Igbo Mass Readings for October 17 2023, Tuezde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 17 2023, Tuezde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1: 16-25

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom

Ihere oziọma ahụ adịghị eme m, n’ihina ọ bụ ike nzọpụta nke Chineke n’ebe ndị nwere okwukwe nọ, malite na ndị Juu wee ruo na ndị Grik. N’ime ya ka e kpughere eziomume nke Chineke site n’okwukwe na maka okwukwe.

Otu a ka e si dee ya n’Akwụkwọ Nsọ sị, “Onye eziomume ga-adị ndụ site n’okwukwe. E kpughere iwe Chineke site n’eluigwe megide omume asọpụrụghị Chineke na ajọomume niile nke ụmụ mmadụ, ndị na-ewere ajọomume ha na-ekpuchi eziokwu.

Chineke na-enye ha ahụhụ n’ihina e mere ka ihe niile ha kwesịrị ịma banyere Chineke pụta ihe. Chukwu n’onwe ya mere ka o wee ha anya. Site n’okike ụwa, Chineke emeela ka ike ya dị ebeebe n’ụdị Chi ọ bụ nke e zoro ezo, pụta ihe n’ebe ụmụ mmadụ nọ.

Ụmụ mmadụ na-ahụcha ihe ndị a nke ọma site n’ihe niile Chineke keere eke. Ya mere na ha enweghị ngọpụ! Ha ma na Chineke dị, ma ha adịghị asọpụrụ ya dịka Chineke. Ha adịghịkwa ekele ya.

Kama echiche ha jupụtara n’ihe efu; ọchịchịrị gbachikwara n’obi ha nke na-enweghị nghọta. Ha na-ekwu na ha maara ihe, ma ha bụ ndị nzuzu. Kama ha ga-efe Chineke na-adịghị anwụanwụ, ha na-efe arụsị a tụrụ n’oyiyi mmadụ nke pụrụ ịnwụ anwụ, n’oyiyi nnụnụ, n’oyiyi anụmanụ, mọbụ n’oyiyi anụ na-akpụ akpụ.

N’ihi nke a ka Chineke jiri hapụ ha ka ha mere onwe ha otu dị ha mma n’ime adịghị ọcha na ajọomume niile nke na-agụ mkpụrụ obi ha agụụ. Ha jikwa ahụ ha emerịta mpụ n’etiti onwe ha.

Ha ewerela okwu ụgha dochie n’ọnọdụ eziokwu banyere Chineke. Ha na-asọpụrụ, na-efekwa ihe e kere eke, ma hapụ Chukwu kere ha, onye dị ngọzi ebighịebi. Amen.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 19:2-3, 4-5

Azịza: Eluigwe na-ekwupụta ebube Chineke.

1. Eluigwe na-ekwupụta ebube Chineke

Ihe niile dị na mbara Eluigwe na-ekwupụta ọrụ aka ya,

Ụbọchị niile na-ekwupụta ya

Abalị ọbụla na-egosipụta amamihe nke Chineke. Azịza

2. Ha anaghị ekwu okwu

nke ha na-eme ụzụ nke mmadụ ga-anụ

Mana olu ha na-agazu ụwa niile.

Ozi ha na-eru nsọtụ ụwa niile. Azịza

MBEKU – Ps. 27: 11

Alleluịa, Alleluịa:

Kuziere m ụzọ gị O Dinwenụ, dube m n’ụzọ kwụ ọtọ.

Alleluịa.

OZIỌMA – 11:37-41

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Ka Jesu na-ekwu okwu, otu onye Farisii kpọrọ ya oku oriri. Ọ banyere, nọrọ n’oche nri. Ọ gbagwojuru onye Farisii ahụ anya ịhụ na Jesu ebughị ụzọ kwọọ aka ya tupu o ribe ihe. 

Ma Dinwenụ sịrị ya, “Ụnụ ndị Farisii na-asacha azụ iko na azụ efere, ma n’ime ya, ụnụ jupụtara n’anyaukwu na obiọjọọ.  

Ụnụ ndị nzuzu! Ọ bụ na ọ bụghị onye ahụ mere azụ iko mekwara ime ya? Kama werenụ ihe ndị ahụ dị n’ime rụọ ọrụ ebere, ihe niile ga-adịkwara ụnụ ọcha.”

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for October 17 2023, Tuezde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: October 16, 2022