Igbo Mass Readings for July 16 2024, Tuzde Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 16 2024, Tuzde Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:1-9

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Isaiah

N’oge nke Ahaz nwa Jotan, nwa Uziya, eze Juda, Rezin onyeeze Siria na Peka nwa Remalịa, onyeeze Izrel bịara Jerusalem ka ha buso ya agha mana ha enweghị ike imeri ya.

Mgbe a gwara ụlọ Devid na Siria na Ifrem ejikọọla onwe ha ọnụ, obi mapụ eze na ndị obodo ya, ha mawa jijiji dịka osisi dị n’ọhịa ikuku na-ebugharị.

Yahweh wee gwa Aịzaya sị, “Gị na nwa gị Shiajashub gaa zute Ahaz n’ebe isi njedebe ụzọ mmiri nke ọdọ mmiri dị n’elu, garuo n’ụzọ ebe a na-eteji akwa, sị ya, lezie anya, nọrọ jụụ, egwu atụla gị, obi adakwala gị mba n’ihi iwe ọkụ nke Rezin, na nke nwa Remalịa maka na ha dịka icheku ọkụ abụọ na-anyụ anyụ.

N’ihina Siria, Ifrem na nwa Remalịịa akpaala nkata ọjọọ megide gị na-asị: “Bịanụ ka anyị buso Juda agha, yie ya egwu; ka anyị merie ya, were ya dịka nke anyị; kpọrọ nwa Tabil mee ya eze ya.”

Otu a ka Yahweh Chineke si kwu: “Ọ gaghị abụ eziokwu, ọ gaghị eme! N’ihina isi obodo Siria bụ Damaskọs, ebe isi Damaskọs bụkwa Rezin (Ma tupu afọ iri isii na ise agachaa a ga-etikpọsị Ifrem ka ọ ghara ịbụ obodo ọzọ).

Ọzọ isi obodo Ifrem bụ Sameria, isi Sameria bụkwa nwa Remalịa. Ọ bụrụ na i kweghị n’ezie a gaghị akwụwasị gị ike!

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 48:2-3, 3-4, 5-6, 7-8

Azịza: Chineke na-akwalite obodo ya ebeebe ebeebe.

1. Onyenweanyị dị ukwuu bịa kwesịkwa inye otito

n’obodo Chineke anyị

n’ugwu ya dị nsọ, Zayọn ugwu nke Chineke dị elu, maa mma,

obodo nke nnukwu eze bụ añụrị nke ụwa niile. Azịza

2. Ugwu Zayọn isi añụrị nke ụwa niile

ebe obibi nke nnukwu eze ahụ.

Chineke n’onwe ya egosila na ya

bụ ebe mgbaba n’etiti obodo ahụ. Azịza

3. Lee, ndịeze ezukọọla soro na-abịa

ma ka ha hụrụ ya,

ọ gbagwojuru ha anya

ha mara jijiji wee gbalaga n’egwu. Azịza

4. Ahụ ọmajijiji jidere ha mgbe ahụ

na-egbu ha mgbu ka nwaanyị ime na-eme

Ijirila oke ifufe si n’ọwụwa anyanwụ

Wee mebie ụgbọ ndị Tarshish. Azịza

MBEKU – Ọrụ Ndiozi 16:14

Alleluia, Alleluia:

Onyenweanyị meeghe obi anyị ka anyị gee ntị n’ihe niile nwa gị na-ekwu.

Alleluia.

OZIỌMA – 11:20-24

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Mgbe ahụ, Jesu malitere ịbara obodo niile ebe ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube mba, n’ihina ha echegharịghị. Azị gba ụnụ Korazin, azị gba ụnụ Betsaịda!

N’ihina a sị na ọ bụ n’ime obodo Taya na Sidọn ka a rụrụ ọrụ ebube niile a rụrụ n’ime ụnụ, ha gaara echegharị kamgbe site n’iyiri akwa mkpe na ite onwe ha ntụ.

Ma agwa m ụnụ, “a ga-emere obodo Taya na Sidọn ebere n’ụbọchị ikpe karịa ụnụ. Ma gị Kapanaum, a ga ebuli gị ruo eluigwe? A ga-eweda gị ruo olulu ala mmụọ.

N’ihina a sị na ọrụ ebube niile a rụrụ n’ime gị, na a rụrụ ha na Sodọm, ọ gaara adị ruo ugbu a. Agwa m ụnụ, a ga-emere obodo Sodọm ebere n’ụbọchị ikpe karịa ụnụ.

Igbo Mass Readings for July 17 2024, Wenezde Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume

Igbo Mass Readings for July 16 2024, Tuzde Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 10, 2022