Connect with us

Igbo Mass Readings

Igbo Mass Readings for August 27 2024, Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Nkịtị

Published

on

Igbo Mass Readings for August 27 2024, Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 27 2024, Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:1-3a, 14-17

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke Abụọ Pọl degaara Ndị Tesalonịka

Gbasara ọbịbịa nke Dinwenụ anyị Jesu Kristi na nzukọ anyị na ga-ezukọ, anyị na-arịọ ụnụ ụmụnna, ka ọ ghara ịlọ ụnụ obi mmiri mọbụ menye ụnụ ụjọ na mmụọ site n’okwu mọbụ n’akwụkwọozi nke dịka o si n’aka anyị bịa iji gosi na ụbọchị nke Dinwenụ anyị abịala.

Ụnụ ekwela ka onye ọbụla duhie ụnụ ụzọ maka ụbọchị ahụ agaghị abịa belụsọ ma nnupụisi ahụ o buru ụzọ bịa. A ga-ekpughekwa onye mmebi iwu ahụ bụ nwa nke mbibi.

Advertisement

Site n’oziọma anyị, Ọ kpọrọ ụnụ ka ụnụ wee nweta otito nke Dinwenụ anyị Jesu Kristi. Ya bụ ụmụnna m, kwụdosienụ ike ma jide nkuzi ọdịbendi anyị kuziiri ụnụ site n’okwu ọnụ mọbụ site n’akwụkwọozi anyị.

Ugbu a, ka Dinwenụ anyị Jesu Kristi n’onwe ya na Chineke Nna onye hụrụ anyị n’anya nyekwa anyị nkasịobi na olileanya.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 96:10, 11-12, 13

Azịza: Onyenweanyị na-abịa ikpe ụwa ikpe.

1. Kwusachaanụ n’ụwa niile na Onyenweanyị bụ eze,

Advertisement

Ọ kwụwasiri ụwa ike, e nweghị ike ibugharị ya.

Ọ ga-eji ikpe nkwụmọtọ kpee mba niile ikpe. Azịza

2. Eluigwe ñụrịba ụwa goribe,

Oke osimiri na ihe niile dị n’ime ya tienụ mkpu.

Advertisement

Ala-ubi niile na ihe niile dị n’ime ya ñụrịbanụ,

Ka osisi niile dị n’oke ọhịa kwebe ukwe añụrị. Azịza

3. N’ihu nke Onyenweanyị n’ihi ọ na-abịa

ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe

Advertisement

ọ ga-eji ikpe nkwụmọtọ na eziokwu

were kpee ụwa na ndị mmadụ ikpe. Azịza

MBEKU – Heb 4:12

Alleluia, Alleluia:

Okwu Chineke dị ndụ, dị ike, Ọ bụkwa ihe nwere ike inyocha echiche na izu niile nke obi.

Advertisement

Alleluia

OZIỌMA – 23:23-26

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu kwuru sị: “Azị gbakwa ụnụ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ndị ihuabụọ. N’ihina ụnụ na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke akwụkwọ nri na-esi isi ụtọ na mkpaakwụkwọ a na-akpọ dil na nke a na-akpọ kumim; ebe ụnụ leghaara iwu ndị ka mkpa anya dịka ikpe nkwụmọtọ, ebere na okwukwe.

Ihe ndị a ka ụnụ kara ibu ụzọ mee ma gharakwa ileghara iwu ndịọzọ anya. Ụnụ ndị ndu kpuru isi ndị na-azapụ ahụhụ nta na-efe efe n’ihe ọnụnụ ụnụ ma na-elo ịnyịnyaibu Kamel.

Advertisement

Azị gbakwa ụnụ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ndị ihuabụọ! Ụnụ na-eme ka azụ iko na efere dị ọcha ebe ime ha jupụtara n’ihe e zutere n’ohi na ihe a zọtara n’aka ike.

Ngị onye Farisii kpuru isi! Buru ụzọ mee ka ime iko dị ọcha, mgbe ahụ azụ ya ga-adịkwa ọcha.”

Igbo Mass Readings for August 28 2024, Ncheta Augustine dị Aso, Bishọp na Dọktọ

Igbo Mass Readings for August 27 2024, Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Advertisement

Catholic Lector is the founder of Catholiclectionary.com. I am a Theologian, a commissioned Lector, and Liturgy Minister. I lead the team that operates Catholiclectionary.com which is a Catholic Church-related website that provides you, on daily basis, with the following: (a) Catholic Daily Mass Readings (b) Reflections on the Daily Mass Readings (c) Daily Prayers (d) Catholic Hymns, and (e) Saints of the Day. I and my team work for the collective growth in spiritual lives of all the faithful.

Advertisement

Get Daily Mass Readings through Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.