime ya ka nnukuwu nzọpụta dị!

Ọ ga-azọpụta Izrel na njọ ya niile. Azịza

MBEKU – Ps. 119: 105

Alleluịa, Alleluịa:

Okwu gị bụ mpanaka na-edu m, bụrụkwa ihe n’ụzọ m.

Alleluịa.

OZIỌMA – 10:38-42

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Jesu banyere n’otu ọnụmara, ebe otu nwaanyị a na-akpọ Mata nabatara ya n’ụlọ ya. Mata nwere nwanne nwaanyị a na-akpọ Meri onye nọdụrụ ala n’ụkwụ Onyenweanyị na-anụrụ nkụzi ya.

Ma uche Mata gbasachara agbasa ebe ọ na-agba mbọ maka ile ọbịa. Mata bịakwutere Jesu sị, “Onyenweanyị, ọ bụ na o metụghị gi n’obi na nwanne m nwaanyị hapụụrụ naanị m ije ozi niile?

Gwanụ ya ka ọ bịa nyere m aka.” Ma Onyenweanyị zara ya sị, Mata, Mata, ị na-echegbu onwe gị, na-esogbukwa onwe gị n’ihi ọtụtụ ihe; ma otu ihe bụ ihe dị mkpa. Meri ahọrọla oke ka mma nke a na-agaghị anapụya.”

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for October 10 2023, Tuezde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: October 15, 2022