Igbo Mass Readings for October 8 2024, Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 8 2024, Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:13-24

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl degaara ndị Galeshịa

Ụnụ anụla maka ndụ ochie m n’usoro okpukpe ndị Juu na otu m si sogbuo Nzukọ Chineke, ma gbakwaa mbọ imebi ya.

Agara m n’ihu n’usoro okpukpe ndị Juu karịa ọtụtụ ndị ọgbọ m n’etiti ndị nke m, omenaala nna anyị ha nụkwara m ọkụ n’obi karịa.

Ma mgbe ọ masịrị onye ahụ họpụtara m iche tupu a mụọ m, ọ kpọkwara m site n’amara ya.

Ọ masịrị ya ikpughere m Nwa ya, ka m wee kwusaa maka ya n’etiti ndị mba ọzọ. O nweghị onye ọbụla m jekwuuru maka ndụmọdụ, nke m na-aga Jerusalem ịgakwuru ndị buru m ụzọ bụrụ ụmụazụ kama agara m Arabịa, e mechaa m laghachi Damaskọs.

Ka afọ atọ gachara agara m Jerusalem ịhụ Pịta (nke pụtara Sefas ma a sụgharịa ya) ịjụta ya ihe ụfọdụ.

Anọnyekwaara m ya ụbọchị iri na ise. Ọ dịghị onyeọzọ n’ime ndị ụmụazụ m hụrụ ma ọ bụghị naanị Jemis nwanne Dinwenụ.

(Ihe m na-edere ụnụ bụ eziokwu n’ihu Chineke anaghị m atụ asị) Ka nke a gachara, agara m n’ọtụtụ akụkụ Siria na Silisia.

N’oge ahụ nzukọ Kristi niile dị na Judịa amatabeghị onye m bụ. Naanị ihe ha nụrụ a na-ekwu bụ, “Onye ahụ kapgburu anyị na mbụ na-ekwusazi ugbu a okwukwe ahụ ọ chọrọ imebi na mbụ.” Ha wee too Chineke n’ihi m.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 139:1-3, 13-14, 14-15.

Azịza:  Onyenweanyị dube m n’ụzọ nke ndụ ebighịebi.

1. Onyenweanyị ị nyochaala m marakwa m!

Ị ma mgbe m nọdụrụ ala ma mgbe m kwụ ọtọ

Ị na-anọ ebe dị anya mara ihe m bu n’uche

Ị mazuru omume m niile mgbe m

Na-arụ ọrụ mọbụ mgbe m na-ezu ike. Azịza.

2. Ọ bụ gị kere mmụọ m

Ọ bụkwa gị kpụrụ m n’afọ nne m

Ana m ekele gị maka ihe omimi ndị a

maka ihe ịtụnanya dị n’okike I kere m

nakwa ihe ebube dị n’aka ọrụ gị niile. Aziza.

3. Ị maara m nke ọma!

Ị maara otu ọkpụkpụ niile siri dị

oge a na-akpụ m na nzuzo

oge a na-ejikọta m ọnụ n’afọ nne m. Azịza.

MBEKU – Ps. 119: 105

Alleluịa, Alleluịa:

Okwu gị bụ mpanaka na-edu m, bụrụkwa ihe n’ụzọ m.

Alleluịa.

OZIỌMA – 10:38-42

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Jesu banyere n’otu ọnụmara, ebe otu nwaanyị a na-akpọ Mata nabatara ya n’ụlọ ya. Mata nwere nwanne nwaanyị a na-akpọ Meri onye nọdụrụ ala n’ụkwụ Onyenweanyị na-anụrụ nkụzi ya.

Ma uche Mata gbasachara agbasa ebe ọ na-agba mbọ maka ile ọbịa. Mata bịakwutere Jesu sị, “Onyenweanyị, ọ bụ na o metụghị gi n’obi na nwanne m nwaanyị hapụụrụ naanị m ije ozi niile?

Gwanụ ya ka ọ bịa nyere m aka.” Ma Onyenweanyị zara ya sị, Mata, Mata, ị na-echegbu onwe gị, na-esogbukwa onwe gị n’ihi ọtụtụ ihe; ma otu ihe bụ ihe dị mkpa. Meri ahọrọla oke ka mma nke a na-agaghị anapụya.”

Igbo Mass Readings for October 9 2024, Wenezde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume

Igbo Mass Readings for October 8 2024, Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: October 22, 2020