Igbo Mass Readings for June 23 2026, Tuzde Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 23 2026, Tuzde Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 19:9-11, 14-21, 31-35, 36
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ nke Abụọ nke Ndịeze
N’otu oge ahụkwa eze Asiria nụrụ akụkọ na Tịhaka, eze Etiopia du ndịagha ya abịa ibuso ya agha, o zigara ndịozi ka ha jekwuru Hezekaya sị, “Ihe a ka ụnụ ga-agwa Hezekaya eze Juda sị, ‘Ekwela ka Chineke gị, onye ị tụkwasara obi na ya duhie gị, site n’ime ka i nwee, nchekwube na agaghị m emeri Jerusalem.
Lee, ị nụla ihe ndịeze Asiria merela mba niile mebichaa ha kpamkpam, ọ bụ gị ka a ga-azọpụta?”” Hezekaya naara akwụkwọozi site n’aka ndịozi ya, gụọ ya, ọ gbagokwara n’ime ụlọ Osebụrụwa gbasakwa ya n’ihu Osebụrụwa.
Hezekaya kpere ekpere n’ihu Chineke sị, “Biko Yahweh Chukwu nke Izrel, onye nọ n’etiti ndị mmụọọma, ị bụ Chineke, naanị gị, nke ala eze niile nke ụwa, gị mere eluigwe na ụwa.
Yahweh, gee ntị nụrụ, meghee anya gị ka ị hụ, nụrụ okwu nke Senakerib zitere iji kparịa Chineke dị ndụ. O Yahweh, n’eziokwu ndịeze Asiria emebichaala ọtụtụ obodo n’aka ha.
Ha suru chi ha niile ọkụ, n’ihina ha abụghị chi, kama ọrụ aka mmadụ, osisi na nkume. Ya mere e ji mebie ha. Ugbu a biko Yahweh Chineke anyị, ana m arịọ gị, si n’aka ya zọpụta anyị, ka obodo niile nke ụwa mara na sọ gị bụ Yahweh na Chineke.”
Aịzaya nwa Emọz wee zigara Hezekaya ozi sị, “Yahweh Chineke nke Izrel kwuru sị, ‘Anụla m arịrịọ gị banyere Senakerib, eze Asiria.’ Nke a bụ okwu nke Yahweh kwurula gbasara ya: Ada Zayọn, agbọghọ amaghị nwoke elelịala gị anya ma chịnye gị ihere; ada Jerusalem efufeela isi, n’azụ gị.
Ndị ahụ fọdụrụ afọdụ ga-esi Jerusalem na elu ugwu Zayọn pụta. Yahweh ga-emerịrị nke a site na mmasị ya. Ihe a ka Yahweh kwuru banyere eze Asiria: “Ọ gaghị abata n’ime obodo a mọbụ gbabata akụ na ya.
Ọ gaghị eji ọta ya bata n’ime ya, nke ọ na-arụrụ onwe ya nkwasa ọ ga-eji megide ya. Site n’ụzọ o siri bịa ka ọ ga-esi laghachi, ọ gaghị abata n’ime obodo a,’ ọ bụ Osebụrụwa kwuru nke a.
Maka na aga m echedo obodo a, zọpụta ya maka ihi m n’ihi nwodibo m, Devid. N’abalị ụbọchị ahụ mmụọọma nke Yahweh gara gbuo narị puku mmadụ na puku iri asatọ na ise n’ụlọagha ndị Asiria. Senakerib eze Asiria wee laghachi, ga biri na Ninive.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 48:1-2,2-3,9-10
Azịza: Chineke na-eme ka obodo ya gusosie ike ebeebe ebeebe.
1. Onyenweanyị dị ukwuu bịa kwesịkwa inye otito
n’obodo Chineke anyị
n’ugwu ya dị nsọ, ihe mara mma n’ịdị elu
na ihe-obi-ụtọ nke ụwa niile.
Azịza: Chineke na-eme ka obodo ya gusosie ike ebeebe ebeebe.
2. Ugwu Zayọn isi añụrị nke ụwa niile
ebe obibi nke nnukwu eze ahụ.
Chineke n’onwe ya egosila na ya
bụ ebe mgbaba n’etiti obodo ahụ.
Azịza: Chineke na-eme ka obodo ya gusosie ike ebeebe ebeebe.
3. Chineke, anyị nọ n’ime ụlọnsọ gị
na-achịgharị ịhụnaanya gị n’obi anyị
Ụwa niile na-ekwupụta aha gị na otito gị,
O Chineke aka nri gị jupụtara n’ikpe nkwụmọtọ.
Azịza: Chineke na-eme ka obodo ya gusosie ike ebeebe ebeebe.
MBEKU
Alleluia, Alleluịa:
“Mụ onwe m bụ ụzọ, eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye ọbụla ga-abịakwute Nna ma ọ bụghị site na m.
Alleluịa
OZIỌMA – 7:6, 12-14
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ụnụ enyela nkịta ihe dị nsọ, nke ụnụ na-atụpụrụ ezi ụlarị oke ọnụ ụnụ, ka ha ghara ịzọtọ ha ma tụgharịa buso ụnụ agha.
Ya bụ, meerenụ ndị ọzọ ihe ọbụla ụnụ na-achọ ka ha meere ụnụ; nke a bụ isi nkuzi iwu Mosis na ndị amụma. “Sinụ n’ọnụụzọ dị warawara banye, n’ihina ụzọ nke mbibi sara mbara ma dịkwa obosara, ma ọtụtụ ka ha dị bụ ndị na-abanye n’ime ya.
Ma warawara na mkpagide ka ụzọ ahụ dị, nke na-eduba na ndụ, olemaole bụ ndị na achọta ya.
Igbo Mass Readings for June 24 2026, Emume nke Ọmụmụ Jọn Ome Mmirichukwu
Igbo Mass Readings for June 23 2026, Tuzde Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.