Igbo Mass Readings for November 14 2023, Tuezde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 14 2023, Tuezde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:23-3:9

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Amamihe

Mana Chineke ekeela mmadụ ka ọ dị anwụ anwụ, o kere ya n’oyiyi nke ya. Ọ bụ anya ụfụ nke ekwensu wetara ọnwụ n’elu ụwa, ndị otu ya bụkwa ndị ga-ahụ ya.

Ma mkpụrụobi ndị eziomume dị n’aka Chineke, o nweghị ahụhụ ọbụla ga-emetụ ha. N’anya ndị nzuzu, ha dịka ndị nwụrụ anwụ, ngafe nke ha dịka ahụhụ n’onwe ya.

Nhapụ ha hapụrụ anyị dịka ịla n’iyi, mana ha nọ n’udo. N’ezie, a bịa n’anya mmadụ, ha tara ahụhụ, ma olileanya ha jupụtara n’uju nke anwụ anwụ. A tara ha obere ahụhụ ma ha ga-anata nnukwu ụgwọ.

Chineke n’onwe ya anwaleela ha, were chọpụta na ha tosịrị ibinyere ya. Ọ ñụchaala ha dịka e si añụcha ọlaedo n’ọkụ, bịa nara ha dịka aja nsureọkụ. Mgbe oge nleta ha bịara, ha ga-achawapụta ka ihe, dịka ikerike ọkụ si adapụta n’ukwu ọkụ.

Ha ga-achị mba niile na mmadụ niile, Yahweh ga-abụ eze ha ebighịebi. Ndị ahụ chekwubere na ya, ga-aghọta eziokwu, ndị kwụdosiri ike ga-ebinyere ya n’ịhụnaanya, n’ihina amara na ebere na-eche ndị ahụ ọ họọrọ, ọ na-echekwa ndị nke ya niile.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 34: 2-3, 16-17, 18-19

Azịza: Aga m eto Onyenweanyị oge niile.

1. Aga m eto Onyenweanyị oge niile

Otito ya ga-adị n’egbugbere ọnụ m mgbe ọbụla

Mkpụrụobi m na-egori n’Onyenweanyị

ka ndị umeala nụrụ ma ñụrịa. Azịza

2. Onyenweanyị na-elekọta ndị eziomume anya

Ọ na-egekwa mkpu akwa ha ntị

Mana Onyenweanyị na-agbarụ ihu n’ebe ndị ajọomume nọ

Ọ na-eme ka aghara ichetakwa ha n’ụwa. Azịza

3. Ndị eziomume kpọkuru Onyenweanyị,

Ọ za ha, wee zọpụta ha na nsogbu ha niile

Onyenweanyị na-anọ ndị obi loghara elogha nso,

Na-enyere ndị dara mba na mmụọ aka. Azịza

MBEKU – Jọn 17:17

Alleluịa, Alleluịa:

Were eziokwu gị doo anyị nsọ n’ihina okwu gị bụ eziokwu.

Alleluịa.

OZIỌMA – 17:7-10

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “O nwere onye n’ime ụnụ nke nwere nwodibo na-arụrụ ya ọrụ n’ubi, mọbụ na-azụrụ ya atụrụ, ga-agwa nwodibo ya mgbe o siri n’ugbo bata sị, ‘Bịa rie nri ozigbo?’

Ọ bụ na ọ gaghị agwa ya sị, ‘Kwadoro m nri anyasị, jikekwara onwe gị nke ọma ịgbara m odibo ruo mgbe m ga-ericha, ñụchaa.

E mechaa, ị ga-eri ma ñụkwaa nke gị.’ Ọ ga-ekele nwodibo ahụ n’ihina o mere ihe a gwara ya? Otu a ka ọ dị ebe ụnụ nọ.

Mgbe ọbụla ụnụ mechara ihe a gwara ụnụ, ụnụ ga-ekwu sị, ‘Anyị bụ ụmụodibo etosịghị etosị, ọ bụ ọrụ dịịrị anyị ka anyị rụrụ.”

Igbo Mass Readings for November 15 2023

Last Update: October 16, 2022