Igbo Mass Readings for September 28 2026, Tuezde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 28 2026, Tuezde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:1-3,11-17,20-23
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ nke Job
Ka nke a mesịrị, Job mepere ọnụ ya wee bụọ ụbọchiị a mụrụ ya ọnụ. Job ekwuo sị: “Ka ụbọchị ahụ a mụrụ m laa n’iyi, ya na abalị ahụ nke kwupụtara sị, ‘Adị ime nwata nwoke.
Gịnị mere na m anwụghị oge a na-amụ m, na ekubighị m ume oge m si n’afọ nne m apụta? Gịnị mere ikpere ji nabata m? Olee ihe m ji nwee ara nke m ga-añụ?
N’ihina mgbe ahụ agaara m edina ala nọdụ nwayọọ; agaara m ịrahụ ụra nwee ezumike, Mụ na ndịeze na ndị ndụmọdụ nke ụwa, ndị na-arụgharịrị onwe ha ihe bibiri ebibi; mọbụ mụ na ọkpara ndịeze, ndị nwere ọlaedo, ndị ji ọlaọcha bujuo ụlọ ha.
Olee kwa ihe mere na e zoghị m ezo dịka nwa a mụkworo amụkwo, dịka ụmụntakịrị ahụghị ihe ma ọlị? N’ebe ahụ ndị ajọ mmadụ ga-akwụsị inye nsogbu, ndị ike gwụrụ ga-enwekwa ezumike.
Gịnị mere e ji nye onye nọ n’uru ihe ma nyekwa onye obi na elu ilu ndụ, ndị na-eche ọnwụ ma ọ naghị abịa ma na-egwu ala maka ya karịa akụ zoro ezo; ndị na-enwe nnukwu añụrị, ma nweekwa obi ụtọ mgbe ha chọtara ala ili?
Gịnị mere e ji enye onye ụzọ ya na-edoghị anya ihe bụ onye Chineke gbachibidoro ụzọ?”
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 88:2-3,4-5,6,7-8
Azịza: Onyenweanyị mee ka ekpere m ruo gị ntị.
1. Onyenweanyị Chineke m ana m akpọku gị maka enyemaka ehihie niile.
Ana m ebeku gị n’abalị niile.
Ka ekpere m ruo gị ntị,
nụrụkwa mkpu akwa m! Azịza
2. N’ihina anọ m na nsogbu
anọzi m n’ọnụ ọnwụ
Agụnyela m na ndị na-anwụ anwụ,
abụ m onye enweghị ike ọbụla ma ncha. Azịza
3. Dịka onye a hapụrụ n’etiti ndị nwụrụ anwụ,
dịka onye e gburu egbu nke tọgbọrọ n’ili ya,
dịka ndị i chezọọrọla
ndị ị naghị echekwazi. Azịza
4. Ị tụbanyela m n’ime nnukwu olulu
ebe gbara ọchịchịrị ebe miri emi
Iwe gị dị ukwuu n’ebe m nọ
ọ na-achọ ikpuchi m dịka ebili mmiri nke nnukwu osimiri. Azịza
MBEKU – Ps 119:35, 29
Alleluia, Alleluia:
Dube m n’ụzọ iwu gị; ekwela ka m soro ụzọ na-akwụghị ọtọ.
Alleluia
OZIỌMA – 9:51-56
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Mgbe ụbọchị na-eru mgbe Jesu ga-esi n’ụwa laa, O chee ihu ịga Jerusalem. O zipụrụ ndịozi ka ha buru ya ụzọ gaba. Ndị nke garanụ banye otu obodo nta nke Sameria ka ha doziere Jesu ihe tupu ọ bịaruo.
Ma ndị obodo ahụ jụrụ ịnabata ya n’ihina o chere ihu ịga Jerusalem. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya, Jemis na Jọn, hụrụ ihe merenụ, ha sịrị, “Dinwenụ Ị chọrọ ka anyị sị ọkụ site n’eluigwe daa, repịachaa ha?” Jesu chigharịrị baara ha mba. Ha wee gaba obodo nta ọzọ.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.