Igbo Mass Readings for July 2 2024, Tuzde Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 2 2024, Tuzde Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:1-8; 4:11-12
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Amọs
Geenụ ntị ụmụ Izrel n’okwu nke Chineke na-ekwu megide ụnụ na ezinụụlọ ahụ niile m kpọpụtara n’ala ljipt: “Naanị ụnụ ka m họọrọ n’ime ezinụụlọ niile nọ n’elu ụwa; ya mere m ga-eji taa ụnụ ahụhụ maka njọ ụnụ niile.
Mmadụ abụọ, ha nwere ike ịgakọ ọnụ ma ha ebughị ụzọ kwekọrịta ime otu a? Ọdụm ọ na-eti mkpu ike n’ime ọhịa ma ọ hụghị anụ oriri? Nwa ọdụm ọ na-ebigbọ n’efu n’ọgba ya ma o nweghị ihe o jidere? Nnụnụ ọ na-ama n’ọnya dị n’ala ma ọ bụrụ na e sighịrị ya ọnya?
Ọnya ọ na-akụchi ma ọ bụrụ na o nweghị ihe ọ matara? Ọ bụ na egwu anaghị atụ ndị mmadụ ma ha nụ ụda opiike n’ime obodo? Ihe ọjọọ o nwere ike mee obodo ọbụla ma o sighị n’aka Chineke bịa?
N’ezie, Osebụrụwa Chineke anaghị eme ihe ọbụla ma o bughị ụzọ kpugheere ụmụodibo ya, ndị amụma atụmaatụ ya. Ọdụm ebigbọọla kedụ onye na-agaghị atụ egwu?
Yahweh ekwuola okwu; kedụ onye na-agaghị ebu amụma? Etikpọrọ m ọtụtụ n’ime obodo ụnụ dịka m mere na Sodọm na Gomora.
Ụnụ dịzi ka nkụ nke a gụpụtara n’ọkụ ma ụnụ alọghachikwuteghị m,” Yahweh na-ekwu. Otu a ka m ga-esi mee gị o Izrel; ebe ọ bụ na m ga-eme gị otu a, jikerekwa izute Chineke gị o Izrel.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps.5: 3,4-5, 6-7
Azịza: Onyenweanyị dube m n’ụzọ eziokwu gị
1. Ọ bụ gị ka m na-arịọ, Osebụrụwa
Ị bụghị Chineke nke ajọomume na-amasị;
Ị naghị anabata ndị ajọ mmadụ n’ụlọ gị
Ndị na-anya isi anaghị akwụdosi ike n’ihu gị. Azịza
2. Ị na-akpọ ndị ajọ mmadụ niile asị,
na-ekpochapụ ndị ụgha.
Onyenweanyị na-akpọ ndị na-egbu mmadụ
na ndị aghụghọ asị. Azịza
3. Ma site n’ịhụnaanya gị bara ụba
mee ka m bata n’ụlọ gị
mee ka m hulata isi m
n’ime ụlọnsọ gị, fee gị ofufe. Azịza
MBEKU – Ps. 147:2,15
Alleluia, Alleluịa:
Jerusalem, toonụ Chineke, okwu ya na-agazu ụwa niile.
Alleluịa.
OZIỌMA – 8:23-27
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Mgbe Jesu banyere n’ụgbọmmiri, ndị na-eso ụzọ ya sooro ya. Oke ebili mmiri malitere n’osimiri ahụ, nke mere ka ụgbọ ahụ chọba imikpu, ma Jesu nọ n’ụra.
Ha wee gaa, kpọtee ya sị, “Zọpụta anyị Onyenweanyị, anyị na-ala n’iyi”. Jesu gwara ha sị, “Gịnị mere ụnụ ji atụ egwu, ụnụ ndị obere okwukwe?
Mgbe ahụ, Jesu biliri, baara ifufe na osimiri ahụ mba, ebe niile dara jụụ. Ihe a tụrụ ndị mmadụ niile nọ ebe ahụ n’anya ha wee na-asị, “Kedụ ụdị onye dị nke a, ọbụladị ifufe na oke osimiri na-erubere ya isi?”
Igbo Mass Readings for July 3 2024, Emume Ncheta Tọmọs dị Asọ – Nwaazụ
Igbo Mass Readings for July 2 2024, Tuzde Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.