Igbo Mass Readings for September 23 2025, Tuezde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 23 2025, Tuezde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 6:7-8, 12, 14-20
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Ezra
Eze Darius wee nye ndị ọchịchị obodo dị n’ofe osimiri Yufretes iwu sị: Wepụnụ anya ụnụ kpamkpam n’ọrụrụ ụlọ Chineke a. Ka onyeọchịchị ndị Juu na ndị okenye ha rụgharịa ụlọ a n’ebe ọ dịbu.
Ọzọ, ana m enye ụnụ iwu gbasara ihe ụnụ ga-emeere ndị okenye ndị Juu ndị a maka nrụgharị ụlọ nke Chineke a, nke ga-esi n’ego akpa eze a kpatara site n’ụtụ nrubeisi obodo ndị dị n’ofe osimiri Yufretes kwụzuchaa ndị a ụgwọ ọrụ niile n’atụfughị oge.
Ka Chineke onye mere ka aha ya biri ebiri n’ebe ahụ kwatuo eze ọbụla mọbụ ndị ọbụla ga-tinye aka ka ha gbanwoo ihe ndị a mọbụ mebie ụlọ Chineke a nke dị na Jerusalem.
Mụ bụ Darius na-ama iwu a ka e jiri nkwụdosike na mkpachapụ anya dobe ya. Ndị okenye ndị Juu rụrụ ụlọ ahụ. Ọ gakwaara ha nke ọma site n’enyemaka amụma Hagaị na Zekarịa nwa Ido.
Ha rụchara ụlọ ahụ site n’iwu Chineke nke Izrel na iwu Saịrus na Darius na Atazezes eze Peshịa. A rụchara ụlọ n’ụbọchị nke atọ nke ọnwa Ada, n’afọ nke isii nke ọchịchị Eze Darius.
Ndị Izrel niile, ndị ụkọchukwu, ndị Levaị na ndịọzọ niile si na nchụpụ wee lọta jiri ọñụ mee emume ido ụlọ Chineke nsọ. N’emume a, ha nyere onyinye nhunye ndị a: otu narị oke ehi, narị ebule abụọ, narị ụmụ atụrụ anọ.
Ha jikwa mkpị iri na abụọ nke na-egosi ọnụọgụgụ ụmụ Izrel chụọ aja maka njọ. Ha tinyere ndị Ụkọchukwu n’otu ha, tinyekwa ndị Levaị n’usoro ha maka ịgbara Chineke odibo na Jerusalem dịka e dere ya n’iwu Mosis.
N’ụbọchị nke iri na anọ n’ọnwa mbụ, ndị si na nchụpụ lọta mere emume ngabiga. Nke a bụ maka na ndị ụkọchukwu na ndị Levaị awụchaala onwe ha, nke mere na ha niile dịzi ọcha. Ha gburu atụrụ oriri ngabiga maka ndị niile si na nchụpụ lọta maka ndị Ụkọchukwu ibe ha na maka onwe ha.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 122: 1-2, 3-4, 4-5
Azịza: Añụrị juru m obi mgbe m nụrụ ha kwuru sị, ka anyị gaa n’ụlọ nke Chineke.
1. Añụrị juru m obi mgbe m nụrụ ha kwuru sị,
‘ka anyị gaa n’ụlọ nke Chineke
Ugbu a, anyị kwụzị
N’ọnụụzọ ama gị. O Jerusalem.
Azịza: Añụrị juru m obi mgbe m nụrụ ha kwuru sị, ka anyị gaa n’ụlọ nke Chineke.
2. A rụrụ Jerusalem dịka obodo
e jikọtara ọnụ nke ọma
Ọ bụ na ya ka agbụrụ niile na-aga
agbụrụ nke Izrel.
Azịza: Añụrị juru m obi mgbe m nụrụ ha kwuru sị, ka anyị gaa n’ụlọ nke Chineke.
3. inye Onyenweanyị ekele dịka o siri nye n’iwu.
Ebe ahụ ka e dobere oche ikpe eze,
ocheeze nke ụlọ Devid.
Azịza: Añụrị juru m obi mgbe m nụrụ ha kwuru sị, ka anyị gaa n’ụlọ nke Chineke.
MBEKU – Jemis 1:18
Alleluịa, Alleluịa:
Chineke jiri okwu nke eziokwu ahụ mee ka anyị pụta iche. Meekwa ka anyị bụrụ ụdị mkpụrụ mbụ nke ihe o kere eke.
Alleluịa.
OZIỌMA – Luk 8:19-21
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Nne Jesu na ụmụnne ya bịakwutere ya, ma ha enweghị ike ịbịarute ya nso n’ihi igwe mmadụ ahụ. Ma a gwara ya sị, ‘Nne gị na ụmụ gị guzo n’ezi na-achọ ịhụ gị.’
Ma Ọ zara ha sị, “Nne m na ụmụnne m bụ ndị na-anụ okwu Chineke na-eme ya eme.
Igbo Mass Readings for September 23 2025, Tuezde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.