Connect with us

Igbo Mass Readings

Igbo Mass Readings for October 3 2023, Tuezde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Nkịtị

Published

on

Igbo Mass Readings for October 3 2023, Tuezde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 3 2023, Tuezde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 8:20-23

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Zecharịa

Yahweh nke igwe ndịagha kwuru sị: N’ọdịniihu, ndị mmadụ, ndị obodo ọzọ dị icheiche ga-abịa. Ndị obodo ọzọ ga-eje n’obodo ọzọ sị: “Anyị ga-agarịrị ịchọta Chineke nke igwe ndịagha, yọọ ya enyemaka; ana m aga n’onwe m?

Ee, ọtụtụ mmadụ na nnukwu mba dị icheiche ga-achọga Yahweh nke igwe ndịagha na Jerusalem, yọọ ya enyemaka.

Advertisement

Yahweh nke igwe ndịagha kwuru sị, “N’ụbọchị ndị ahụ ụmụnwoke iri si na mba ndị na-asụ asụsụ dị icheiche ga-ejide onye Juu n’aka uwe ya sị, Anyị chọrọ iso gị n’ihina anyị amatala na Chineke nọnyeere gị.”

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 87:1-3, 4-5, 6-7

Azịza: Chineke nọyeere anyị

1. N’elu ugwu ya dị nsọ ka Chineke wukwasịrị obodo ya.

Onyenweanyị hụrụ ọnụụzọama Zayọn n’anya

Advertisement

Karịa obodo niile dị na Jekọb

A na-ekwu okwu otito banyere gị,

obodo nke Chineke. Azịza

2. Aga m agụnye ljipt na Babịlọn

Advertisement

na mba ndị kwere na m;

Taya, Filistia na Ethopịa

Ha niile ga-akpọ Zayọn nne n

‘ihina a mụrụ ha niile na ya.

Advertisement

Ọ bụ onye kacha elu mere ya ihe ọ bụ. Azịza

3. Ka Onyenweanyị na-edekọ aha

mba niile n’akwụkwọ

ị ga-agụnye ha ka ndị a mụrụ na Zayọn.

Advertisement

Ha na-agba egwu na-ekwe ukwe na-asị:

Na Zayọn ka ngọzi anyị niile siri bịa. Azịza

MBEKU – Ps 119:35, 29

Alleluia, Alleluia:

Dube m n’ụzọ iwu gị; ekwela ka m soro ụzọ na-akwụghị ọtọ.

Advertisement

Alleluia

OZIỌMA – 9:51-56

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Mgbe ụbọchị na-eru mgbe Jesu ga-esi n’ụwa laa, O chee ihu ịga Jerusalem. O zipụrụ ndịozi ka ha buru ya ụzọ gaba. Ndị nke garanụ banye otu obodo nta nke Sameria ka ha doziere Jesu ihe tupu ọ bịaruo.

Ma ndị obodo ahụ jụrụ ịnabata ya n’ihina o chere ihu ịga Jerusalem. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya, Jemis na Jọn, hụrụ ihe merenụ, ha sịrị, “Dinwenụ Ị chọrọ ka anyị sị ọkụ site n’eluigwe daa, repịachaa ha?” Jesu chigharịrị baara ha mba. Ha wee gaba obodo nta ọzọ.

Advertisement

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for October 3 2023, Tuezde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Catholic Lector is the founder of Catholiclectionary.com. I am a Theologian, a commissioned Lector, and Liturgy Minister. I lead the team that operates Catholiclectionary.com which is a Catholic Church-related website that provides you, on daily basis, with the following: (a) Catholic Daily Mass Readings (b) Reflections on the Daily Mass Readings (c) Daily Prayers (d) Catholic Hymns, and (e) Saints of the Day. I and my team work for the collective growth in spiritual lives of all the faithful.

Advertisement

Get Daily Mass Readings through Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.