Igbo Mass Readings for August 22 2023, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 22 2023, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 6:11-24

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ndịikpe

Mgbe ahụ, Mmụọọma nke Yahweh bịara n’obodo Ofra, nọdụ ala n’okpuru osisi Ook nke Joash, onye ọnụmara Abieza.

Gideọn nwa ya nwoke na-eticha ọka na nzuzo, n’ebe a na-apịpụta mmanya vaịn, ka ndị Midian ghara ịhụ ya. Mmụọọma Yahweh gosịrị ya onwe ya n’ebe ahụ, sị ya, “Osebụrụwa nọnyeere gị bụ dike na dimkpa.”

Gidiọn wee sị ya, “Onyenwe m, ọ bụrụ na Osebụrụwa nọnyeere anyị, gịnị mere ihe ndị a niile ji adakwasa anyị? Kedụ maka ọrụ ebube ahụ niile nnanna anyị ha kọọrọ anyị na Yahweh na-arụburu ha?

Ha gwara anyị na ọ mere ka ha si n’ljipt pụta! Ma ugbu a, Yahweh ahapụla anyị, nyefekwaa anyị n’aka ndị Midian ka ha mee anyị otu dị ha mma.”

Mgbe ahụ, Yahweh gwara ya, sị, “Jiri nnukwu ike gị gaa napụta ndị Izrel n’aka ndị Midian. Mụ onwe m na-ezije gị.” Gidiọn zara ya, “Onyenwe m, gịnị ka m ga eji anapụta Izrel?

Lee, ọnụmara nke m n’agbụrụ Manase bụ ndị enweghị ike ma ọlị. Mụ onwe m bụkwa onye pekarịchara mpe n’ezinụụlọ nna m.” Chineke asị ya, “Ị ga-anapụtalị ha, n’ihina mụ onwe m ga-anọnyere gị.

Ị ga-egwepịa ndị Midian dịka a ga-asị na ha bụ naanị otu nwoke.” Gidiọn sịrị ya, “Biko, ọ bụrụ na enwere m ihuọma n’ebe ị nọ, gosị m ihe ịrịbaama na n’ezie gị onwe gị bụ Chineke na-akpanyere m ụka.

Biko apụla n’ebe a, ka m jee wetara gị ihe oriri.” Ọ gwa ya sị, “Aga m anọ n’ebe a ruo mgbe ị ga-abịaghachi.” Gidiọn banyere n’ụlọ ya, gbuo otu nwa ewu, were otu kilogram ntụ ọka, ghee achịcha ekoghị eko.

O tinyere anụ ahụ na nkata, tinyekwa ofenri ahụ n’ite, butere ha Mmụọọma Yahweh n’okpuru osisi Ook ahụ, chee n’ihu ya, Mmụọọma nke Osebụrụwa gwara ya sị, “Dọkwasa anụ ahụ na achịcha ekoghị eko ahụ n’elu nkume a.

Wụsakwa ofe ahụ n’elu ha.” Gidiọn mere ka o si kwuo. Mmụọọma ahụ setịpụrụ mkpara ya, metụ anụ ahụ, na achịcha ekoghị eko ahụ. Ọkụ wee si na nkume ahụ, rechapụ anụ na achịcha ahụ.

Mmụọọma ahụ wee pụọ, ọ hụkwaghị ya ọzọ. Mgbe ahụ ka Gidiọn matara na ọ bụ Mmụọọma nke Osebụrụwa. Gidiọn wee kwuo n’egwu, sị, “Ewo, Onyenwe m Chineke!

Ahụla m Mmụọọma gị ihu na ihu!” Yahweh zara ya sị, “Udo dịrị gị. Atụla egwu. Ị gaghị anwụ.” Gidiọn wee wuoro Yahweh ebe nchụaja n’ebe ahụ, kpọọ aha ya, “Yahweh bụ udo.”

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 85:9, 11-12, 13-14

Azịza: Onyenweanyị na-agwa ndị nke ya okwu udo.

1. Ana m ege ntị n’ihe Chineke, Onyenweanyị na-ekwu

ihe ọ na-ekwu bụ udo

maka ndị nke ya, ndị dị nsọ

ma ọbụrụ na ha alaghachighị azụ na mmehie ha. Azịza

2. Ịhụnanya na okwukwe amakụọla

eziomume na udo ebiela ọma

Irubeisi ga-esi n’ala pulite

eziomume ga-esi n’elu ledata anya. Azịza

3. Ee Onyenwanyị ga-enye anyị ọganihu,

ala anyị ga-amịta mkpụrụ bawanye

Eziomume ga-aga n’ihu ya,

udo ga na-eso nzọ ụkwụ ya. Azịza

MBEKU – 1 Jọn 2:5

Alleluia, Alleluia:          

Onye ọbụla nke na-edobe okwu Kristi, n’ezie, ịhụnanya maka Chineke zuru oke n’ime ya.

Alleluia.

OZIỌMA – 19:23-30

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu wee gwa ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ana m agwa ụnụ eziokwu, ọ ga-esiri ọgaranya ike ịba n’alaeze eluigwe. Ọzọkwa agwa m ụnụ, ọ dịkarịrị ịnyịnya ibu Kamel mfe ịgafe n’anya alanga karịa ọgaranya ịba n’alaeze Chineke.”

Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ nke a, ọ tụrụ ha n’anya. Ha wee na-ajụ sị, “Onyezi ka a ga-azọpụta?” Jesu lere ha anya sị ha, “Nebe mmadụ nọ, nke a ekweghị omume, mana o nweghị ihe nyịrị Chineke omume.”

Mgbe ahụ Pita jụrụ ya sị, “lee, anyị ahapụla ihe niile sobe gị, gịnịkwanụ ka anyị ga-eketa?” Jesu asị ha, “N’ịgwa ụnụ eziokwu, mgbe Nwa nke mmadụ ga-anọkwasị n’ocheeze nke ebube ya n’ụwa ọhụrụ, ụnụ ndị na-eso m ga-anọkwasakwa n’ocheeze iri na abụọ na-ekpe agbụrụ iri na abụọ nke Izrel ikpe.

Onye ọbụla nke hapụrụ ụlọ, ụmụnne nwoke, ụmụnne nwaanyị, nna na nne, ụmụ mọbụ ala, n’ihi aha m, ga-enweghachi ihe ndị a narị kwuru narị.

Ọ ga-eketakwa ndụ ebighịebi. Ọtụtụ ndị bu ụzọ ga-abụ ndị ikpeazụ, ndị ikpeazụ abụrụ ndị bu ụzọ.

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for August 22 2023, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 11, 2022