Igbo Mass Readings for July 4 2023, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 4 2023, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 19:15-29
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Jenesis
Mgbe chi bọrọ, ndị mmụọọma ahụ gwara Lọt ka ọ kpọrọ nwunye ya, na ụmụ ya ndị nwaanyị abụọ pụọ mọbụ e kpochapụ ha na obodo ahụ. Ka ọ nọ na-egbu oge, Ụmụnwoke ahụ dọkpụrụ ya n’aka ma nwunye ya, nakwa ụmụ ya ndị nwaanyị abụọ n’ihina Yahweh nwere obi ebere n’ebe ọ nọ.
Ha si n’ime obodo ahụ kpọpụ ya. Mgbe ha kpọpụtara ya, otu n’ime ha gwara ya sị, “Gbaa ọsọ ndụ gị. Elekwala anya n’azụ gị mọbụ kwụsị ebe ọbụla n’ala a dị larịị. Gbalaa n’elu ugwu mọbụ e kpochapụ gị”
Lọt agwa ya sị: “Mba Onyenwe m arịọ m gị. Nwodibo gị nwere ihuọma n’ebe ị nọ nke na i zila m nnukwu ịhụnaanya site n’ịzọpụta ndị m, ma biko agaghị m enwe ike iru n’elu ugwu, tupu ọdachi a erute m nso ma gbuo m.
Obodo ahụ dị ebe ahụ dị nso ịgbaba, bụrụkwa obere obodo. Biko ka m gbaba ebe ahụ. Ọ bụ obere obodo, ka e wee zọpụta ndụ m”. Ọ zaghachiri ya sị, “Enye m gị ihe ị rịọrọ; agaghị m emebi obodo a i kwuru maka ya.
Ngwangwa, gbaga ebe ahụ n’ihina agaghị m eme ihe ọbụla ruo mgbe ị garutere ya”. Nke a mere e ji akpọ obodo ahụ Zoa. Ozigbo Lọt batara obodo Zoa n’isi ụtụtụ, Yahweh mere ka okwute na ọkụ si n’elu zokwasị Sodọm na Gomora dịka mmiri.
Ọ kwaturu obodo ndị ahụ niile dị Iarịị na ndị mmadụ niile bi n’ime obodo ndị ahụ na ihe niile na-eto eto ebe ahụ. Ma nwunye Lọt lere anya n’azụ, wee ghọọ ogidi nnu.
Mgbe Abraham tetera ụra n’ụtụtụ, o mere ngwangwa gaa ebe ahụ ọ nọ guzo n’ihu Yahweh, wee letịa anya na Sodọm na Gomora nakwa ala niile dị larịị dị na ya, ọ hụrụ nnukwu anwụrụ ọkụ nke si n’ala agbago elu dịka nke oke ọkụ.
Otu ahụ ka ọ dị na, mgbe Chineke mebiri obodo niile dị n’ala ahụ dị larịị, o chefughị Abraham, ma ọ zọpụtara Lọt mgbe o mebiri obodo ahụ niile Lọt biri.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 26:2-3, 9-10, 11-12.
Azịza: Onyenweanyị, ịhụnaanya gị dị n’ihu m.
1. Nwalee m, O Onyenweanyị ma leghakwa m
nyochaa obi m na echiche m niile.
N’ihina ịhụnaanya gị dị n’ihu m,
ana m aga n’ụzọ eziokwu gị. Azịza
2. Ekwekwala ka mkpụrụobi m soro ndị ajọ mmadụ keta ụgwọ ha,
mọbụ kpochapụ mụ na ndị na-awufu ọbara.
Ndị ihe ọjọọ juru aka,
ndị aka ha jupụtara n’iri ngarị. Azịza
3. Mana ana m ebi ndụ m n’ịkwụba aka ọtọ,
meere m ebere, Onyenweanyị, ma zọpụta m;
Ụkwụ m, nọ n’ezi ụzọ,
Onyenweanyị ana m agọzi gị n’ọgbakọ niile. Azịza
MBEKU – Ps. 147:2,15
Alleluia, Alleluịa:
Jerusalem, toonụ Chineke, okwu ya na-agazu ụwa niile.
Alleluịa.
OZIỌMA – 8:23-27
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Mgbe Jesu banyere n’ụgbọmmiri, ndị na-eso ụzọ ya sooro ya. Oke ebili mmiri malitere n’osimiri ahụ, nke mere ka ụgbọ ahụ chọba imikpu, ma Jesu nọ n’ụra.
Ha wee gaa, kpọtee ya sị, “Zọpụta anyị Onyenweanyị, anyị na-ala n’iyi”. Jesu gwara ha sị, “Gịnị mere ụnụ ji atụ egwu, ụnụ ndị obere okwukwe?
Mgbe ahụ, Jesu biliri, baara ifufe na osimiri ahụ mba, ebe niile dara jụụ. Ihe a tụrụ ndị mmadụ niile nọ ebe ahụ n’anya ha wee na-asị, “Kedụ ụdị onye dị nke a, ọbụladị ifufe na oke osimiri na-erubere ya isi?”
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.