Igbo Mass Readings for July 20 2027, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 20 2027, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 14:21-15:1

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ọpụpụ

Mosis gbatịrị aka ya n’elu osimiri, Yahweh kewara osimiri ahụ ụzọ abụọ site n’oke ikuku ime abalị mee ka etiti ya bụrụ ala ọkpọọ. Ụmụ Izrel siri n’etiti osimiri ahụ bụ ala ọkpọọ gafee, ha jikwa akụkụ osimiri ahụ mere ebe mgbado aka.

Ma ndị ljipt chụụrụ ha garuo n’ime osimiri ahụ, ịnyịnya agha Fero niile na ndị ọchị agha ya. N’isi ụtụtụ, Yahweh siri n’ide ọkụ na ide urukpu ahụ lekwasị igwe ndịagha Ijipt anya, nke a mere ka ọgbaaghara jupụta n’etiti ha.

O mere ka ụkwụ ịnyịnya agha ha dị nnukwu arọ nke na ha enweghịkwa ike ịgasi ike, nke a mere na ụmụ Ijipt tiri mkpu sị, “Ka anyị gbafuo n’ebe ụmụ Izrel nọ maka na Yahweh na-alụrụ ha agha megide anyị”.

Ma Yahweh gwara Mosis sị, “Setịa aka gị ọzọ n’osimiri ahụ, ka o kpuchie ndị Ijipt, ịnyịnya agha ha na ndị niile na-anya ha”.

Mosis mere ka Yahweh siri gwa ya, n’isi ụtụtụ osimiri ahụ laghachiri azụ kpuchie ndị ljipt, ịnyịnya agha ha na ndị niile na-anya ha bụ ndị sooro ụmụ Izrel banye n’ime osimiri, o nweghị onye n’ime ha pụtaranụ.

Mana ụmụ Izrel siri n’ala ọkpọọ gafee n’etiti osimiri, akụkụ osimiri ahụ bụkwaara ha ebe mgbado aka mgbe ha na agafe.

Otu a ka Yahweh siri zọpụta ụmụ Izrel n’aka ndị ljipt, ụmụ Izrel hụkwara ka ndị Ijipt siri nwụọ n’ime oke osimiri ahụ.

Izrel hụrụ oke ihe Chineke mere megide ndị ljipt, ndị mmadụ wee tụọ Chineke egwu, ha kwenyekwara na Chineke na nwodibo ya Mosis.

Mgbe ahụ Mosis na ụmụ Izrel kwere ukwe ọñụ na-ekwu sị, “Aga m ekwere Yahweh ukwe ọñụ n’ihi mmeri ya dị otito, o meela ka ịnyịnya agha ndị ọchịagha Fero dakpuo n’osimiri.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ex. 15:8-9, 10, 12, 17.

Azịza: Anyị ga-ekwere Yahweh ukwe ọñụ n’ihi mmeri ya dị otito

1. Site n’ume i kuru, osimiri akwụrụla ka ihe a kpụrụ akpụ,

ime osimiri akpụkọọla sie ike

Ma onyeiro kwuru, aga m achụsi ha ike, aga m agafekwa ha,

aga m eke akụnụụba ha, ebumnuuche m ga-emezukwa n’ebe ha nọ

Aga m amị mmaagha m, aka m ga-ebibikwa ha. Azịza

2. Site n’otu nku ume gị ka osimiri ahụ ji kpuchigide ha,

ha wee mikpuo ka igwe n’ime osimiri.

Ị gbatịrị aka nri gị ụwa eloo ha. Azịza

3. Ị ga-akpọbata ha, bịa dote ha n’elu ugwu gị,

bụ ebe e mere ka ọ bụrụ ebe obibi gị,

n’ebe nsọ ahụ i jiri aka gị rụọ, O Yahweh. Azịza.

MBEKU – Ps. 25:4, 5

Alleluia, Alleluia:

Mee ka m mata ụzọ gị, O Onyenweanyị, dube m n’ụzọ eziokwu gị.

Alleluia.

OZIỌMA – 12:46-50

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Mgbe Jesu ka nọ na-agwa ndị mmadụ okwu, nne ya na ụmụnne ya bịara kwụrụ n’ezi na-achọ ka ha gwa ya okwu. Otu onye gwara ya sị, “Lee, nne gị na ụmụnne gị kwụ n’ezi na-achọ ịgwa gị okwu”.

Ọ zara ya sị, “Onye bụ nne m, olee ndị bụ ụmụnne m?” Ọ tụrụ ndị na-eso ụzọ ya aka sị, “Ndị a bụ nne m na ụmụnne m!

N’ihina onye ọbụla nke na eme uche Nna m nke bi n’eluigwe bụ nwanne m nwoke, nwanne m nwaanyị na nne m”.

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for July 20 2027, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 10, 2022