Igbo Mass Readings for June 27 2023, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 27 2023, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 13:2, 5-18

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Jenesis

Abram bara nnukwu ụba, n’ihi ọtụtụ anụụlọ, ọlaọcha na ọlaedo o nwere. Lọt, onye so Abram na njem ya nwere ọtụtụ ewu na atụrụ na anụụlọ dị icheiche nke onwe ya, na ọtụtụ ụlọikwu.

Ala ahụ ezurughị ha n’ihina ha nwere ọtụtụ ihe nke ha enweghị ike bikọọ ọnụ n’otu ebe. Esemokwu dapụtara n’etiti ndị nche ụmụ anụmaanụ nke Abram nakwa ndị nke Lọt. (Ndị Kenaan na Periz bi n’ala ahụ n’oge ahụ).

Dịka o si dapụta, Abram gwara Lọt sị: “Ka a ghara inwe esemokwu n’etiti mụ na gị mọbụ n’etiti ndị nche ụmụ anụmaanụ m na ndị nke gị, n’ihina anyị bụ nwanne. Ọ bụ na e nweghị obosara ala n’ihu gị?

Ka anyị kewaa; I were aka ekpe, mụ ewere aka nri; i were aka nri, mụ ewere aka ekpe”. Ka ọ na-ele anya gburugburu, Lọt hụrụ ala Jọdan niile dị larịị, nke mmiri na-eru n’ime ya (nke a mere tupu Yahweh emebie Sodọm na Gomora), dịka ala ubi Yahweh mọbụ ala ljipt nke dị anya wee rute na Zoa.

Nke a mere Lọt ji họrọ ala Jọdan ahụ niile dị larịị maka onwe ya bịa mechaa gaba n’akụkụ ọwụwa anyanwụ. N’ebe a ka ha kewara, gawara onwe ha. Abram bi n’ala Kenaan; Lọt ebiri n’etiti obodo ndị ahụ dị n’ala ahụ dị larịị, ebe o wukwasara ụlọikwu ya niile n’akụkụ obodo Sodọm.

N’oge ahụ ndị Sodọm bụ ndị obi ọjọọ na ndị ajọomume nke ukwuu megide Yahweh. Yahweh sịrị Abram mgbe ya na Lọt kewachara, “Si n’ebe ị nọ lee anya gburugburu legaa n’ugwu na ndịda lezuo n’ofe ọwụwa anyanwụ nakwa ọdịda ya.

Aga m enye gị na ụmụụmụ gị ala ndị a niile ị na-ele anya ebeebe. Aga m eme ka ụmụụmụ gị dịka mkpụrụ aja dị n’ala, ọ bụrụ na ndị mmadụ enwee ike gụtazuo mkpụrụ aja dị n’ala ọnụ, ha gakwa enwe ike gụtachaa ụmụụmụ gị ọnụ.

Kulie! Gazuo ogologo na uhie ala ahụ, n’ihina ọ bụ uche m inye gị ya”. Nke a mere Abram ji foro ụlọikwu ya gaa biri ebe ahụ a na-akpọ Ook nke Mamre, n’obodo Hebrọn n’ebe ahụ o wuru otu ebe nchụaja maka Yahweh.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 15:2-3, 3-4, 5

Azịza: Onye na-ebi ndụ eziomume ga-ebi n’ugwu nsọ nke Onyenweanyị

1. Ọ bụ nwoke ahụ na-ebughị njọ ọbụla na ndụ ya,

onye na-eme ihe dị mma,

onye ji obi ya niile ekwu eziokwu

onye na-anaghị ekwutọ ndịọzọ. Azịza

2. Onye anaghị eme onye agbataobi ya ihe ọjọọ

mọbụ bo ya ebubo asị.

Onye na-eleda ndị amaghị Chineke anya

ma na-enye ndị na-atụ Yahweh egwu nsọpụrụ. Azịza

3. Onye na-ebinye ego n’anaghị ọmụrụ nwa,

Onye anaghị eri ngarị iji megide Onye enweghị ihe ọjọọ o mere

Ọ bụrụ na mmadụ e mee ihe ndị a

Onweghị ihe ọbụla ga-eme ka egwu tụọ ya. Azịza

MBEKU

Alleluia, Alleluịa:

“Mụ onwe m bụ ụzọ, eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye ọbụla ga-abịakwute Nna ma ọ bụghị site na m.

Alleluịa

OZIỌMA – 7:6, 12-14

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ụnụ enyela nkịta ihe dị nsọ, nke ụnụ na-atụpụrụ ezi ụlarị oke ọnụ ụnụ, ka ha ghara ịzọtọ ha ma tụgharịa buso ụnụ agha.

Ya bụ, meerenụ ndị ọzọ ihe ọbụla ụnụ na-achọ ka ha meere ụnụ; nke a bụ isi nkuzi iwu Mosis na ndị amụma. “Sinụ n’ọnụụzọ dị warawara banye, n’ihina ụzọ nke mbibi sara mbara ma dịkwa obosara, ma ọtụtụ ka ha dị bụ ndị na-abanye n’ime ya.

Ma warawara na mkpagide ka ụzọ ahụ dị, nke na-eduba na ndụ, olemaole bụ ndị na achọta ya.

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for June 27 2023, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 9, 2022