Igbo Mass Readings for October 31 2023, Tuezde Izuụka nke Iri Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 31 2023, Tuezde Izuụka nke Iri Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 8:18-25
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom
Echere m na ahụhụ nke oge a erughị n’ụzọ ọbụla ịtụnyere nnukwu ebube nke Chineke ga-ekpughere anyị. Ihe niile e kere eke ji oke agụụ na-eche mgbe a ga-egosipụta ndị bụ ụmụ Chineke.
Emere ka ihe niile e kere eke bụrụ ihe efu; Ọ bụghị dịka ha si chọọ, kama ọ bụ ka Chineke si chọọ. Ma ihe niile e kere eke ka nwere olileanya, na otu ụbọchị na ha ga-enwere onwe ha site n’agbụ nke ire ure, bịa sonye n’inwere onwe ahụ dị ebube nke ụmụ Chinekeọ Anyị ma na site na mbido ruo ugbu a ihe niile e kere eke na-asụ ude n’otu dịka nwaanyị ime na-eme.
Ọ bụghị naanị ihe e kere eke, anyị onwe anyị kwa, ndị natara mkpụrụ mbụ nke Mmụọ Nsọ, na-asụkwa ude n’ime onwe anyị, ka anyị nọ na-eche mgbe Chineke ga-eme anyị ụmụ ya, ma mgbe ọ ga-azọpụta anụahụ anyị.
Ọ bụ site n’olileanya nke a ka e ji zọpụta anyị. Ọ bụrụ na mmadụ ahụla ihe ọ na-ele anya ya, ihe ahụ agaghịkwa abụzi olileanya. N’ezi asụsụ, mmadụ ọ na-atụrịrị anya ihe o jirila anya ya abụọ hụ? Ma ọ bụrụ na anyị na-atụ anya ihe anyị ahụghị anya, anyị na-ewere ndidi na-eche ihe ahụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 126: 1-2, 2-3, 4-5, 6
Azịza: Onyeweanyị rụụrụ anyị ọrụ ịtụnaanya.
1. Mgbe Osebụrụwa gbapụtara Zayọn n’ohu,
ọ dị anyị ka nrọ.
Oge ahụ ọchị na ukwe juru anyị ọnụ. Azịza
2. Ọbụladị ndị ọgọmmụọ na-ekwu n’onwe ha na-asị;
Lee ọrụ ịtụnaanya Chineke rụụrụ ha
Lekene ọrụ ịtụnaanya Onyenweanyị rụụrụ anyị
n’ezie anyị na-enwe añụrị. Azịza
3. Kpọghachi ndị nke anyị e ji eji azụ, O Osebụrụwa,
Dịka mmiri si alaghachi na Negeb
Ndị niile ji anya mmiri na-akụ mkpụrụ,
ji mkpu ọñụ ugbu a aghọ mkpụrụ. Azịza
4. Mgbe ha na-apụ
ha bu mkpụrụ akụkụ na-ebe akwa,
Mgbe ha na-alọta
ha bu ukwu ọka na-ekwe ukwe añụrị. Azịza
MBEKU – Jemis 1:21.
Alleluịa, Alleluịa:
Werenụ nwayọọ nara okwu ahụ nke a kụrụla n’obi ụnụ dịka mkpụrụ, nke pụrụ ịzọpụta mkpụrụobi ụnụ.
Alleluịa.
OZIỌMA – 13:18-21.
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu jụrụ ọzọ sị, “Gịnị ka alaeze Chineke dịka ya? Gịnị ka m ga-eji tụnyere ya? Ọ dịka mkpụrụ osisi Mọstad nke otu onye weere kụọ n’ubi.
O toro, bụrụ nnukwu osisi, ụmụnnụnụ abịa rụọ akwụ n’alaka ya.” Jesu jụkwara ọzọ sị, “Gịnị ka m ga-eji tụnyere alaeze Chineke?
Ọ dịka ihe na-eko achịcha nke nwaanyị weere gwakọọ ya na akpa ntụọka atọ, ruo mgbe ha koro.”