Igbo Mass Readings for August 26 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 26 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:1-8

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi mbụ Pọl Degaara Ndị Tesalonịka

Ụnụ onwe ụnụ, ụmụnna maara na nleta anyị letara ụnụ abụghị ihe lara n’iyi. Ụnụ matakwara otu ha siri taa anyị ahụhụ na otu ha si mekwaa anyị ihe ihere na Filipi.

Ma Chineke nyere anyị obi siri ike nke anyị ji kwupụtara ụnụ oziọma nke Chineke n’agbanyeghị mmegide ahụ niile.

N’ihina ọ bụghị site na njehie, mọbụ site n’adịghị ọcha, ma ọ bụkwa site n’aghụghọ ka anyị ji rịọ ụnụ ka ụnụ nara okwu ahụ nke anyị gwara ụnụ;

Kama, dịka otu Chineke sirila họrọ anyị ma nyefekwaa anyị oziọma ahụ n’aka. Nke a mere anyị anaghị ekwu ihe ndị mmadụ chọrọ, kama ihe ga-amasị Chineke Onye na-anwale ihe anyị bu n’obi.

Ụnụ matara nke ọma na ọ dịghị mgbe ọbụla anyị kwuru okwu nrafu mọbụ were ụzọ aghụghọ zobe anyaukwu. Chineke bụ onye akaebe anyị.

O nwekwaghị mgbe anyị chọrọ otito nke mmadụ site n’aka ụnụ mọbụ site n’aka ndịọzọ, n’agbanyeghị na ụnụ kwesịrị ilekọta anyị dịka ụmụazụ nke Chineke;

Kama, anyị nọọrọ nwayọọ n’etiti ụnụ dịka nne si elekọta ụmụ ya anya. Dịka otu ụnụ si dịrị anyị n’obi na oke ịhụnaanya anyị nwere n’ebe ụnụ nọ, anyị dị njikere, ọ bụghị naanị inye ụnụ oziọma kama onwe anyị kwa.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 139:1-3, 4-6

Azịza: Onyenweanyị i nyochaala m, marakwa m!

1. Onyenweanyị, I nyochala m, marakwa m

Ị ma mgbe m nọdụrụ ala na mgbe m kwụ ọtọ

Ị na-anọ ebe dị anya mara ihe m bu n’uche

Ị mazuru omume m niile

mgbe m na-arụ ọrụ mọbụ mgbe m na-ezu ike.

Azịza: Onyenweanyị i nyochaala m, marakwa m!

2. Tupu emeghee m ọnụ m,

Ị maralaarịị ihe m chọrọ ikwu

Ị nọ n’ihu, nọrọkwa m n’azụ;

I ji aka gị na-echekwaba m.

Ụdị amamihe a karịrị m nghọta,

Ọ dị oke elu karịa akọnuuche m.

Azịza: Onyenweanyị i nyochaala m, marakwa m!

MBEKU – Heb 4:12

Alleluia, Alleluia:

Okwu Chineke dị ndụ, dị ike, Ọ bụkwa ihe nwere ike inyocha echiche na izu niile nke obi.

Alleluia

OZIỌMA – 23:23-26

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu kwuru sị: “Azị gbakwa ụnụ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ndị ihuabụọ. N’ihina ụnụ na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke akwụkwọ nri na-esi isi ụtọ na mkpaakwụkwọ a na-akpọ dil na nke a na-akpọ kumim; ebe ụnụ leghaara iwu ndị ka mkpa anya dịka ikpe nkwụmọtọ, ebere na okwukwe.

Ihe ndị a ka ụnụ kara ibu ụzọ mee ma gharakwa ileghara iwu ndịọzọ anya. Ụnụ ndị ndu kpuru isi ndị na-azapụ ahụhụ nta na-efe efe n’ihe ọnụnụ ụnụ ma na-elo ịnyịnyaibu Kamel.

Azị gbakwa ụnụ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ndị ihuabụọ! Ụnụ na-eme ka azụ iko na efere dị ọcha ebe ime ha jupụtara n’ihe e zutere n’ohi na ihe a zọtara n’aka ike.

Ngị onye Farisii kpuru isi! Buru ụzọ mee ka ime iko dị ọcha, mgbe ahụ azụ ya ga-adịkwa ọcha.”

Igbo Mass Readings for August 27 2025, Wednezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for August 26 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.