Igbo Mass Readings for July 29 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 29 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 33:7-11; 34:5-9, 28
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ọpụpụ
N’oge ahụ, Mosis na-amanye ụlọikwu n’ebe tetụrụ aka site n’ogige ụmụ Izrel. Ọ kpọrọ ya ụlọnzukọ. Onye ọbụla chọrọ ịga n’ihu Yahweh, na-ahapụ ogige ebe obibi ha gaba n’ụlọnzukọ ahụ.
Mgbe ọbụla Mosis na-aga n’ụlọnzukọ ahụ ndị mmadụ niile na-ebili, nwoke ọbụla akwụrụ n’ihu ụlọikwu ya na-ele Mosis anya ruo mgbe ọ banyere n’ime ụlọnzukọ ahụ.
Mosis banyechaa n’ụlọnzukọ ahụ, urukpu na-akwụ ka ide na-agbadata kwụchie n’ọnụụzọ ụlọnzukọ ahụ. Yahweh ebidozie gwaba Mosis okwu.
Mgbe ndị mmadụ niile hụrụ ide urukpu ahụ ka ọ kwụchiri ọnụụzọ ụlọnzukọ ahụ, onye ọbụla na-ebili kpọọ isiala n’ọnụụzọ ụlọikwu nke ya.
Yahweh na-agwa Mosis okwu ihu n’ihu dịka enyi si agwa enyi ya. E mechaa Mosis na-alọghachi n’ogige Izrel, ma nwodibo ya bụ nwaokorobịa a na-akpọ Joshua nwa Nọn anaghị ahapụ ụlọnzukọ ahụ, ọ na-anọgide na ya.
Yahweh gbadatara n’ụdị urukpu, nọnyere Mosis n’ebe ahụ, kwupụta na aha ya bụ Yahweh. Yahweh siri n’ihu ya gafee, na-ekwu sị, “Yahweh, Yahweh Chineke nke dị ebere dị obiọma, ọ naghị ewe iwe ọsịịsọ.
O jupụtara n’ịhụnaanya tọrọ atọ na nkwụdosiike. Ọ na-edobe ịhụnaanya dị ọkpụ maka puku kwuru puku mmadụ, agbaghara ajọomume, mmehie na njọ, ma bụrụkwa onye na-agaghị anwa anwa tọhapụ onye nke ikpe mara.
Ọ na-ejikwa ajọomume nke nna metara na-akwụ ụmụ ya na ụmụụmụ ya ụgwọ ruo na ndụdụgandụ nke atọ na nke anọ”. Mosis mere ngwangwa hulata isi ya n’ala sekpuo.
O kwuru sị, O Yahweh, ana m arịọ gị, ka i soro anyị na-aga, na-agbanyeghị na ha bụ ndị ekweghị ekwe, gbaghara ajọomume na njọ anyị niile, ma werekwa anyị dịka ndị nke gị”.
Mosis na Yahweh nọrọ ebe ahụ ụbọchị iri anọ, o righị ihe mọbụ ñụọ ọbụladị mmiri. O deturu n’okwute ndị ahụ o ji n’aka okwu ọgbụgbandụ nke bụ iwu iri ahụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 103: 6-7, 8-9, 10-11, 12-13
Azịza: Osebụrụwa dị ebere na ịhụnnanya.
1. Onyenweanyị, onye na-eme iheọma,
na-anọkarị n’akụkụ ndị a na-emegbu emegbu,
O mere ka Mosis mata echiche ya,
ma gosịkwa ụmụ Izrel ike ya.
Azịza: Osebụrụwa dị ebere na ịhụnnanya.
2. Osebụrụwa dị ebere na ịhụnaanya,
ọ naghị ewe iwe ngwa ngwa, ịhụnaanya ya dị ukwuu;
Iwe ya anaghị adị ebeebe,
ịkpọ asị ya na-adị sọ nwa ntịntị oge.
Azịza: Osebụrụwa dị ebere na ịhụnnanya.
3. Ọ naghị emeso anyị dịka njọ anyị siri dị,
ọ naghị ata anyị ahụhụ, dịka amamikpe anyị na njọ anyị si dị.
Dịka eluigwe siri dị elu n’ebe ụwa dị,
otu ahụ ka ịhụnaaya ya siri dị ukwuu
n’ebe ndị na-atụrụ ya egwu nọ.
Azịza: Osebụrụwa dị ebere na ịhụnnanya.
4. Ọ na-ewepụ njọ anyị n’ebe anyị nọ
karịa otu ọwụwa anyanwụ si dị anya n’ọdịda ya.
Dịka nna si emere ụmụ ya ebere,
otu ahụ ka Onyenweanyị si emeso ndị na-atụrụ ya egwu.
Azịza: Osebụrụwa dị ebere na ịhụnnanya.
MBEKU – Jọn 15:15
Alleluia, Alleluia:
Ana m akpọ ụnụ ndị enyi, Onyenweanyị na-ekwu, n’ihina agwala m ụnụ ihe niile m nụrụ n’ọnụ Nna m.
Alleluia.
OZIỌMA – 13:36-43
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Mgbe ahụ Jesu hapụrụ ọtụtụ igwe mmadụ ahụ banye n’ụlọ. Ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị, “Kọwaara anyị isi ụkabụilu maka ata ahụ nke puru n’ubi”.
Ọ zara ha sị, “Onye ghara mkpụrụ ọma ahụ bụ Nwa nke mmadụ. Ubi ahụ bụ ụwa, mkpụrụ ọma ahụ bụ ụmụ alaeze, ata ahụ bụ ụmụ nke ajọ onye. Onye iro nke ghara ata ahụ bụ ekwensu.
Oge owuwe ihe ubi bụ ọgwụgwụ oge nke ụwa. Ndị na-ewe ihe ubi bụ ndị mmụọọma. Dịka e si ekpokọta ata kpọọ ha ọkụ, otu a ka ọ ga-adị n’oge ọgwụgwụ nke ụwa.
N’oge ahụ nwa nke mmadụ ga-ezipụ ndị mmụọọma ya, ha ga-ekpopụ n’alaeze ya ihe niile na-ebute njọ na ndị omenjọ.
Ha ga-atụbakwa ha n’oke ọkụ ahụ, ebe ibe akwa na ịta ikikere eze ga-adị. Ndị eziomume ga-achawapụta dịka anyanwụ n’alaeze nke nna ha. Onye nwere ntị, ya nụrụ.
Igbo Mass Readings for July 30 2025, Wednezde Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume
Igbo Mass Readings for July 29 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.