Igbo Mass Readings for July 30 2024, Tuzde Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 30 2024, Tuzde Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 14:17-22

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Jeremiah

Nke a bụ ihe ị ga-agwa ha, ka anya m jupụta n’anya mmiri ehihie na abalị, ka ha gharakwa akwụsịghị akwụsị, n’ihina e merụọla ndị nke m nnukwu ahụ, enyela ha nnukwu apa n’ahụ.

Ọ bụrụ na m apụọ n’ime ugbo, ana m ahụ ndị e jiri mmaagha gbuo, ọ bụrụ na m abata n’ime obodo, ana m ahụ ndị agụụ na-agụ.

Ma ndị amụma na ndị ụkọchukwu na-arụ ọrụ ha na-aga n’ihu, ma ha amaghị ihe ha na-eme. Ọ pụtara na ị jụla Juda kpam kpam? Obi gị ọkpọla ya asị?

Ọ bụ gịnị kpatara i jiri merụọ anyị nnukwu ahụ nke na anyị enweghị ọgwụgwọ? Anyị chọrọ udo ma iheọma abịaghị, anyị chọrọ ọgwụgwọ ma naanị ihe egwu ka anyị hụrụ.

Anyị na-ekwupụta njọ anyị, O Yahweh, na nke nna anyị ha maka na anyị emeela ihe ọjọọ megide gị. Agbahapụla anyị maka ihi aha gị, emenyekwala Jerusalem bụ ebe ocheeze gị dị ebube dị ihere, cheta ọgbụgbandụ anyị na gị, emebikwala ya.

O nwere chi ndị mba ọzọ pụrụ ime ka mmiri zoo? Eluigwe o nwere ike ime ka mmiri zoo site n’ike aka ya? Ọ bụ na ọ bụghị gị na-eme ihe ndị a, Osebụrụwa Chineke anyị? Anyị atụkwasala nchekwube anyị na gị n’ihina ọ bụ gị na-eme ihe ndị a.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 79: 8, 9, 11, 13

Azịza: Onyenweanyị, maka otito nke aha gị zọpụta anyị

1. Atala anyị ahụhụ maka njọ nnanna anyị ha mere;

Kama ka obiọma gị bịakwute anyị ọsọọsọ,

N’ihina ha ewotuola anyị ala nke ukwuu. Azịza

2. Nyere anyị aka O Chincke onye nzọpụta anyị,

maka otito nke aha gị

zọpụta anyị ma gbagharakwa anyị njọ anyị

n’ihi aha gị! Azịza

3. Meenụ ka akwa arịrị ndị nọ na nga ruo gị ntị.

Were ike aka gị chekwaba ndị a amara ikpe ọnwụ!

Mgbe ahụ anyị bụ ndị nke gị, igwe atụrụ ị na-azụ,

ga-enye gị ekele ebeebe ebeebe,

bido na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ

anyị ga-ekwupụta otito gị. Azịza

MBEKU – Jọn 15:15

Alleluia, Alleluia:

Ana m akpọ ụnụ ndị enyi, Onyenweanyị na-ekwu, n’ihina agwala m ụnụ ihe niile m nụrụ n’ọnụ Nna m.

Alleluia.

OZIỌMA – 13:36-43

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Mgbe ahụ Jesu hapụrụ ọtụtụ igwe mmadụ ahụ banye n’ụlọ. Ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị, “Kọwaara anyị isi ụkabụilu maka ata ahụ nke puru n’ubi”.

Ọ zara ha sị, “Onye ghara mkpụrụ ọma ahụ bụ Nwa nke mmadụ. Ubi ahụ bụ ụwa, mkpụrụ ọma ahụ bụ ụmụ alaeze, ata ahụ bụ ụmụ nke ajọ onye. Onye iro nke ghara ata ahụ bụ ekwensu.

Oge owuwe ihe ubi bụ ọgwụgwụ oge nke ụwa. Ndị na-ewe ihe ubi bụ ndị mmụọọma. Dịka e si ekpokọta ata kpọọ ha ọkụ, otu a ka ọ ga-adị n’oge ọgwụgwụ nke ụwa.

N’oge ahụ nwa nke mmadụ ga-ezipụ ndị mmụọọma ya, ha ga-ekpopụ n’alaeze ya ihe niile na-ebute njọ na ndị omenjọ.

Ha ga-atụbakwa ha n’oke ọkụ ahụ, ebe ibe akwa na ịta ikikere eze ga-adị. Ndị eziomume ga-achawapụta dịka anyanwụ n’alaeze nke nna ha. Onye nwere ntị, ya nụrụ.

Igbo Mass Readings for July 31 2024, Ncheta Ignatius nke Loyola, Ụkọchukwu

Igbo Mass Readings for July 30 2024, Tuzde Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 10, 2022